Nnamdi Kanu's Court case: Ụlọikpe eyighariala ikpe Nnamdi Kanu ọzọkwa

Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya

Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja eyigharịala ikpe a na-ekpe Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ọzọ.

A na-ekpe Kanu ike maka ebubo metụtara iyi ndụ egwụ na ịkpa nkata megide gọọmentị Etiti.

Ọkaikpe na ekpe ikpe ahụ bụ Jọstis Binta nyako nọbụ n'abalị 18 nke ọnwa Mee bụ ụbọchị e kpere ikpe ahụ yigharịa ikpe ahụ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Mee.

Mana ozi pụtara n'ehihie a na-ekwu ya e yigharịala ya ọzọ n'ihi na ọkaikpe Binta Nyako agaghị enweli ike ịbịa" maka na ọ dị ihe a kpọrọ 'indisposed' na Bekee.

Ọkaiwu Kanu bụ Mike Ozekhome gwa BBC Igbo n'ekwentị na e yigharịrị ya gawa n'ụbọchị abalị 28 nke ọnwa Juun, afọ 2022.

"Ọ bụ Eziokwu. E yigharịala ya. Eyigharịrị ya gaa abalị 28 nke ọnwa Juun, afọ 2022."

E kwesịburu ikpebi ma a ga-atọhapụ Nnamdi Kanu nwa mgbe nta nke Bekee kpọrọ 'bail' n'ụbọchị 26 nke ọnwa Mee mana ugbua okwu ahụ agaghị enwe isi rue ọnwa Juun bụ mgbe e bugara ya.

Ụlọikpe eyighariala ikpe Nnamdi Kanu ọzọ

Nnamdi Kanu,Ozekhome,Ejiofor,Uwazuruike

Ebe foto si, Goddy Uwazuruike

Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja ehigharịala ikpe Nnamdi Kanu, onye ndu otu nnwereonwe Biafra bụ Ipob rue abalị 26 nke ọnwa Mee afọ 2022 iji kpebie kpọmkwem ma a ga-ahapụ Kanu ka o si n'ụlọ na-abịa ụlọikpe nke Bekee kpọrọ 'bail.

Nke a na-abịa dịka ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Mike Ozekhome n'ịrịọ ka ụlọikpe dobe n'ụsọ, akwụkwọ nke Gọọmenti Etiti gbara n'afọ 2019 ka a kpụchapụ ikike isi n'ụlọ abịa e nyeburu Kanu.

Ozekhome gwara ụlọikpe na Kanu agbaghị ọsọ ịbịa ụlọikpe kama ọsọ ndụ ya dịka a wakporo ụlọ ya.Mana ọkaiwu na-ekpe ahụ bụ , David Kaswe jụrụ okwu Ozekhome sị na ihe ndị ọzọ emeela mere na na agaghị akwụkwa na nke ahụ.Ka Ọkaikpe ji ikpe ahụ bụ Jọstis Binta Nyako gechara ihe ọkaiwu abụọ ahụ kwuru, o higharịrị ikpe ahụ gaa Mee 26 bụ mgbe ọ ga-ebi okwu na ya.

Ụlọikpe akụpụla ebubo isii ọhụrụ Gọọmenti Etiti na-ebo Nnamdi Kanu

Nnamdi Kanu, Ọkaiwu Mike Ozekhome na Ihe anyi Ejiofor

Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja akụpụla ebubo isii ọhụrụ nke Gọọmenti Etiti wetara iji tichie asaa ha boburu onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu taa.

A na-ekpe Nnamdi Kanu ikpe maka ebubo iyi ndụ egwu na ịkpa nkata ikwatu Gọọmenti Naijiria.

Taa dịka ikpe ahụ malitere, Gọọmenti Etiti megharịrị ebubo asaa fọburu a na-ebo Kanu ma tinye isii ọhụrụ.

Mana Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Mike Ozekhome kesara ọkaikpe na-ekpe ikpe ahụ bụ Jọstis Binta Nyako sị na gọọmenti na-achọ ụzọ iji gbatia ikpe ahụ site na ịgbanwegharị ebubo ha na-ebo Kanu.Ozekhome gwara Ọkaikpe na nke a bụ nke asaa Gọọmenti Etiti na-agbanwe ebubo ha na-ebi Kanu.

Ọ bụghị eziokwu na a gụnyere Ifeanyi Ejiofor na Maxwell Opara- Ọkaiwu Aloy Ejimakor

Nnamdi Kanu in court today

Ebe foto si, Aloy Ejimakor

Otu n'ime ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu ekwuola na akụkọ na Gọọmenti Etiti etinyela ogbo ya bụ Ifeanyi Ejiofor na Maxwell Opara dịka ndị so azara ọnụ na n'ebubo a na-ebo Nnamdi Kanu bụ ụgha.

Ejimakor, onye nọ n'ụlọikpe maka ya bụ ikpe taa, gwara BBC na n'ezie Gọọmenti gbanwere ebubo ha na-ebo ya site n' ịkụpụ otu n'ime asaa ha na-ebo ya, na-etinyeghị Ejiofor na Opara.

