Nnamdi Kanu Sit at home: Etu nọrọ n'ụlọ n'Ọwụwa Anyanwụ nke ụbọchị Mee 18, 2022, bụ ụbọchị ikpe Nnamdi Kanu si gaa

Ama be Nnamdi Kanu n'Afaraukwu,Abia steeti
Nkọwa foto, Etu ihu ama be Nnamdi Kanu n'Afaraukwu,Abia steeti dị n'ụtụtụ taa

Dịka Nnamdi Kanu, onye ndu otu nnwereonwe Biafra bụ Ipob na-apụta n'ụlọikpe taa, ọtụtụ ebe n'Ọwụwa Anyanwu Naijiria tọgboo chakoo.

Otu Indigenous People of Biafra kpọburu oku ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ taa bụ Wenezde, abalị 18 nke ọnwa Mee,afọ 2022 iji kpoo oku ka Eọọmentị Etiti tọhapụ onye ndu ha.

A na-ekpe Nnamdi Kanu bụ onye a nwụchiri na mba Kenya ma kpụlata ya Naijiria n'abalị 24 nke ọnwa Juun, afọ 2021, ikpe maka ebubo metụtara iyi ndụ egwu na ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria.

Ndị ntaakụkọ anyị gararịị wetara akụkọ etu ụlọakwụkwọ, ụlọakụ nakwa na ọdọahịa siri mechie ebechie n'ebe dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ.

N'Aba, ebe nile tọgbọ chakoo

Aba, Abia steeti
Nkọwa foto, Lee etu Aba siri kwuru na

N'aba, ebe nile dị ka ebe a gbara ọsọ.

Onye ntaakụkọ anyị nọ na'Aba kwuru na okporoụzọ a ma ama tọgbọọ chakoo.

E nweghị ụgbọala na-aga mana mmadụ ole na ole n'okporoụzọ.

St. Michael's Road,Aba
Nkọwa foto, Okporoụzọ St. Michael's Road, dị n'Aba, Abia steeti n'a Mee 18,2022

Ụlọakwụkwọ, ụlọakụ, ọdọmmanụ ụgbọala n'ọdọ ụgbọala emepeghị.

Ọbụla ndị obere ọdọahịa n'nso n'ụlọ ndịmmadụ emepeghị.

Ndị ọrụ nchekwa; ndị uweojii, ndịagha na-agagharị iji hụ na o nweghị nsogbu dapụtara.

N'Ebonyi, ọtụtụ ndị mmadụ apụtaghị ama

Abakaliki, Ebonyi steeti

Ebonyi bụ steeti ndị mmadụ anaghị esonyebu n' oku nọrọ n'ụlọ mana taa bụ abalị 18 nke ọnwa Mee, afọ 2022, ọtụtụ ndị Ebonyi apụtaghị ama.

Onye ntaakụkọ anyị gagharịrị n'Abakaliki kwuru na ụlọakụ, ọdọahịa, ahịa nakwa ụlọọrụ ndị na-akwọ ndị njem emepeghị emepe.

Ọdọahịa dị n'Abakaliki Mee 18,2022
Nkọwa foto, Ọdọahịa dị n'Abakaliki Mee 18,2022

Ọbụladị n' ahịa Margaret Umahi International Market, Afikpo Road,na New Market Road, Peace Park, o nweghị ndị na-azụ maọbụ ere ihe.Ma ụlọakwụkwọ praimari,sekọndrị na ụlọakwụkwọ dị elu dị na steeti ahu emepeghị.

Ụlọakụ emepeghị ka ha a hụụ mkpụrụ mmadụ ole na ole na-ewe ego n'igwe ego ATM.

N'Owere, ebe nile dị ka ebe a gbara ọsọ

Owere

N'Owere ,Imo steeti, onye tụpụ ntụtụ, a ga-anụ ụda ya dịka ndị mmadụ apụtaghị ezi taa.

N'Enugwu, ụfọdụ nọ n'ụlọ, ụfọdụ pụrụ ama

Down Chime
Nkọwa foto, Down Chime, New Heaven, Enugwu, Mee 18,2022

Iro ekwọchaghị ekwo ka ọ na-adị mbụ mana o kwokarịrị ka ọ dị na Monde abalị Mee 16, afọ 2022 e meburu nọrọn'ụlọ.

Ahịa, ụlọakwụkwọ na ụlọakụ emepeghị.N'Abakpa Nike, ole ma ole ụmu obere ụgbọala, keke na ụgbọla ndị mmadụ nwere onwe na-agagharị.

Enugwu

N' Okporoụzọ awaraawara Enugwu- Abakaliki gawa 82 Division, ụgbọala na-agatụ mana ọdịọ́ ahịa kpochichara akpọchi.O nweghị ahịa maọbụ ụlọakwụkwọ maọbụ ụlọnri mepere na New Heaven site n'Upper Chime to Down Chime.

Abakpa Nike Junction
Nkọwa foto, Abakpa Nike Junction Mee, 18,2022

Onye ntaakụkọ ahụ hụrụ na mpaghara Government House ọkachasị ụzọ Bisala Road, Rangers Avenue were rue Presidential Road ruo Obiagu tọgbọ chakoo, o nweghị ahịa na-azụ ebe ndị a. Ọtụtụ ahịa dị na-Enugwu, ọdọ mmanụ ugbọala na ụlọọrụ gọọmentị emepeghị.

N'Ụmụahịa, ebe nile dara jụụ

Ụmụahia May 18 2022

N'Umuahia, isiobodo Abia steeti, ebe nile dere jụụ.

Umuahia

Ụlọakwụkwọ, ụlọọrụ, ọdọụgbọala, ọdọ mmanụ ụgbọala, ebe a na-ere nri na ihe ndị ọzọ emepeghị na-agbanyeghị na o nweghị onye na-amanye onye ọbụla.

Be Nnamdi Kanu n'Afaraukwu
Nkọwa foto, Be Nnamdi Kanu n'Afaraukwu taa Mee 18,2022

N'Afaraukwu be Nnamdi Kanu na obodo ndị dị ya nso, ụlọahịa na ụlọakwụkwọ agbapeghị.