Ago Accident: 'O rughị nkeji 10 mụ na nwunye m hụrụ, ụgbọala akụgbuo ya- di nwaanyị nwụrụ n'ọdachi a sị Lastma kpalitere'

Ebe foto si, BBC/Paul Ibeh
Nwoke nwunye ya nwụrụ dịka ọkwọụgbọala ndị ọrụ kpachikpachi okporoụzọ bụ 'Lagos State Traffic Management Authority', (Lastma) na -achụ ọsọ kugburu mmadụ abụọ n' Ago dị n'Okota ,Legọs akọwaala ọnọdụ nwunye ya ji nwụọ.
Chinedu Ibeh, onye Anambara steeti gwara BBC Igbo na o bụ Nkeji iri ya na nwunye ya hụchara ka ọdachi ahụ napụrụ ya nwunye ya, ma dote ụmụ ha abụọ n'ụlọọgwụ, ji dakwasị ya.
O pekata mpe mmadụ abụọ; ọkwọkeke a ma dịka 'Cityboy' na otu nwaanyị na-akpọga ụmụ ya akwụkwọ a kpọrọ 'Ogochukwu Ibeh, gbara afọ 31, nwụrụ ụbọchị Tuzde,(3/10/2023)dịka ọkwọụgbọala Toyota Siena bu akara AKD 944 HN nke ndị ọrụ Lastma na ndị uweojii ha na ha na-arụkọ ọrụ na-achụ ọsọ kuru keke na ndị mmadụ n'okporoụzọ dị n'ime 'street' n'Okota,Legọs.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nsonso a, Maazi Ibeh sịrị,"Nwunye bụ onye nwụrụ anwụ n'ihe mberede mere ebe ndị uweojii na-achụ ụgbọala ọsọ."
"Ya bụ onye gbajiri ụkwụ. Ebu m ya gaa ụlọọgwụ Isolo General Hospital mana ọ napụtaghị na ya."
"Ụmụ anyị abụọ gbara afọ ise na afo asaa merụrụ ahụ ka nọ n'ụlọọgwụ ugbua."
"Mụ na a kwadoro n'ụlọ na-apụ, m si ha gawa, ka m jiri aka m gbachie ụzọ."
" O rughị Nkeji iri, m pụta ebe igwe mmadụ ju ebe a nile n'ihi ihe mere.
" Ọ kụrụ nwunye ebe ọ gbachara n'akụkụ na-eze ndụ, mana ụgbọala ahụ bịara ebe ahụ ya na ụmụaka kwụ kụọ ha."
"Ọ na-eku ume obere obere, ọ bụzị oge ahụ ka m ji buru ya gawa ụlọọgwụ."
Maazi Ibe tụrụ arịrị na ọ bụrụ na ndị ụlọọgwụ zara nwunye ya ngwangwa ha rutere, na ha kara ịzọta ndụ ya.
Ọ kọwara nwunye ya lara mmụọ bụ onye ya na ya ebiela dịka di na nwunye afọ 15, dịka "onye anaghị achọ nsogbu"Ọ na-agba mbọ" ma gaa n'ihu tụọ arịrị sị, " Nnukwu ihe kwara m. Amaghị m nk em na-emezi eme "

Ebe foto si, Screengrab
Ihe Lastma kwuru
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dịka ndị nọ ebe ihe mere na-arụ ndị ọrụ Lastma aka maka ihe meberede ahụ, ụlọọrụ Lastma agọọla, si na o sighị ha n'aka.
Akwụkwọ mgbasaozi nke si n'aka ụlọọrụ ha na-ata ọkwọ ụgbọala Toyota Siena ụta " ịnya ụgbọ ya n'okporo o kwesịghị"(one-way).
Ozi nke ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ahụ bụ Taofiq Adebayo binyere aka ma wepu n'aha, onyeisi LASTMA bụ Bolaji Oreagba, kwụrụ si: "E jidere ọkwọụgbọala TOYOTA Sienna bus nwere akara AKD 944 HN maka ịgba n'ụzọ e si ala ala na nso Ago-Palace Way, Legọs".
"Onyeuweojii anyị na ya na-arụkọ kwetara iso ụgbọala ahụ gawa ụlọọụ Latsma maka idenye aha ya n'akwụkwọ."
“Ka a na-aga, ọkwọụgbọala chọrọ ịgbaọsọ, tinye isi n'okporo Bayo Oyewale Street' dị nso Ago Round-About ebe ọ kụrụ keke bujuru mmadụ.
“Ha gara n'ihu kwuo na ha ga-akpupu ọkwọụgbọala ahụ ụlọikpe.
Otụtụ ndị bi nso na Bayo Adewole Street dị n' Ago Palace Way ,Ọkọta, Legọs steeti bụ ebe ihe mberede okporoụzọ tara isi mmadụ abụọ,akpoola oku ka gọọmenti steeti ahụ machie ndị ọrụ nhazi kpachikpachi okporoụzọ na steeti ahụ a kpọrọ 'Lagos State Traffic Management Authority', (Lastma) dịka ha na-ebo ha ebubo ịnyụ ihe sri na 'ọdachi ahụ.
O pekata mpe mmadụ abụọ; ọkwọ keke na nwaanyị ji ụmụ atọ nwụrụ dịka ọkwọụgbọala Toyota Siena ndị ọrụ Lastma na ndị uweojii ha na ha na-arụkọ na-achụ ọsọ kụgburu mmadụ abụọ ma merụọ ise ahụ n'okporoụzọ dị n'ime Okota,Legọs ụbọchị Tuzde.