Ọkaiwu Ejimakor sịrị, "Ee, Gọọmenti Etiti agbanyela ebubo ha na-ebo Nnamdi Kanu site na-ebubo asaa banye ebubo isii, ya bụ ,ha kpụpụrụ otu. Mana ha agbakwunyeghị onye ọbụla ọzọ"

A na-ekpe Nnamdi Kanu ikpe maka ebubo iyi ndụ egwu na ịkpa nkata ikwatu Gọọmenti Naijiria.

Ụlọikpe ekweghị inye Nnamdi Kanu 'bail'

Nnamdi Kanu
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya taa n'Ụlọikpe na Abuja

Akụkọ sitere n'ụlọikpe elu nke dị n'Abuja na-ekwu na ọkaikpe enyeghị Nnamdi Kanu ohere ịkwụ ụgwọ ma pụọ nwa mgbe nta nke bụ 'Bail' n'okwu bekee.

Ikpe maka bail a so n' otu isi sekpụ ntị mere e ji ekpe ya ikpe taa.

N'ịrịọ ka e nye Kanu ohere isi n'ụlọ na-abịa ikpe ya, Ọkaiwu Mike Ozekhome bụ onye du ndị ọkaiwu ndị ọzọ na-ekpechitere Kanu kwuru na Kanu na-arịa ahụ site "ajọ ọgwụ a gbara ya" nke mere ka ọnọdụ ahụike ya ka njọ.

Ozekhome kwuru na ọgwụ ahụ a gbara ya mere ya ka ọ ghara ịna anyụli nsị , na obi otiti.

Ọ kọwakwara na ọka ntaramahụhụ e mere Kanu abalị asatọ na Kenya tupu a kpụlata ya mekwara ka ọnọdụ ahụike ya kawanye njọ.

Ọ bụ dịka ọkaiwu Nnamdi Kanu gbara akwụkwọ sị, "tupu e kpebie ikpe n'isi onye ọbụla , onye ahụ nwere ohere ịgagharị etu o siri chọọ".

Kama ọkaiwu Binta Nyako kpụrụ ya bụ akwụkwọ were sị, "akwụkwọ okwu Bail ya erughị eru kama ohere dị igbagharịkwa akwụkwọ a ọzọ".

Nnamdi Kanu awụchiela n'ụlọikpe

Akụkọ na-ekwu na Nnamdi Kanu awụchiela n'Ụọikpe Ukwu dị n'Abuja ugbua.

Gọọmentị etiti kpụpụru Nnamdi Kanu ikpe maka ebuobo metụtara iyi ndụ egwu na ịkpa nkata ịchụpụ gọọmentị.

A gụnyere ọkaiwu Nnamdi Kanu na ndị e so ekpe ikpe?

Nnamdi Kanu in court today

Akụkọ na-ekwu na gọọmentị etiti Naijirịa agbanweela ebubo isii a na-ebo Nnamdi Kanu maka ịgba gọọmentị Naijirịa mgba okpuru ma gụnye ọkaiwu ya Ifeanyi Ejiofor na Mxwell Opara dịka ndị soro ya mee ihe eji ebo ya ebubo.

Mana Ọkaiwu Ejimakor kwuru sị, "Ee, Gọọmenti etiti agbanyela ebubo ha na-ebo Nnamdi Kanu site na-ebubo asaa banye ebubo isii, ya bụ ha kpụpụrụ otu. Mana ha agagụnyeghị onye ọbụla ọzọ."

Ndị uweojii nọ na mpaghara ebe a na-ekpe ikpe Nnamdi Kanu ejirila egbe na ikuku ose nke bụ Teargas na bekee were chụsaa ndị biara ịkwado Nnamdi Kanu.

Nke a mere na ha anọghịzị nsọ ogige ụlọikpe ebe ya bụ ikpe na-aga n'ihu.

Nnamdi Kanu in court today
Nnamdi Kanu in court today

Etu ndị mmadụ siri wuchie maka ikpe Nnamdi Kanu

Dịka a na-atụ anya ka ikpe Nnamdi Kanu bido taa, ọtụtụ ndị si mpaghara di iche iche awuchiela maka ya bụ ikpe.

Nnamdi Kanu in court today
Nnamdi Kanu in court today
Nnamdi Kanu in court today

Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ahụ na-ekwu na ndị ji ụgbọala Bọsụ echere bụ ndị otu Ipob biara n'ogige ụlọikpe ahụ kama ndị ọrụ nchekwa ekweghị ha banye.

Ha laghachiri azụ ma were ụkwụ biawa nsọ ebe ahụ.

Ọtụtụ ndị nọ ebe ahụ ugbua yi uwe njririmara ndị Igbo nke si n'ọwụwa anyanwụ Naijirịa.

