Ihe mere akụkọ mwakpo ụmụnwaanyị jiri bụrụzie ‘atụrụ tawa’ na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Makuochi Okafor
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
- Ebeg o si, Lagos, Nigeria
N'akụkụ ụwa niile, taa bụ ụbọchị 25 nke ọnwa Nọvemba bụ ụbọchị a na-agbasa ozi ma mee emume iji rụtụ aka na mmegide nakwa mwakpo ụmụnwaanyị.
N’ọdịnso a, ọ na-adịzị ka kwa izu akụkọ ntigbu nakwa mmekpa ahụ dị icheiche megide ụmụnwaanyị bụzị ihe dịka atụrụ taba na ntị ndị mmadụ na Naịjirịa.
Nke a emeela ka ọtụtụ na-ajụ “Kedụzị ihe na-eme? Kedụ ebe mmiri si banye n'ọpị ụgbọgụrụ?”
Kwa mgbe kwa mgbe, ọtụtụ ndị ntorobịa ọkachasị ndị na-alụ ọgụ ikike dịịrị ụmụnwaanyị na-eji soshal midia agbasa ozi maka etu mmegide ụmụnwaanyị si arị elu na Naịjịrịa, mana n'agbanyeghị mbọ niile a na-agba iji kwụsị ya, ọ na-adị mmiri a na-awụ n’elu okwute.
N’afọ 2020, Ndị mmadụ gosiri iwe ha ebe niile na Naịjirịa n'ihi ogbugbu e gburu otu nwa akwụkwọ mahadum Benin n'Edo steeti, n'otu ụlọụka ebe ọ gara ịgụ akwụkwọ.
Ezinụlọ Uwavera Omozuwa, onye e ji Uwa mara, kwuru na ndị mere ihe a dịnara ya n'ike n’ụzọ ọjọọ tupu ha egbuo ya.
N’otu afọ ahụ, otu onye uweojii gbagburu otu nwata nwaanyị dị naanị afọ 16. Nke a so kwanye ọkụ n’okwu ụmụnwaanyị ịnọ n’ihu ngagharịiwe End Sars iji katọọ mmekpa ahụ n'aka ndị uweojii.

Na mbido afọ a, otu onye otiegwu ụka a ma ama bụ Osinachi Nwachukwu nwụrụ dịka ezinaụlọ ya boro ebubo na ọ bụ dị ya tigburu ya.
Ndị uweojii nwụchịrị nwoke a ma kpụpụ ya ụlọikpe dịka ha mechara nnyocha ha, n'agbanyeghị na o kwuru na aka ya dị ọcha.
Akụkọ ọnwụ Osinachi gbawara ọtụtụ mmadụ obi na soshal midia n'ihi na ọ bụ onye ndị mmadụ hụrụ egwu ya n'anya nke ukwuu.
Ọ gịnị kpatara mmekpa ahụ ụmụnwaanyị ji arị elu?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Usoro ikpe na Naịjirịa
Na Naijiria, ọ bụghị ihe ọhụrụ na ndị mmadụ anaghị achọ iwega mkpesa n’aka ndị uweojii, ọ kachasị n'okwu gbasara mmekpa ahụ maọbụ mwakpo ụmụnwaanyị.
Ihe na-akpata nke a gụnyere ịtụ egwu mkparị maọbụ ịkpa oke; ego ndị uweojii ga-achọ ịnapụ ha; enweghị ntụkwasị obi n'usoro ikpe; nakwa etu usoro ikpe si sie ike na Naịjirịa.
Otu ọkaiwu na-ahụ maka okwu gbasara ụmụnwaanyị bụ Ivereniter Tserga gwara BBC Igbo sị: “Usoro ikpe Naịjirịa na-ete ezigbo aka, nke na-eme ka ike gwụ ndị mmadụ n’okwu ikpesara ndị uweojii maọbụ gọọmentị ma edịnaa ha n’ike maọbụ wakpoo ha.”
Ọ gara n’ihu kwuo na “ndị mmadụ enweghịzị ntụkwasị obi n’usoro ikpe Naịjirịa nke a mere na ndị na-awakpo maọbụ na-emekpa ụmụnwaanyị ahụ anaghị atụ ụjọ n’ihi ha ma na okwu ha pụọ ụlọikpe, o nwereike ọ gaghị achịta aja.”
Otu onye aha ya bụ Wanda kọọrọ BBC Igbo etu onye na-eleta ya anya mgbe ọ dị naanị afọ isii si metọọ ya.
O kwuru sị “Ntaramahụhụ maka ndịna mmadụ n'ike na Naijiria dịka akwụkwọ iwu Naịjirịa siri kwuo bụ mkpọrọ afọ iri na anọ, mana ahụla m ebe onye ọkaikpe mara mmadụ ikpe ịnọ naanị afọ anọ na mkpọrọ.”
“Kedụzị maka ndụ nakwa ọdịnihu nwaada a wakporo ma mebie echiche ya ruo ebighi ebi?”
Ụjọ ịta ụta, ịkpa oke nakwa mkpagbu nye ndị awakporo
Otu nwaanyị bụ onye gabigara ndịna n’ike n’oge gara aga, kọwara na ọtụtụ mgbe ndị mmadụ na-ata ndị e dịnara n’ike ụta maka ihe mere ha.
“Ọtụtụ oge, ndị mmadụ na-ekwujọ ụmụnwaanyị e dịnara n'ike, ma na-ata ha ụta maka uwe ha yi, maọbụ ịnọ n'ebe na-ekwesịghị ekwesị n'oge dị aṅa," nwaanyị a na-achị ka akpọpụta aha ya kwuru.
"Mgbe ụfọdụkwa ndị mmadụ na-agbọchị ha ọnụ na-ekwu na ha na-ebo ebubo ụgha maọbụ na ha na-achọ itetọ aha mmadụ n’efu.”
Omume ndị nọ n’ọchịchị

