Unknown gunmen attacks in Anambra this week: Ndịagha Naijiria akụsaala akwụ ndị Ipob n'Anambara steeti

Ebe foto si, Nigeria Army
Ndịagha Naijiria (82 Division) awakpoola ma kụsaa ọdọ ndị otu Ipob n'Azịa, Orsumoghu, Ọhịa Lilu, Mbosi, Uli dị n'Anambra nakwa Imo steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị agha Naijiria bụ Onyema Nwachukwu kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara ụbọchị Tọzde.
O kwuru na dịka ndị agha wakporo ọdọ ndị otyu ahụ, na ha na ha kwara mgbọ, ọtụtụ ndị otu ahụ gbalaga.
O kwuru na ha nwụchiri ndị Ipob atọ ma nwetakwa ọtụtụ ihe dị iche iche n'ọdọ ndị otu ahụ nke gụnyere ozu ndị ha otu ahụ tọọrọ, gbuo ma tụnye n'olulu, egbe, mgbọ egbe, ekwentị na ụgbọala Hilux.
Na nso nso a, mpaghara Okija, Azia na Orsumoghu nwuru ọkụ dịka ndị bu egbe mere ọtụtụ mwakpo ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị uweojii na nsonso a.
Ihe mere mpaghara Okija, Lilu na Ihiala, Anambra Steeti ji dị ọkụ ugbu a

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Tochukwu Ikenga ekwuola na o nweghi ihe ha ma banyere akụkọ na-ekwu na ndị oji egbe gbagburu ndị otu ha abụọ n'Okija, Anamabra steeti n'ụ.
N'okwu gwara gwara BBC Igbo n'abalị Tuzde ọ sị: "Anyị anụbeghị akụkọ ọbụla dị etu a ma ncha"
A gbanyeghi nke a, akụkọ na-efegharị kwuru na ndị ojiegbe a mabeghi ndị ha bụ wakporo di na nwunye na mpaghara Okija nke Anambra steeti ma gbuo ndị uweojii abụọ na-echekwa ha abụọ n'abali Mọnde.
Ka akụkọ si kwuo, di na nwunye a bụ ndị Nimo nke Anambra steeti; ha ka mere agbamakwụkwọ ha na nso nso a.
E kwuru na ha nọ na njem si Anambara na-aga ọdọụgbọelu nke Owere, Imo steeti mgbe ndị oji egbe ahụ wakporo ha.
Ndị uweojii na-eche ha pụtara ịlụso ndị ekperima ahụ ọgụ, mana mgbọ tụgburu ha abụọ, tupu ndị oji egbe a tọrọ di na nwunye ahụ.
Otu onye ikwunaibe di na nwunye a na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara onye ntaakụkọ na ndị ahụ mechara tọhapụ di na nwunye ahụ n'okporoụzọ Ụkpọ dịkwa n' Anambra steeti.
N'okwu ya ọ sị: "A tọhapụrụ ha ebe elekere iri na otu nke abali dịka ndị mmadụ kpọrọ anyị n'ekwentị ka anyị chọọ ụgbọala bịa buru ha n'okporoụzọ Ụkpọ."
Onye ahụ kwukwara na ndị oji egbe ahụ gburu di nwaanyị ahụ mma obejiri n'ahụ ma gbakwa ọkwọụgbọala ha egbe.
Ugbua onye ọkwọụgbọala ahụ nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ dịka o si kwuo.
N'olu ụjọ o kwukwara "Akụkọ nke a mapụrụ anyị obi nke ukwu, obi ụtọ anyị bụ na ndị a lọtara na ndụ".
Cheta na
N'ụbọchị Mọnde ka ndị ekperima wakporo ma gbuo ndị uweojii abụọ n'Anambara steeti.
Ndị uweojii abụọ a bụ ndị na-eche Chidi Aroh, bụ Kọmịshọna na-ahụ maka ala n'Enugwu steeti.
Mwakpo ahụ mere n'okporoụzọ Lilu-Osumoghu- Azia nke dị nso n'obodo Ọkịja ebe mwakpo nke di na nwunye a nọkwara mee.
Mpaghara Ihiala, Azia, Lilu na Orsumoghu bụzị nnọọ ebe dị njọ ugbua dịka a nụrụla ọtụtụ akụkọ gbasara mwakpo ndị oji egbe n'okirikiri ahụ.
Ihe anyị na-eme maka mwakpo na-eme n'okporoụzọ Lilu na Osumoghu - Ndị uweojii Anambra Steeti

Ebe foto si, NPF/Facebook
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambara Steeti bụ Tochukwu Ikenga ekwuola na ha ewepụtala atụmatụ nchekwa dị iche iche ha ga-eji alụso mkpamkpa na mwakpo na-eme n'ụzọ jịkọrọ Anambara na Imo steeti.
O kwuru sị, " Anyị na ndị ọrụ nchekwa nke gụnyere ndị agha, ndị NSCDC na ndị nchekwa ọzọ na-arụkọ ọrụ iji hụ na nchekwa ziri ezi nọ na mpaghara ndịa".
Ikenga kwuru na aha ọbụla ndị a kpọrọ onwe ha agbasaghị ha dịka ha na-ahụ ha dịka ndị oshi na ndị omekome.
Ọ rụtụkwara aka na ụfọdụ ihe na-eche ha aka mgba bụ ngaghariiwe a na-eme ka ewepụ ogige nchekwa ndị uweojii n'okporoụzọ.
Ọ bụ ndị ọkwọọ ụgbọala Tanka mere ya bụ ngaghariiwe maka ebubo na ọ bụ ndị uweojii nọchiri okporoụzọ putere ihe mberede gburu mmadụ abụọ n'ụbọchị Fride.
Mgbe BBC Igbo jụrụ ya maka ndị uweojii a a na-achọ achọ, ọ zara sị " eee, ọ bụ ọgụ ndị uweojii a lusoro ndị omekome a nyere kọmịshọna ohere o jiri gbaa ọsọ. Ugbu anyị na-eme ihe niile iji hụ na anyị chọtara ha".
Cheta na a wakporo ndị mmadụ n'okporo ụzọ jịkọrọ Ukpọ, Lilu, Ọsụmoghu, Azia na Mbọsị n'ụbọchị Sụnde, bụ ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Febụwarị a.
A wakporo kọmịshọna Enugwu Steeti na-ahụ maka Ala, kama ọ gbara ọsọ mana a na-eche na ndị uweojii abụọ sọ ya anwụọla dịka a na-achọ ha achọ kamgbe ihe a mere.
Ebe oji ego achụ ego bụ Gab Ofoma nwụrụ dị andị omekome a wakporo ụgbọala ya ma gbagbuo ya n'ụzọ Ukpor-Lilu-Orsumoghu-Azia-Mbosi n'otu ụbọchị sọnde a.
Ọzọ kwa bụ Okaiwu Rita Pemu bụ onye ndị omekome wakporo n'ụzọ Azia Ọsụmoghu n'otu ụbọchị Sọnde a kama ndị omekome a amataghị onye ọ bụ.
Ọ bụ dịka ha tọọrọ Pemu n'aga n'ime ọhịa ka ọ nwetara ohere were gbaa ọsọ ndụ.
Ọ dịkwa mkpa ịmata na n'oge ntuliaka gọvanọ Anambra steeti, emeghị ntụliaka n'obodo Osumoghu na Lilu dịka ndị Omekome dọọrọ ndị ọrụ INEC aka na ntị na ha achọghị ịhụ ha n'obodo ha.









