Prof Cyril Ndifon: A tụọla onye nkuzi mahadum a mkpọrọ maka mmetọ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị

Ọkammụta Cyril Ndifon

Ebe foto si, ICPC

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ụlọikpe Ukwu Goomenti Etiti dị n'Abuja atụọla otu onye nkuzi mahadum 'University of Calabar' mkpọrọ afọ ise maka imetọ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị.

Ọkaikpe James Omotosho kwuru na ikpe mara Ọkammụta Cyril Ndifon n'akwụkwọ ebubo abụọ n'ime anọ nke ụlọọrụ 'Independent Corrupt Practices and other related offences Commission,( ICPC), boro ya nke metụtara ịkpagbu ụmụakwụwkọ ụmụnwaanyị n'ụzọ metụtara mmekọahụ

Mana ụlọikpe ahụ hapụrụ ogbo ya a gbakọrọ ya na ya akwụkwọ bụ Sunny Anyanwu bụ onye e boro ebubo na ọ kpara nkata ịhụ na enyeghị ikpe kwụrụ ọtọ n'okwu ahụ sị na enweghị ihe akaebe egosiri n'ebubo ahụ.

ICPC boro Ndifon ebubo na dịka onyeisi ngalaba Iwu (Law Department) na mahadum Unical na-amagwa ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ka ha zitere ya onyonyo ebe ha gba ọtọ.

Prof Cyril Ndifon : Ihe nchọpụta Unical mere maka ebubo imetọ ụmụakwụkwọ nwaanyị megide onye nkuzi ha gosiri

Mahadum University of Calabar

Ebe foto si, University of Calabar

Ndi isi mahadum 'University of Calabar' (Unical)ekpebila n'ezie na otu onye nkuzi ha bụ Okammụta Cyril Ndifon na-amanye ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị na ngalaba Iwu nke mahadum ahụ idina ya iji nweta akara n'ule.

Ha kpebikwara izigara ngalaba gọọmentị na-ahazi agụamkwụkwọ mahadum bụ 'National Universities Commission'(NUC) na Ministrị na-ahụ maka agụmakwụkwọ mpụtara nnyocha ha mere banyere ebubo ndị eboro Ndifon.

Nke a pụtara ihe dịka otu ndịisi mahadum ahụ hiwere inyocha ebubo megide Ndifon , onye bụ onyeisi ngalaba Iwu na mahadum ahụ, wepụtara mpụtara nnyocha ha mere na nsonso a, dịka ụlọntaakụkọ 'Cross River Watch si kwuo.

N'abali 17 nke ọnwa Ọgụstụ, afo 2023, mahadum Unical kwụsịrị Ndifon ọrụ n'ike iji nye ohere ka e mee nyọcha dịka ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị na ngalaba Iwu na mahadum ahụ mere ngagharịiwe iji kppo ọkụ ka a chụọ nwa amadi ahụ n'ọrụ maka mmetọ ụmụnwaanyị.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Akwụkwọ mpụtara nchọpụta ahụ nke rutere BBC Igbo aka gosiri na ebubo ịmanye ụmụakwụkwọ ndina bụ eziokwu dịka ụfọdụ ụmụakwụkwọ ji ihe akaebe pụtara gbaa ama na Ndifon kwaturu ha n'ule .

Ha boro ebubo na dịka ha jụrụ idina ya maọbụ mịa odogwu ya, ebe ụfọdụ gbara aka ebe na ha mere nke a dịka ọ kwaturu ha ọtụtụ ugboro, mee ka ha ghara igụcha, oge ndị ogbo ha pụtara n'ụlọakwụkwọ ahụ.

Akwụkwọ mpụtara nnyocha ahụ ahụ kwuru sị," Enwere mmanyere ndina na ngụgba megide Ọkammụta Ndifon dịka ụfọdụ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị na-agụ ugbua na ndị gụburu na ngalaba Iwu(Faculty of Law) na mahadum a si gbaa n'akaebe banyere ihe ha gabigara n'aka onyeisi ngalaba a a kwụsịrị ọrụ n'ike."

" Ụfọdụ ụmụnwaanyị ndị a alụọla di mana ihe ha gabigara ka na-enye ha ahụ ọmajijiji."

Ụfọdụ ndị gbara akaebe megide Ndịfon kọọrọ etu onye nkuzi ahụ si kpọọ ha oku bịa hụ ya n'ofisi ya, ha abịa, ọ gbachie ụzọ ya ma nwụọ ha n'ara , suso ha ọnụ n'ike , maọbụ buta odogwu ya si ha mịawa, ebe ọ gwara ụfọdụ ka hara idina ya maọbụ ịda n'ule.

Ụfọdụ ndị jụrụ, kwuru na nọrọ karịa ndị ogbo ha na mahadum ahụ, ebe ụfọdụ kwetara mere nke ọmwa n'ule.

Ụfọdụ ndị nkuzi nwaanyị nọ na ngalaba ya gbakwara aka ebe mkpagbu maka ịjụ idina nwa amadị ahụ, ebe ụfọdụ ogbo ndị nwoke kwuru na ha nwetara mkpesa banyere Ndifon n'aka ụmụakwụkwọ ha.

Akwụkwọ mpụtara nnyocha ahụ kwukwara na Ndifon ji ọkwa ya na-akapụ ndị mmandụ ego ma na-akapgbukwa ma ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi ọkwa ha dị nta na ngalaba Iwu na mahadum ahụ.

Ha gara n'ihu gbaa ama na ha kpọrọ Ndifon oku ugboro atọ dịka nnyocha ahụ na-aga n'ihu ịbịa zara ọnụ ya, mana anya ahụghị Onye nkuzi ahụ gwaburu ndị ntaakụkọ n'ozi o wepụtara ka akụkọ ya malitere iwu na aka ya dị ọcha..