Ralph Uwazurike: Ihe niile Nnamdi Kanu mere m ka ndị otu ya na-emezi ya ugbua

Nnamdi Kanu na Ralph Uwazurike
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na Ralph Uwazurike

Ralph Uwazurike ekwuola na ọ bụ ụgwọọrụ ihe niile Mazi Nnamdi Kanu mere ya n'oge gara aga ka ọ na-anata ugbua.

Uwazurike kwuru nke a n'ihe onyonyo o tinyere na soshal midia.

O kwuru sị: "Ọ bụ ihe niile nwamadị ahụ mere m na-alaghachịrị ya ugbua."

"Etu o si tụgharịa Radio Biafra nke m hafere ya n'aka, were ya malite imegide m, ka ndị otu ya si ejikwa akara mgbasaozi ya dị icheiche na-emegide ya ugbua."

"Ọ bụ ndị niile kpọrọ onwe ha ndị ụmụazụ ya, ndị DOS, ọ bụ ha niile na-emegidezi ya ugbua."

"Mkpụrụ onye kụrụ ka ọ ga-aghọrọ, mana agbagharala m ya."

Uwazurike akọbuola akụkọ etu o si hibe ụlọọrụ mgbasaozi a kpọrọ 'Radio Biafra' na London, mechaa hafee ya n'aka Nnamdi Kanu ka ọ na-elekọta.

Mana o kwuru na oge gọọmentị Naịjirịa tụchara ya bụ Uwazurike mkpọrọ, Mazi Kanu tụgharịrị were ya bụ 'Radio Biafra' malite ibuso ya agha na ịkọjọ aha ya.

Cheta na Mazi Nnamdi Kanu nọ ugbua n'aka gọọmentị Naịjirịa dịka a na-ekpe ya ikpe maka ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa atụmatụ ịkwatu ọchịchị Naịjirịa.

Ọ bụ n'aka ndị ọkaiwu ya ka Kanu na-esizi agwa ndị nkwado ya okwu, mana ọtụtụ n'ime ha na-emezi ihe masịrị ha.

Otu n'ime ndị dị otu a bụ onye a na-akpọ Simon Ekpa, bụ onye kwuru na ya agaghịzi erube isi n'okwu Nnamdi Kanu.

Esoghị m na ndị na-ekwu na a gaghị enwe ntuliaka na Naịjirịa

Ralph Uwazurike

Ebe foto si, Ralph Uwazurike

N'ịga n'ihu, Uwazurike, onye bidoro otu na-achọ nnwereonwe Biafra a kpọrọ MASSOB, kwukwara na o soghi na ndị na-ekwu na a gaghị enwe ntuliaka na Naịjirịa n'afọ 2023.

Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị otu na-azọ nnwereonwe na-ekwu na ha agaghị ekwe ka e mee ntuliaka na Naịjirịa.

Uwazurike kwuru nke a n'onyonyo o kesara na Facebook na nso nso a, iji kọwaa ihe mere o ji akwado Yahaya Bello maka onyeisiala.

"Esoghị m na ndị na-ekwu na a gaghị eme ntuliaka na Naịjirịa, maka na ama m mkpa ntuliaka dị," Uwazurike kwuru.

"Anyị enwetebeghi Biafra, anyị ka nọ na Naịjirịa, ọ bụ ya mere o ji dị mkpa na anyị ga-esonye na ntuliaka."

"Ọ bụrụ na e meghi ntuliaka, kedụ ka obodo ga-esi gaa n'ihu? Kedu ka a ga-esi na-achịkọta obodo?"

"Abụghị m onye na-ekwu otu ihe ma mee ihe ọzọ."

Aha onyonyo, Igbo Presidency 2023: Mpaghara Onyeisiala Naịjirịa si pụta agbasaghị m mana ... Uwazuruike

Uwazurike gara n'ihu kwuo na ọ bụ ikike dịịrị ya ịkwado onye ọbụla ọ chọrọ maka ọkwa Onyeisiala.

O kwuru na ọtụtụ ndị ọzọ a ma ama n'ala Igbo nwechara ndị ha na-akwado na-abụghị ndị Igbo; "kedụ ihe nke Uwazurike ga-eji pụọ iche".

Aha onyonyo, Onye ndu ndị MASSOB bụ Ralph Uwazuruike gbọrọ ọkụ n'ọnụ na mkparịta ụka ya BBC

Gbasara ndị Igbo pụtarala ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa, Uwazurike kwuru na ha niile enweghị nke ji obi ya azọ ya bụ ọkwa.

O kwuru sị: "Ihe ha na-achọ bụ ka enye ha ọkwa osote onyeisiala, mana ha ma ụma na-eme ka ọ bụ ọkwa onyeisiala ka ha na-azọ."

"Ha nwereike ịghọgbu ụnụ niile, mana ha agaghị aghọgbu m."

Onye bụ Ralph Uwazurike

Ralph Uwazurike

Ebe foto si, Getty Images

Ralph Uwazurike bụ ọkaiwu ma bụrụkwa onye na-azọ nnwereonwe Biafra.

Ọ bụ ya malitere otu a kpọrọ 'Movement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra' n'afọ 1999.

Gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Uwazurike ma kpụpụ ya ụlọikpe maka ebubo ịkpa nkata ịkwatu ọchịchị Naịjirịa.

Mana e mechara chụpụ ya na MASSOB n'afọ 2015, n'ihi ebubo nrụrụaka.

Uwazurike mechara hibe otu ọzọ a kpọrọ Biafra Independence Movement (BIM).