Nnamdi Kanu in court today

N'otu aka ahụ, ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ nọ n'uju ha na mpaghara ogige ụloikpe iji hụ na ihe niile gara nke ọma.

Nnamdi Kanu in court today

Dịka nchekwa ọzọ awuchiela ebe ahụ ugbua were bulie ọnụ ọgụgụ ndị nchekwa nọ ebe ahụ.

Ihe a na-atụ anya n'ikpe nnamdi kanu taa

Nnamdi Kanu in court today
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya

Ikpe Mazi Nnamdi Kanu, onyeisi otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra a kpọrọ, 'Indigenous People of Biafra' (IPOB) ga-amalite ọzọ taa bụ ụbọchị 18 nke ọnwa Mee n'Abuja.

A na-ekpe Mazi Kanu ikpe n'ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ịkwatụ ọchịchị Naịjirịa, bụ nke Gọọmentị Etiti boro ya.

Lee ihe a na-ele anya ga-eme n'ụlọikpe taa:

Ịtọhapụ Mazi Kanu:

N'ụbọchị ikpeazụ e kpere ikpe a, ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Mike Ozekhome na Ifeanyi Ejiofor tinyere akwụkwọ ka a tọhapụ Kanu.

Cheta na ndị ọkaiwu Kanu gwara ụlọikpe ka ha kụchapụ ebubo niile e boro ya maka na ha achịtaghị aja.

Ha gwakwara ụlọikpe ka a tọhapụ Mazi Kanu ka o si n'ụlọ na-abịa ụlọikpe.

Ọkaikpe Binta Nyako kwuru na ọ bụ n'ụbochị ikpe ọzọ ka ọ ga-eleba arịrịọ a anya.

N'ụbọchị ikpeazụ e kpere ikpe Nnamdi Kanu, bụ abalị asatọ nke ọnwa Eprelụ, ndị ọkaiwu ya gwara ndị nkwado ya na ha nwere nchekwube siri ike na Kanu ga-eso ha ala ụlọ n'ụbọchị ikpe ọzọ.

Ịkpọ ndị akaebe megide Kanu

Ọ bụrụ na Ọkaikpe Binta Nyako atọhapụghị Kanu, mara na o nwereike ịgwa gọọmentị Naịjirịa ka ha kpọọ ndị akaebe ha megide Kanu.

Nke a pụtara na ya bụ ikpe amalitela n'uju.

Ọ bụrụ na ọkaikpe Binta Nyako nye ohere ka gọọmentị Naịjirịa kpọọ ndị akaebe taa, e nwereike ikpuchi ha ihu.

Nke a bụ iji chekwaa ndụ ndị ahụ na-agba akaebe, dịka usoro e ji ekpe ikpe metụtara ebubo iyi ndụ egwu siri kwuo.

Nnamdi Kanu nwere ike ịgbanwe uwe ya

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Nigeria Presidency-Facebook

Nkọwa foto, Foto gosiri Nnamdi Kanu n'ụbọchị a nwụchịrị ya ma kpọpụ ya n'ụlọikpe na Juun 2021

Cheta na Mazi Kanu na-eyi naanị otu uwe a pụta ụlọikpe kemgbe a nwụchiri ya na mba Kenya n'ọnwa June afọ 2021.

Ndị ọkaiwu ya kwuru na ọ bụ ndị DSS jụrụ ikwe ka Kanu gbanwee uwe ya.

Mana n'ụbọchị Fraịde, abalị iri na atọ nke ọnwa Mee, gọvanọ Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo gara leta Kanu na mkpọrọ.

N'onyonyo ha abụọ sere, ọ bụghị akwa ahụ Kanu na-eyibu ka o yi, nke pụtara na ọ gbanweela uwe.

Ọtụtụ nwere olileanya na Kanu ga-eyi uwe ọhụrụ bịa ụlọikpe taa.

Ihe mere n'ụbọchị ikpe gara aga:

A kụchapụrụ ọtụtụ ebubo e boro Kanu

Ọkaikpe Binta Nyako kụchapụrụ ebubo asatọ gọọmentị Naịjirịa boro Kanu ma kwuo na ebubo ndị ahụ achịtaghị aja.

Cheta na ọ bụ ebubo iri na ise ka gọọmentị etiti boburu Kanu, mana ugbua ha dịzị naanị ebubo asaa.

DSS ekweghị ka Nnamdi Kanu gbanwee uwe

N'ụbọchị Eprel 8, Emmanuel Kanu bụ nwanne Nnamdi Kanu gwara BBC Igbo na ha chịgaara ya uwe ọzọ na-abụghị 'Isi Agu' mana ndị DSS ekwekwaghị ka o yie ya.

Cheta na ndị DSS kwuru na ha agaghị ekwe ka Mazi Kanu yie uwe 'Isi Agụ' n'ihi na iwu ha megidere ya.

Mana o doghị anya ihe mere ha jị jụkwa uwe ọhụrụ nke a chịtaara Kanu na-abụghị 'Isi Agụ'.