Unknown gunmen in Enugu state: A gbaala otu onye ọkụ n'Enugu ugbua

Enugwu

Ebe foto si, Screengrab

Ndị oji egbe egbu ka na-agba egbe n'Enugu dịka BBC Igbo si chọpụta.

Ndị ahụ bidoro gbawa egbe na Gariki dị n'Enugu , fete Agbani road, Abakpa, Coal Camp nakwa Nkwubo Nike ebe e kwuru na ha gburu otu onye ọrụ nchekwa ime obodo ma gbaa ya ọkụ.

Ndị omekome ahụ buru ibu n'ọnụọgụ ma jiri ụgbọala na-agagharị n'Enugu.

Etu ọ dị ugbua, ndị agha ewerela ọnọdụ na Gariki ebe ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ apụtala n'ọgbọ n'akụkụ dị iche iche n'Enugu.

Ogbaghara a emeela ka ọtụtụ mmadụ bi maọbụ na-azụ ahịa n'Enugu mechie ụlọahịa ha maka ize ndụ.

Ndị ọrụ nchekwa ejuputala n'Okpara Square dị n'Enugu ugbua.

Ihe ndị uweojii kwuru?

Ndị uweojii Naijiria

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị uweojii na-achọ ọtụtụ ndị ntọ ndị ọzọ

Ndị uweojii Enugwu Steeti ekwuola ka ndị niile bi n'Enugwu na gburugbru ghara ịnọ n'ụjọ na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ọzọ ewerela ọnọdụ n'ebe ndị a gbara egbe.

Ha gwara ndị mmadụ ka ha na-aga mkpa dịịrị ha na-atụghị ụjọ ihe ọbụla ime ha na ndị nchekwa kwụ chịm iweta udo.

Aha onyonyo, Ihe Simon Ekpa gwara BBC IGbo maka ọchụchụ nwere onwe Biafra

Ipob abala mba maka ndị na-akpọ ha maka ọgbaghara mere n'Enugu taa

Emma Powerrful bụ ọnụ na-ekwuru Indigenous People of Biafra na-ekwusi ike na aka ha adịghị n'ọgbaghara dapụtara n'Enugu taa nakwa Ekwulobia.

O kwuru na ihe ọbụla gbasara "sit-at-home" agbasaghị Ipob makana o teela ha pụtara kwuo na ha akagbuola ya bụ atụmaatụ.

O kwuur na onye ọbụla hụrụ ndị na-ebute ọgbaghara n'ala Igbo n'aha Ipob kugbuo ha.

Gbasara akụkọ na anwụchiri onyeisi Ipob nọ n'Enugu. Powerful kwuru nke ahụ abụghị ihe ọhụrụ makana oteela ndị ọrụ nchekwa ji anwụchị ndị otu ha ma enwere sit at home ma enweghị.

Ọsọ ataala n'Enugu ugbua dịka ụda egbe na-ada aghara aghara

Okporoụzọ Enugu State Broadcasting Service

Ndị mmadụ na-agba ọsọ ndụ ha ugbua n'Enugu dịka a na-anụ ụda egbe aghara aghara ebe ahụ.

Akụkọ kwuru na ndị ahụ bidoro na Garki gbawa ya bụ egbe , chụsaa ndị na-azụ ahịa na coal camp dị n'Enugu.

Nke a emela ka ọtụtụ mmadụ malite gbaghariwa ebe niile n'Enugu.

Anyị na-anụkwa akụkọ na ndị mmadụ na-agbagharị n'Ekwulobia ebe ndị mmadụ na-aba ụgbọala eme njem dịka ndị a na-eche na ha bụ ndị Ipob na-awakpo ndị mmadụ maka ịmanye ha sit-at-home.

Akụkọ ka na-abịa.

Aha onyonyo, Sit at home: Okwu m na-agwa ndị na-eme atụmatụ a - Andy Uba