Sexual Violence: Etu anyị si chọpụta na ụmụokoroọbịa anọ na-edina nwa m nwaanyị dị afọ 15
Nna nwata nwaanyị a sị ndị okoroọbịa anọ dinara n'ike n'obodo Isiala Mbano Imo steeti akwọwaala etu ha siri chọpụta ihe ndị a mere nwa ya.
Nwoke kwuru na ha amaghị na ihe dị etu a na-eme nwa ha nwaanyị a dị afọ iri na ise (15years) ruo mgbe nwunye ya chọpụtara.
O kwuru na nwunye ya chọpụtara na nwa ha ahụ nwere ọnya mere ya n'ihe o ji bụrụ nwaanyị mgbe nwa ha na-ehi ụra.
Mgbe a jụrụ nwa ha ihe mere ya, o kpọrọ aha ụmụokoroọbịa anọ na-edina ya n'ike nke nyere ya mmerụ ahụ n'ihe o ji bụrụ nwanyị.

Ọ gara n'ihu kwuo na a kpọọrọ nwa ha gawa n'ụlọọgwụ maka inye ya ọgwụgwọ ebe ha kpọrọ ndị uweojii ka a nwụchie ndị ahụ.
O gara n'ihu kwuo na a kpọpụla ụmụokoroọbịa anọ ndị a n'ụlọikpe, na ha nọ n'ụlọmkpọrọ ugbua.
Mgbe a jụrụ ya etu ahụike nwaya nwaanyị dị, o kwuru na ahụike ya dị ọjọọ nke ukwuu maka na ihe ji bụrụ nwaayị na-ere ere ma na-esi isi.
Dịka ọ dị ugbua nwunye gọvanọ Imo Steeti bụ Chioma Uzodimma kwuru na ọ ga-akwụ ụgwọ ego niile a ga-emefu n'ịgwọ nwata a n'ụlọọgwụ.
Ụlọikpe 'magisterate' sị ka e tinye ndị a n'ụlọmkpọrọ

Ebe foto si, Imo State Police Command
Ụlọikpe 'magistrate' dị n'Owere, Imo steeti enyela iwu ka a tụnye ụmụnwoke anọ nn'ụlọmkpọrọ maka ebubo ịgakọ aka dina nwa nwaanyị gbara afọ 15 n'Amarakụ dị n'Owere, Imo steeti.
A kpụpụrụ ụmụnwoke anọ a ụlọikpe maka okwu ịmetọ nwaata ahụ anyị achọghị ịkpọ aha ya.
Akwụkwọ ebubo e boro ha na-ekwu na "n'agbata ọnwa Novemba afọ 2022 na Maachị afọ 2023 na ụmụokoroọbịa a kpara nkata ma wakpoo otu nwada a (anyị achọghị ịkpọ aha ya) gbara afọ 15, jiri ike, iyi egwu na mmaja nke megidere akụkọ 357 nke iwu megidere mpụ (Criminal Code), ma gwa ya ka ọ gwala onye ọbụla na o kwuo ụnụ ga-egbu ya."
Akwụkwọ ebubo ahụ kwukwara na ụmụnwoke ndị a mere tọ nwata ahụ n'ụdị na ya nyere ya nnukwu mmerụahụ n'ahụ nwaanyị ya.
Na mmalite, Ọkaikpe majie jụburu ilebanya n'ikpe ahụ n'ihi na ụlọikpe ahụ e nweghị ikike ikpe ikpe metụtara ụdị ebubo ahụ mana oge ọkaiwu wepụtara ikpe ahụ n'ulọikpe bụ BC Iwu kọwapụtara na nwata ahụ e metọrọ nọ n'ọrịa nwere ike iwere ndụ, rịọrọ ọkaikpe ka o lee anya n'ụdị mpụ ụmụnwoke ahụ mere, ma sị na a hapụ ha si n'ụlọ ha bịawa ya bụ ikpe na ha ga-agba ọsọ.
Na mkpebi ya , ọkaikpe Majie jụrụ inye ha ohere isi ụlọ abịa ikpe ahụ(bail) ma nyekwa ntuziaka ka a tụnye ha na mkpọrọ 'Owere Correctional Ceentr' rue abalị 17 nke ọnwa Ọgọstụ , afọ 2023.
Ọ gara n'ihu nye iwu ka enyefee ikpe ahụ n'aka dịretọ na-ahụ maka iwepụ ikpe n'ụlọikpe na mịnịstrị ikpe nke steeti ahụ.

Ebe foto si, Alamy
Etu akụkọ ndina n'ike si arị elu na Naịjirịa
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Mpụtara nnyocha ụlọọrụ NOIPolls mere n’ọnwa Jụlaị 2019 rụrụ aka na otu nwata nwaanyị n’ime atọ ndị bi na Naịjirịa abụrụla ndị opekatampa otu onye akpaala ha aka n’otu ụzọ na-ezighi ezi tupu ha e ruo afọ 25.
Ọ bụghị ihe a ọ hụrụ ma ndị mmadụ emeghị mkpesa maka mmadụ idina ha n’ike na Naịjirịa.
Nke a bụ n’ihu ụfọdụ na-atụ egwu na ọha ga-amalite na-akpasa ha oke maka ihe mere ha maọbụ na-atụ egwu na ndị uweojii ka anara ha ego ma ha gaa mee mkpesa maọbụkwanụ na ikpe gbasara mkpesa ha ga-anọ ogologo oge n’ụlọikpe.
N’ọnwa Jụlaị, ndị uweojii Legọs steeti kwuru na ọnụọgụgụ mkpesa banyere mmetọ ụmụaka ha eruola 100 nọnwa atọ. Ọtụtụ steeti na Naịjirịa na-ahụtakwa iri elu mkpesa ndị dị etu a nakwa mkpesa ndịna n’ike nyere ya bụ ihe ndị mmadụ na-ekwusị dịka mmụba ya dịzika “mfesa ọrịa”.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin gwara ndị ntaakụkọ na ọnọdụ a na-eche ndị ọchịchị steeti ahụ ezigbo echiche.
O kwuru: “Anyị na-enyocha okwu mmadụ 83 ugbua iji gosi na ndị uweojii na-agbasi mbụ ike ịbelata mkpagbu ụmụnwaanyị na mwakpo ndị mmadụ maka okike ha na Legọs steeto ”
Na Naịjirịa, ngalaba 'Ministry of Women Affairs', nakwa ụlọọrụ 'National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons' (Naptip) so na ngalaba gọọmentị ebe ụmụnwaanyị a wakporo n'ike, maọbụ ndị a na-emekpa ahụ nwereike inweta enyemaka.
Enweela ọtụtụ akụkọ banyere ndina n’ike ndị tụrụla ọha n’anya na Naịjirịa n'oge gara aga.
Dịka akụkọ banyere nwata akụkwụkọ a kpọrọ Uwavera Omozuwa nke a sị na ndị mmadụ dinara n’ike ma dinagbuo ya n’ime ụlọụka na Benin, Edo steeti ma were udu e ji emenyụ ọkụ ọgbụgba kụwaa ya isi. Ihe a mere n'afọ 2020 ma kpata ọtụtụ ngagharịiwe nakwa okwu na soshal midia.










