George Floyd: May 25 ka e mere ncheta otu afọ nwa amadị a nwụrụ n'aka ndị uweojii Amerịka

George Floyd

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Dịka ụbọchị taa mere ya otu afọ George Floyd nwụrụ n'aka ndị uweojii mba Amerịka, ọtụtụ ndị mmadu na mba dị iche iche pụtara n'igwe were mee emume ncheta ọnwụ ya taa.

Ndị ezinụlo George Floyd gara njem nleta na Obi onyeisiala mba Amerịka.

Ụfọdụ ndị mmadụ na mba gụnyere Spen, Skọtland na mba ndị ọzọ.

George Floyd

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden na ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu na mba Amerịka nke gụnyere Barak Obama onye bụbu onyeisiala Amerịka depụtara ozi maka ncheta ọnwụ George Floyd.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Etu George Floyd siri nwụọ

Eserese George Floyd

Ebe foto si, EPA

N'ụbọchị 25 nke ọnwa Mee, afọ 2020 dịka ndị Amerịka na-eme emume ikwanyere ndị agha Amerịka nwụrụ dịka ha na-alụrụ mba ahụ ọgụ ugwu, ndị nweoji nwuchiri George Floy maka ebubo na ọ chọrọ iji $20 azụ ahịa n'ọdọ ahịa na Minneapolis,dị na Minnesota.

Dịka ha kpụ ya apụ itinye ya n'ụgbọ, ndị uweojii atọ pidoro Floyd akpịrị n'ala rue ihe karịrị nkeji itoolu., ebe otu n'ime ha chụsara ndị bịara inyere ya aka.

Floyd nwụrụ n'aka ha nke butere ngaghariiwe na mpaghara dị iche iche na Amerika nakwa mba ndị ọzọ n'ụwa.

Ndị mere ngaghariiwe na Minneapolis

Ebe foto si, European Photopress Agency

Nkọwa foto, Ndị mere ngaghariiwe na Minneapolis

Ụlọikpe mara Dereck Chauvin bụ onye uweojii nke a hụrụ n'ihe onyonyo wuru ewu ka o o ji ikpere pido Floyd akpịrị n'ala ikpe maka igbu ọchụ.

N'aka nke ọzọ, a ga-akpụpụ ndị uweojii atọ fọrọ ụlọikpe n'ọnwa Maachị afọ 2022.

Otu ụbọchị agaala kamgbe ndị juri kpebiri na Derek Chauvin dara iwu maka ọnwụ George Floyd.

George Floyd na Derek Chauvin

Ebe foto si, Getty Images

Ndị juri weghachịrị mpụtara ikpe a maka ebubo ọnwụ n'agba nke abụọ na nke atọ na amaghị ama egbu mmadụ.

Ndị ikpe pụrụiche akpọrọ Jury enweela mkpebi nke ha rurtere na ya n'ikpe a na-ekpe Derek Chauvin maka ọnwụ Gerorge Floyd.

Cheta na ihe onyonyo fegharịrị n'ụwa niile gosiri ebe Chauvin sekpu ala n'elu onu Floyd na nkeji itoolu tupu Floyd a nwụọ.

Aha onyonyo, George Floyd si n'agbụrụ ndị agha Mbaise gara Amerịka

Nke a mere ka ndị mmadụ mee ngagharịiwe zuru ụwa niile ọnụ.

Ugbua a na-echezi ka ọkaikpe kpọpụta ihe ndị ikpe pụrụiche kwekọrịtara na ya.

Eserese George Floyd

Ebe foto si, AFP

Dịka ikpe Derek Chauvin maka ọnwụ George Floyde bara abalị nke ise ya, ndị uweojii ụfọdụ a kpọrọ enyela akaebe ihe ha maa.

Otu onye uweojii a kpọrọ bụ Jon Edwards kọwara ihe mere dịka ha bịara ebe George nọ nwụọ.

Edwards gwara ụlọịkpe na oge ya rutere ebe ahụ, e bupụla ahụ George Floyd.

Ọ gara n'ihu chekwa ebe ahụ dịka e si echekwa ebe mpụ, o kwukwara na ya na ndị ụfọdụ nọ ebe ihe mere nwekwara mkparịtaụka.

Onye uweojii ọzọ nọeọla n'ọrụ ruo afọ 30 bụ Lieutenant Richard Zimmerman nyere akaebe kwuru n'ọzụzụ ha na-akuziri ha na"ijide onye a kụrụ ịga n'ala nwereike igbochi ya iku ume".