Ebe foto si, Dabosco Tech/Chinedu Ibe
Ọkwọkeke,nwaokorobịa onye Ugwu Awụsa na-akwado ịlụ nwaanyị n'izuụka ole na ole na-abịa a ma ama dịka 'City Boy' nwụrụ ozigbo ebe ya bụ ike mere dịka ọ merụrụ ahụ n'isi, ebe Oriakụ Ibeh gbara afọ 31 nwụrụ n'ụlọọgwụ Isolo General Hospital ebe e bugara ya.

Ebe foto si, Chinedu Ibeh
Mmadu ise ndị ọzọ gụnyere ụmụaka abụọ merụkwara ahụ n'ọdachi ahụ, e buga ha ụlọọgwụ dị iche iche.
Ndị nọ ebe ihe boro gwara BBC Igbo na ọ bụ dịka otu onye uweojii ya na ndị Lastma a na-arụkọ ọrụ wụbara n'ime ụgbọala ọkwọ ụgbọala Siena ahụ zọwa 'steering Wheel' ka ụgbọ ahụ kopuru, suo keke ndị ga kwụbara n'akụkụ ụzọ nakwa ndị na agara onwe ha.

Ebe foto si, Dabosco Tech
Otu onye n'ime ha bụ Ikechukwu Okafor kwuru sị, " Ya bụ ihe mere n' ụtụtụ ka o ji Nkeji 25 gafee Elekere Asaa, ndị keke kwụbara keke ha."
"Ndị Keke kwụ na-ahịrị ha, onye na-eche ka o rụọ ya, ndị na-akpọ ndị njem na-akpọ.
"Okwọkeke nwụrụ anọghị ọrụ, ọ kwụbara keke ya, ya na mmadụ na-akpa nkata n' ebe nkwụsị ha."
Ana m aza oku ekwentị ntị nụ, 'gbowa', m gbubie mkparịtaụka m na-akpa, gawa ebe ihe mere".
"Anyị chọwara ụzọ anyị ga-esi kpọpụta ndị ihe meberede ahụ kụnyere n'okpuru ụgbọala."

Ebe foto si, Chinedu Ibeh
"Enyere m aka anyị bulie ụgbọala bụpụta otu nwaanyị ahụ kpọ ụmụ ya atọ n'okpuru ụgbọala nke ụkwụ ya rọgọsịrị n'ime, gbajizie.."
"Anyị tinyere ya na keke ,a kpọga ya ụlọọgwụ."
".Enyoro ma anya n'ọkpuru ụgbọala, were hụ nwokorobịa keke, ụburu ya kposa n'otu akụkọ. ọ bụ nwa m na ya na-ekele ọfụma."
"E jidere ọkwọụgbọala na-achọ igosi ya iwe were chọpụta na ọ bụ ndị Lastma na uweojii na-achụ ya, chụbata ya ebe.."
Ọgbaghara malitere ngwangwa nke a mere dịka igwe mmadụ gbakọrọ, jidere ma kụọ onye uweojii ahụ ihe tinka kụrụ mpanụ , ebe onye ọrụ Lastma gbara ọsọ gbalaga.
Ya bụ ọdachi kpalitere ngagahrịiwe na mpaghara ahụ tupu ndị uweojii e were anwụrụ ose na egbe chụsaa ndị mmadụ ma zọpụta onye otu ha.












