Chinyere Udoma: Ihe ndị ị maghị maka otiegwu ụka

Ebe foto si, Chinyere Udoma/Facebook
Akụkọ maka otiegwu ụka a ma ama bụ Chinyere Udoma wuru na soshal Midia ụbọchị Tọzde, (18/3/2021) dịka akụkọ fegharịrị na soshal midia na ọ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ n'ọkporoụzọ sị Ọnịcha gawa Owere.

Ebe foto si, Others
Mana Udoma gwara BBC Igbo na mkparịtaụka na akụkọ ahụ bụ okpotokpo asị.
"Ndị Chineke mụrụ dịka o siri mụọ m anaghị anwụ n'ihe mberede nke Okporoụzọ. Nwa Ikuku ka m bụ."
Lee ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ ọ gwara anyị maka onwe ya:
1. Abụ m onye...

Ebe foto si, Chinyere Udoma
Chinyere Udoma bụ onye Nnokwa n'Anambara steeti ma a na-alụ ya n'Alọ, dịkwa n'Anambara steeti.
Nnokwa na Alọ bụ obodo gbara agbata obi.
"Ụkwụ m ka na-eji esi be di m eje be nna m."
2. Etu m si bido gụwa egwu

Ebe foto si, Chinyere Udoma/Facebook
"Ije ozi bụ oku a kpọrọ m na nwata mgbe m dị afọ iteghete(9)."
"E bidoro n'ụlọakwụkwọ nakwa n'ụlọụka."
"Etoghị m na Naijiria. Ebigara m na mba ụfọdụ dị n'Afrịka dịka Zimbabwe, Kenya na Togo."
"Ṅwanne Nna m bụ onye na-anọchite na Naijiria na mba ndị a. A tụga ya mba, ana m eso ya aga n'ihi na oge ahụ ọ ka luchara nwaanyị ọhụrụ, o nwebeghị nwa, ebe ọkwa ya bụ ọkwa a na-enye onye nwere ezinụlọ ya, ya mere m si soro ya gaawa oge ahụ."
"Ọ bụ na ụlọụka St Mary's Catholic Church, Nnokwa, ka m nọrọ chawa, pụta ihe."
3. Egwu m bubutara m

Ebe foto si, Chinyere Udoma/Facebook
"Ị dịghị ajọ njọ" bụ egwu butara m n'afọ 1999. Ọ bụ ndị Klints Nigeria Ltd bụ ndị Chukwu ji kwara ngwa ọrụ itipụta egwu ahụ."
Nke so ya bụ, "I have a Father that will not fail me" n'afọ 1999. N'afọ 2000, e tipụtara "Agụ na-eche mba".
"Mgbe ahụ soshal midia adịbeghị mgbe ahụ."
Egwu ndị ọzọ ọ gụrụ gụnyere "Ọ nọ n'oche eze ya", "Come na see what the Lord has done for me", "Adim Well Loaded.",
4. Egwu m kachasị amasị m

Ebe foto si, Chinyere Udoma/Facebook
"Egwu ya nile na-enye ya ọṅụ."
"Egwu na-esi na mụọ m abịa mana nke m na-agụ ma m chọọ ịkpalite mụọ m elu n'ebe Chineke nọ bụ "Ị bụ Olileanya m"
5. E zutere m di m na "crusade"

Ebe foto si, Chinyere Udoma/Facebook
"Mụ na Ifeanyị hụrụ na 'crusade'. Mụ na ya nọ n'oche na 'crusade'."
"Agụwaala m egwu oge ahụ mana agụbeghị m nke a na-ere n'ahịa."
"Ha kpọrọ ka m bia kụọ egwu n' ụlọụka ha."

Ebe foto si, Chinyere Udoma/Facebook
"Mgbe a kpọrọ m pụta bịa gụọ egwu, ọ jụrụ: "Ọ bụ gịnwa ga-agụ egwụ, ị maa agụ?"
"Ọga, m gụọ, ị mara na m ama agụ."
"Ya na onwe ya bụ nwoke zuru ezu, mụ nwa bụrụ obere ọkara agbọghọ ka bidoro ebido na-eto, ya na-ele m anya okenye na-ele nwata."
Ọ bụ n'ebe ahụ ka ha bidoro kpawa nkata ghọrọ ngịga. Chineke jikwara ụmụ anọ; nwoke atọ na otu nwaanyị gọzie ha.
Udoma kọwara na di ya na-enye ya nkwado pụrụ iche n'ọrụ ya, na ọ naghị ege akụkọ ọjọọ ọbụla banyere ya.
6. Ndụmọdụ m na-enye ndị otiegwu na-etolite etolite
"Wepụgodi anya n'ego, buru ụzọ chọwa uto."
"Sonyesie ike n'ịgara Chukwu ozi n'ụlọụka gị."
7. O nwere ihe ọzọ ị na-eme enweta ego?
"Ihe niile na-eme bụ ihe gbasaara egwu. E nwere ọba ntipụta egwu."
Gee ihe o kwuru n'uju ebe a:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post