Ọ kọwara na ọ bụ ezie na onye nọ n'ịga nwereike imerụ onye uweojii ahụ, mana ihe o nwereike imeli adịghị ukwuu.

Mgbe ọkaiwu jụrụ Zimmerman ihe o chere maka aka ndị uweojii ahụ ji so Floyd ka ha pidochara ya n'ala, ọ sara sị, "O kwesịghị ekwesị".

"Ahụghị m ihe mere nwereike ịkpalite ndị uweojii ahụ iche na ndụ ha nọ n'ihe egwu."

bọchị Anọ: Enyi nwaanyị Floyd sị na "mụ na ya na-aṅụbu ọgwụ ike"

Ogige "George Floyd Square'dịka ọ dị na ụbọchị mmalite ikpe Derek Chauvin n'abalị 28 nke ọnwa Maachị 2021

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ogige "George Floyd Square'dịka ọ dị na ụbọchị mmalite ikpe Derek Chauvin n'abalị 28 nke ọnwa Maachị 2021

N'ụbọchị nke anọ nke ikpe Derek Chauvin, Courteney Batya Ross bụ enyi nwaanyị George Floyd gwara ụlọikpe na ya na Floyd naṅụbu ọgwụ ike.

A na-ekpe Chauvin ikpe bụ onye ndị uweojii chụọrọla n'ọrụ maka ebubo igbu Floyd bụ onnye nwụrụ n'ọnwa Mee, afọ 2021 dịka Chauvin ji ikpere pido ya n'ala jụ ịhapụ ya na-agbanyeghị na Floyd nọ na-eti "anaghị m ekutezi ume."

Ogige "George Floyd Square'dịka ọ dị na ụbọchị mmalite ikpe Derek Chauvin n'abalị 28 nke ọnwa Maachị 2021

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ogige "George Floyd Square'dịka ọ dị na ụbọchị mmalite ikpe Derek Chauvin n'abalị 28 nke ọnwa Maachị 2021

N'ọsịsa ajụjụ ọkaiwu Chauvin bụ Eric Nelson jụrụ ya, Courteney, onye kọwara Floyd dịka "ezigbo mmadụ" gwara ụlọikpe na ya bugara Floyd n'ụlọọgwụ n'ọnwa Maachị afọ 2020 n'ihi na ọ nọ n'ihe mgbu, na nnyocha e mere kwuru na ọ ṅụbigara ọgwụike oke.

George Floyd n'ihe onyonyo ebe ọ nọ n'ọdọahịa ahụ tupu ọ nwụọ

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, George Floyd n'ihe onyonyo ebe ọ nọ n'ọdọahịa ahụ tupu ọ nwụọ

Ndị ọkaiwu Chauvin na-achọ inweta ihe akaebe ga-arụtụ aka n'ọnwụ Floyd sitere n'ọrịa na ihe metụtara ọgwụ ike, na e jighị aka ike sogide ya.

Onye ọrụ gbagbata letara Floyd bụ Seth Zachary Bravinder gbakwara akaebe.

Bravinder kwuru na mgbe o rutere ebe ihe mere, "ndị uweojii ka nọ n'elu Floyd oge anyị rutere".

"Ahụghị m ihe gosiri na ọ ka na-eku ume maọbụ na-emegharị ahụ."

Ụbọchị nke Atọ: Onye resiri Floyd ahịa ụka ji pụọ enyeela akaebe

Derek Chauvin

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Derek Chauvin agọọla sị na aka ya dị ọcha

Dịka ikpe a na-ekpe Derek Chauvin maka ọnwụ George Floyd bara ụbọchị nke atọ, Christopher Martin dị afọ 19 bụ onye resiri ya ahịa bụtara ụka kwuru na ọ bụrụ na ya ma, na ya gaara ahapụ okwu ahụ kama ka e wepụego ahụ n'ụgwọ ọnwa ya.

Martin kwuru na ya resịrị Floyd otu paketị sịga n'ọdọahịa 'Cup Foods', o nye ya ego( $20)ya chere na ọ bụ ego adigboroja, mana ọ dị ka Floyd amaghị na ego ahụ bụ ego adigboroja.

Martin, onye kwuru na Floyd na-eme ka ka onye ṅụrụ anwụrụ maọbụ onye ṅụrụ mmanya dịka ọ na-achị ọchị na-ekelekwa ndị mmadụ, kwuru na ya gara kpesara ọga ya bụ onye kpọrọ ndị uweojii.

