Rev Father Edwin Obiora : Etu m si bụru Fada mbụ chịrị echichi SAN

Aha onyonyo, Ihe onyoonyo Fada Obiora e chịrị SAN

Rev. Fr. Edwin Obiora bụ ụkọchukwu mbụ ritere ọkwa Senior Advocate of Nigeria (SAN).

Ọkwa Senior Advocate of Nigeria (SAN) bụ nke kachasị ukwu n'ọrụ ọkaiwu na Naịjirịa.

Fr Obiora gwara BBC Igbo etu o si emekọta ọrụ ụkọchukwu na ọrụ ọkaiwu ya tụmadị ogo SAN ya .

Dịka akụkọ ahụ pụtara ihe n'ọnwa Disemba afọ 2021, ọtụtụ ndị mmadụ bunyere Fr Edwin ụkpa ekele maka ike ọ kpara.

Mana ụfọdụ ndị ọzọ kwukwara na ọ bụ ego ka o ji zụta ọkwa SAN ahụ.

"Ebee ka ụka Katọlik ga-esi bute ego ha ga-eke ndị ọnụ na-eru n'okwu iji gote ọkwa 'Senior Advocate'?" Fr Edwin jụrụ.

"Usoro e si abụ 'Senior Advocate' adịghị ofere."

"Nke mbụ, onye ahụ ga-egosi na ya ekpeela ikpe ruo n'ụlọ ikpe kachasị na Naịjirịa ugboro anọ, mana na nke anyị, anyị gosiri iri na otu."

"Nke abụọ, onye ahụ ga-egosi na ya ekpeela ikpe ruo ụlọikpe mkpesa ugboro ise, mana anyị gosiri iri atọ na ise."

"Nke atọ onye ahụ ga-egosi na o kpeela ikpe n'ụlọikpe ukwu ugboro iri abụọ, mana anyị gosiri ha iri ise na isii."

Fr Obiora kwukwara na ndị nnyocha ga-abịa lee ụlọọrụ ebe onye ọkaikpe ahụ na-anọ, lee akwụkwọ dị n'ọba akwụkwọ ya, lee ma ọkụ latrik ọ dịkwa n'ụlọọrụ ya, na ihe ndị ọzọ.

E lechaa ihe ndị a, onye ahụ ga-agazi ebe a ga-agba ya ajụjụ ọnụ, nke bekee kpọrọ 'oral interview', tupu e kpebie ma o tozuru etozu itunye ugo ahụ.

Ọ bụ ihe ndị a ka Fr Edwin Obiora gafechara, ma turu ugo SAN lọta.

Onye bụ Fr Edwin Obiora (SAN)?

Fr Edwin Obiorah

Ebe foto si, Fides Media, Awka

Nkọwa foto, Fr Edwin Obiora na ndị gbara ya okirikiri n'ụbọchị ahụ e tunyere ya ugo dịka SAN, Disemba 8, 2021.

A mụrụ Fr Obiora n'obodo Ifite-Dunu nke dị n'okpuru ọchịchị Dunukofia n'Anambra Steeti.

Ọ gụrụ akwụkwọ na St Simon Praịmarị Ukpo, nakwa 'St Gabriels Sekọndịrị, ifite-Dunu.

O mechara banye ụlọakwụkwọ ebe a na-azụ ndị ụkọchukwu Katọlik, a kpọrọ 'All Hallows Seminary' Ọnịcha.

Fr Obiora nweburu ohere ịga na Mahadum Naịjirịa dị na Nsụkka ka ọ ga gụọ maka ịbụ ọkaiwu, mana ọ hapụrụ ya banye ụlọakwụkwọ 'Bigard Memorial Seminary' dị n'Ikot-Ekpene.

N'ebe ahụ, ọ gụrụ Philosophy na Theology afọ asatọ tupu e chie ya ụkọchukwu.

N'afọ 1990, Fr Edwin nwetara nzere LL.B nke mere ya onye ọkaiwu, bịakwa gaa ụlọakwụkwọ pụrụ iche maka ndị ọkaiwu (Law School).

Ọ gụkwara akwụkwọ na Paris, Fransị, ebe ọ nọrọ nweta asambodo na mmụta iwu mba ụwa maọbụ 'International Law' na bekee.

Fr Obiora rụrụ ọrụ n'ụlọọrụ ndị ọkaiwu a na-akpọ 'Harris Beach and Wilcox' na mba Amerịka.

N'oge ahụ, ọ bụ ya bụ naanị onyeisi ojii bụ ọkaiwu n'ụlọọrụ ahụ.

O mechara mepee ụlọọrụ nke ya n'obodo Rochester na New York, Amerịka.

N'afọ 2004 ka ọ lọtara Naịjirịa malite ụlọọrụ 'Equity Law Office' n'Awka, Anambra Steeti.

Fr Obiora tinyere akwụkwọ maka ịbụ SAN n'afọ 2017, 2018 na 2019, mana ọ gazighịrị ya.

"Ekpebiri m ka m zuo ike na 2020, ma tinyekwa ọzọ na 2021 nke mechara gazie," o kwuru.