Sexual harassment: Mahadum Unical akwụsịla Ndifon ọrụ n'ike maka ebubo mwakpo ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị

Ebe foto si, University of Calabar/Twitter
Mahadum University of Calabara' akwụsịla onyenkuzi ha bụ Ọkamuta Cyril Ndifon ọrụ n'ike maka ihe ha kpọrọ ' ịda iwu ' mahadum ahụ.
Nkwusi ọrụ n'ike so ngagharịiwe nke ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị na-agụ na ngalaba iwu na mahadum ahụ mere Na Monde bụ ebe ha nọọ boo ebubo na Ndifon na-edina ụfọdụ n'ime ha n'ike maọbụ manye ha ka ha dina ya iji mee ọfụma n'ule.
N'ozi nke ndị isi mahadum ahụ wepụtara n'akara Twitter ha ụbọchị Tọzde, ha kwuru na nkwụsị ọru ahụ bụ iji nye ohere ka kọmiti ha hiwere inyocha ebubo e boro ya mee nnyocha ha.
Ozi ahụ sịrị, " Ndịisi mahadum University of Calabar akwụsịla onyeisi ngalaba iwu Bụ Ọkammụta Cyril Ndifon ọrụ n'ike maka ebubo ịda iwu nke ụlọakwụkwọ."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ozi ahụ nke kwuru na e zigara Ndifon akwụkwọozi nkwụsị ọrụ, kwuru na e neyere ya iwu ka o nyefee osote ya ihe mahadum ahụ nile dị ya n'aka nyere ya iwu ka ọ ghara ịbata n'ogige mahadum ahụ belụsọ komiti na-enyocha okwu ahụ a kpọrọ ya oku.

Ebe foto si, Screengrab
Dịka a na-eche ka gọọmentị tinye n'ọrụ iwu megiere ndị nkuzi imetọ ụnmụakwụkwọ n'ụlọakwụkwọ dị elu, ụmụakwụkwọ na-agụ maka iwu Naijiria na mahadum 'University of Calabar' mere ngagharịiwe megide onyeisi ngalaba ha na mahadum bụ ọkammụta Cyril Ndifon.
Ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ndị a na-agụ egwu ji egosi iwe bucha akwụkwọ na-egosi iwe ha nke ụfọdụ ha na-ekwu sị: "Ike anyị ji amị amụ akwụla anyị": “We are tired of sucking dicks”; "ỌkammụtaNdifon, happụ ụmụaka ụmụnwaanyị nwere nnukwu ara ka ha kuru ume, ịbọ zila anyị ume" ; "Okwe e ji akwụkwọ aha ndị ga-aga 'Law School' apị ezuola".

Ebe foto si, Screengrab
Egwu ha na-agụ na-ekwu sị, " Ngalaba maka agụmagụ iwu abụghị ụlọ oriri na ngwọrị."
Mana n'ụbọchị Tuzde, Ọkammụta Ndifon gọrọ agụgọ na ebubo ndị e boro ya, sị na ọ bụ ndị obi adịghị mma na ya ji ọkwa onyeisi ngalaba iwu na mahadum ahụ chọrọ ịkpụ aha ya n'ala.
Ndifon gwara ụlọntaakụkọ' CrossRiverWatch' sị, “Mmadụ enwere ike inye ụmụagbọghọ nsogbu ka ha ghara ịpụta tiwe mkpu na-akpa ha akpa n'ụzọ ọjọọ?"
"Ya mere m ji asị na ebubo ahụ bụ ụgha. nke si ọkụ ala mmụọ. iji mebie ezi aha m m kwaliterela kemgbe ọtụtụ afọ."
Ndị isi mahadum 'University of Calabar' ekwuola na ha na-eme nnyocha maka ebubo ahụ.
Okwu so ya
Kemgbe ihe onyonyo ngagharịiwe megide Ndifon wuru na soshal midia, ụfọdụ ndị mmadụ gunyere ndị gụrụ na mahadum apụtala na-ebo ebubo na ha gabigara mmetọ n'aka ya.