Martin nọ oge ndị uweojii nwụchiri Floyd kwuru na o juru ya anya ma wetara ya obi amamikpe n'ihi "Ọ bụụ na m anataghị egoo ahụ, ihe mere agaghị ime."

Ụbọchị nke Abụọ n'ikpe Derek Chauvin: Darnellae na ndị ọzọ nyere akaebe ha

Floyd

Ebe foto si, Getty Images

Dịka a malitere ikpe Derek Chauvin, onye uweojii a na-ebo ebubo igbu George Floyd, ọtụtụ ndị mmadụ nọ oge o mere gụnyere nwata dị naanị afọ itoolu, agbaala akaebe banyere ihe ha hụrụ.

Cheta na n'ọnwa Mee afọ 2020, ka onyonyo fegharịrị ebe onye uweojii (na ndị otu ya) ji ikpere sekpuru n'akpịrị George Floyd tupu ọ nwụọ.

Aha onyonyo, Ngagharịiwe maka ọnwụ George Floyd

Ndị mmadụ wụjuru ama n'isi obodo dị iche iche na mba Amerịka nakwa mba ndị ọzọ mee ngagharịiwe maka ọnwụ ya.

Kemgbe Maachị 29, 2021 e bidoro ikpe Chauvin, ihe ndị akaebe na-ekwu na-arụtụ aka n'aka ndị uweojii dị n'ọnwụ Floyd.

Derek Chauvin

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Derek Chauvin agọọla sị na aka ya dị ọcha

Otu onye akaebe aha ya bụ Donald Williams bụ ya na-eti ndị uweojii mkpu n'ihe onyonyo e gosiri na-asi ka ha wekwuru pụ nwoke ahụ ụkwụ n'akpịrị bụ ya kpọkwara ndị uweojii n'ekwentị kwuru sị, "Enwere m nkwenye na ha egbuola nwoke na agbanyeghị na ọ naghị egbochi ha inwuchi."

N'otu aka ahụ, nwatata ahụ aha ya bụ Darnellae bụ onye sere ihe onyonyo ahụ fegharịrị ụwa jiri mata maka etu Floyd siri nwụọ gwara ụlọikpe na "mgbe m na-ahụ George m na-ahụ ya dịka nna m, dịka nwanne m nwoke. Ha bụ ndị ojii dịka Floyd."

Ọ gara n'ihu kwuo sị, "N'abalị m na-arịọ George Floyd mgbaghara maka na emeghị m karịa ka m mere."

Nwata ọzọ dị afọ itoolu oge ọdachi ahụ mere nyekwara akaebe nke ya.

Aha onyonyo, George Floyd si n'agbụrụ ndị agha Mbaise gara Amerịka

Ọ gwara ụlọikpe na dịka Floyd na-eti mkpu na ya anaghị ekutezi ume, na Chauvin gara n'ihu pịdosie akpịrị Floyd ike n'ala.

Ihe onyonyo ọnwụ Floyd e gosiri n'ụlọikpe na-ezi ebe nwata ahụ na-eti na o ruola otu nkeji Floyd anaghịzị emegharị ahụ.

Mgbe a jụrụ ya ihe mere o jiri na-ekwu otu ahụ ,nwata ahụ zara na ọ bụ maka na"Oge na-aga, na ọ ga-anwụ".

O kwukwara na Floyd kwụsịrị imegharị ahụ ọbụla, dịka ọ na-emegharịbu ahụ mgbe a pịdoburu akpịrị ya n'ala.

Ụbọchị Mbụ: Ihe mere n'ikpe Derek Chauvin

Ndị nọ ebe ihe ọdachi George Floyd mere n'abalị 25 nke ọnwa Mee 2020

Ebe foto si, Court TV

Nkọwa foto, Ndí akaebe: 1. Donald Williams. 2. Darnella. 3. Darnella's cousin. 4. Alissa. 5. Kalen. 6. Genevieve Hansen

Ikpe a na-ekpe onye uweojii a kpọrọ Derek Chauvin maka ọnwụ onye isi ojii aha ya bụ George Floyd malitere n'ụbọchị Monde(29/3/2021.)

Mana ọkaiwu Chauvin bụ Eric Nelson kwuru na ihe a ga-eji kpee ya bụ ikpe bụ ihe akaebe, na ọ bụghị "okwu ndọrọndọrọ".

O kwuru na Floyd ṅụrụ ọgwụ ike oge a na-achọ ịnwụchi ya ka ọ sị na ọ bụ ihe butere ọnwụ ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: