Ipob sit at home update: Ahịa ọ zụrụ n'Owerre, Abakiliki, Enugwu, Ụmụahịa na Ọka taa?

Ndi ojiegbe amaghí ndí ha bú

Ebe foto si, Screen Grab

Ndị bi n'isiobodo Enugwu steeti nọ n'egwu dịka ndị amaghi ndị ha bụ fesara ozi ụbọchịụka na-adọ ndị mmadụ aka na ntị ha apụtala ezi taa bụ ụbọchị Mọnde nke ụbọchị iri na isii nke ọnwa Mee afọ 2022.

Ọnọdụ onye apụtala-ezi nke bụ Sit-at-home n'okwu Bekee bụ ọnọdụ ndị otu Ipob hiwere iji akpọ oku ka a tọhapụ onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu bụ onye a na-ekpe ikpe maka ebubo iyi ndụ egwu.

Ha na-ehiwe nke a n'ụbọchi Mọnde ọbụla maọbụ ụbọchị ncheta ọbụla maka Biafra maọbụ ụbọchị ọbụla Nnamdi Kanu ga-apụta ụlọikpe.

Otu onye bi na mpaghara ogbe Asata n'Enugwu achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na, "E nwere onye bịara n'ọdọahịa n'Asata Enugwu Steeti na mgbede Ụbọchịụka na a gbasara ozi sị ndị mmadụ na onye apụtala ezi n'ụbọchị Mọnde maka Sit-at-home".

Dịka onye a bi n'ogbe nke kwuru na na ya esila n'ogbe ya gbapụ maka egwu gara n'ihu si, "ha sịrị onye pụta, ihe ọ hụrụ o were."

Ọnọdụ Sit-at-home n'Enugwu

Enugwu Steeti

Dịka onye ntaakụkọ anyị gagharịrị n'Enugwu Steeti, anyị chopụtara na ụfọdụ ụlọorụ ndị uweojii dịka nke dị na Tran Ekulu mechiri emechi.

Anyị chọpụtakwara na ụfọdụ ụloọru gọọmentị na ụlọọrụ ndọ nkịtị mechikwara emechi.

Enugwu Steeti

Onye ntaakụkọ anyị hụrụ ụfọdụ ndị uweojii na ụgbọala ha na mpaghara Holyghost Roundabout na ọgbete, enwekwara ndị agha nọ na ama egwuregwu nke Nnamdi Azikiwe dị n'Enugu.

Enugwu Steeti

Kama ebe ndị dịka Trans Ekulu, Abakpa, GRA na Obiagu, ndị mmadụ aputaghị dịka ha si apụta na mbụ nke bụ na ọtụtu ndị aputaghi ezi.

Enugwu Steeti

Ndị obodo Agu-Emede dị n'okpuru ọchịchị Isi ụzọ dị n'Enugwu Steeti apụtaghịezi ma ncha maka ya bụ ọnodụ onye apụtala ezi.

Ama Egwuregwu

Kama dịka ọ siri dị ụgbụa, ndị otu ọzọ amaghị ndị ha bụ na-ehiwe ya bụ ọnọdụ onye apụtala ezi dịka Ipob na-ekwu ụfọdụ mgbe na ọbụghị ha na-ehiwe ya bụ ọnọdụ.

Ọlọọrụ ndị uweojii
Nkọwa foto, Ọlọọrụ ndị uweojii emechiri emechi

Cheta na Gọọmentị Naijirịa nwuchiri Nnamdi Kanu maka ebubo ịkpa oke na ibute ọgbaaghara na Naijirịa.

Dịka taa bụ ụbọchị Mọnde, lee ka ọnọdụ Sit-At-Home sị aga na Steetị ndị nọ Ọwụwa Anyanwụ,Naijirịa.

Etu ọnọdụ Ebonyi Steeti nọ taa

Ebonyi Steeti Sit-At-Home

Isi obodo Ebonyi steeti bụ Abakiliki gosiri na ndị mmadụ na-agara ihe dịịrị ha.

NDị na-aga ọrụ na-aga n'ụtụtụ a ebe ụgbọala na ọgbatumtum juru ebe niile.

Ebonyi Steeti Sit-At-Home

Kama njem isi Ebinyi gawa steeti ọzọ anaghị aga maka ọnodụ Sit-at-home.

Ebonyi Steeti Sit-At-Home

Lee foto na-egosi ahia Margret Umahi, Ogoja Road na ogige Centenary City nke nọ n'ụzọ Saharan, Ebonyi Steeti.

Ebonyi Steeti Sit-At-Home
Ebonyi Steeti Sit-At-Home
Ebonyi Steeti Sit-At-Home

Lekwa etu Owerre dị taa

Owerre, Imo Steeti

Isi obodo Imo Steeti nke bụ Owerre dịka ebe asị 'Unu gbapụ'.

Owerre, Imo Steeti

Onye ntaakụkọ anyị chọpụtara na ụloakụ na ụlo akwụkwọ ndị nọ n'Owerre mechiri emechi.

Owerre, Imo Steeti

Ọ chọpụtara na ọtụtụ ndị ahịa apụtaghi ezi nanị mmadụ olemaole ka anyị hụru n'ụzọ.

Owerre, Imo Steeti

Lee ka Sit-at-home si aga n'Abia Steeti taa

Ụmụahịa Abia Steeti

N'isi obodo Abia Steeti bụ ụmụahịa, ụgbọala na Keke na-agbagharị na-enweghị mgbochi ọbụla.

Kama ha ahụghị ọtụtụ ndị mmadụ buru dịka ndị mmadụ apụtaghị maka nchekwa.

Ụmụahịa Abia Steeti

Mgbe onye ntaakụkọ anyị pụrụ n'elekere asaa nke ụtụtụ, ọtụtụ ọdo ahịa emepebeghị maka iwu sit-at-home.

Ụmụahịa Abia Steeti

Ndị nke pụtara nọ ọdụ na-eche ka ha mara ihe ụbọchị ga-eweta.

Ọtụtụ ụlọakụ emepebeghị, ebe ụlọ oriri diiche iche mechiri emechi.

Ụmụahịa Abia Steeti

Onye ntaakụkọ hụru ụfọu ụmụ akwukwọ dịka ha na-aga akwụkwọ.