Igbo Presidency 2023: Mpaghara Onyeisiala Naịjirịa si pụta agbasaghị m mana ... Uwazuruike

Aha onyonyo, Igbo Presidency 2023: Mpaghara Onyeisiala Naịjirịa si pụta agbasaghị m mana ... Uwazuruike

Onyeisi otu chọrọ nnwereonwe Biafra bụ Biafra Independent Movement (BIM) bụ Raph Uwazuruike ekwuola na ọ chọghị ịma mpaghara onyeisiala Naịjirịa nke afọ 2023 ga-esi apụta.

O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ebe ọ sị na ihe kachasị mkpa bụ ka onye ahụ mee ka obodo dị mma.

Ọ sị na ọ bụ onye ga-eme ka obodo nwee nchekwa, ka ọrụ dị, ka ụmụakwụkwọ nwete ọrụ ma ha gụchaa akwụkwọ.

Ọ sị na onye na-azọ ọchịchị apụtaghị na ndị obodo ha naanị ga-eri uru dị na ya.

Uwazuruike gara n'ihu katọọ atụmatụ 'zoning' n'ọkwa onyeisiala Naịjịrịa ma sị na ọ dịghị etua n'Amerịka bụ ndị Naịjirịa na-eṅyomi.

"Onweghi ihe ọbụla m hụrụ dị oke mkpa na 'Zoning', ndị na-eme ya bụ na mpụ na nrụrụaka na-achọ akpa nke ha.

N'okwu onye Igbo ịzọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa

Uwazuruike sị na o nwebeghi onye Igbo ọbụla chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala kpọtụrụla ya ma sị lekwa lekwa na achọrọ m izọ ọkwa.

Nke a mere na ọ maghị ma e nwere onye Igbo chọrọ ịzọ ọkwa Onyeisiala n'afọ 2023.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ naanị Gọvanọ Kogi Steetị bụ Yahaya Bello bụ onye chọ ya si Kogi bịa Owerri mee ka ọ mata na ọ chọrọ ịzọ ọkwa.

Uwazuruike sị n'ihi nke a mere o jiri akwado Bello maka ọkwa onyeisiala Naịjirịa.