Enweela ọtụtụ oge ndị nọ n’ọchịchị maọbụ ndị ọru gọọmentị gosiri agwa ọjọọ nke mwakpo, iti ụmụnwaanyị ihe maọbụ gwa ha okwu n’ụzọ gosiri nkwado mwakpo.
Na 2019, onyonyoo gosiri ebe otu onye omeiwu Naịjirịa aha ya bụ Ishaku Elisha Abbo, tikasịrị otu nwaada ahụ n’ụlọahịa ya bụ nwaada.
Ọtụtụ chere na ọ ga-anata ntaramahụhụ maọbụ nkwụsị n’ọrụ n'ihi ihe ahụ o mere, mana nke a emeghị.
Kama Elisha Abbo natara ihe nrite dịka onye omeiwu bụ ọkaibe n'aka otu kpọrọ onwe ha ‘inter-community awareness for change and development initiative’.
Ọzọ dịka ibe ya, n’afọ 2016, Dino Melaye, bụkwa onye ụlọ omeiwu Naịjirịa gwara ogbo ya bụ Oluremi Tinubu n’ihu ọha “M ga-eti gị ihe, tụba gị ime, ọ nweghịkwa ihe ga-eme.”
Okwu a tụrụ ọtụtụ n’anya, dịka ha kwuru na Melaye ji ndịna n’ike amaja nwaanyị ahụ, mana Melaye bụ anataghị ntaramahụhụ ọbụla n’ihi nke a.
N'afọ 2019, ụfọdụ ụmụnwaanyị boro ebubo na ndị uweojii nwụchiri ha ma dinaa ha n'ike.
Ha kwuru na ndị uweojii boro ha ebubo na ha bụ ndị akwụna ma dịnaa ha n’ike ugboro ugboro.
Dorothy Njemanze bụ ọkaiwu na-ekwuru ụmụnwaanyị ndị a kwuru sị: “Omume dị etu a anaghị eme ka obi sie ndị mmadụ ike maọbụ ka ha nwee ntụkwasịobi na ha ga-enweta enyemaka n'aka ndị uweojii maọbụ ndị ọrụ nchekwa .”
Ndị uweojii gọnarịrị n’ebubo ndị a dịka ya bụ okwu ka nọ n’ụlọikpe ruo taa.
Iwu Naịjirịa banyere imekpa ụmụnwaanyị ahụ

Ebe foto si, Reuters
Nkem Awachie-Agu, bụ onye ọkaiwu, kwuru na Naịjirịa ebinyela aka na ọtụtụ iwu ọhụrụ ndị na-enye ntaramahụhụ maka mwakpo ụmụnwaanyị maọbụ mee ka ọdịwanye mfe ibelata omume a.
Mana o kwukwara na “Ọtụtụ steeti na Naịjirịa etinyebeghi iwu ndị a n'ọrụ na steeti nke ha.”
Okpukerechi/omenala
Ọkaiwu Awachie gara n’ihu kwuo sị: “Omenala na okpukperechi ọtụtụ na Naịjirịa na-akwado mkpagbu ụmụwaanyị.
"Ihe ndị a na-ebute nleghara anya n’agwa ọjọọ nke ụmụnwoke na-akpasa ụmụnwaanyị ma na-eme ka ahapụ inye ha ntaramahụhụ kwesiiri ha.”
“Ọtụtụ ụmụnwoke ndị a ma na ọ bụ naanị na Naịjirịa ka ha ga-enweike kpaa ụdịrị agwaa nke bụ na ha gaa mba ofesi ha amalite ikwanyere onwe ha nakwa ụmụnwaanyị ugwu.”
Onye ọkaiwu ọzọ bụ Okani Emmanuel kọwara na ọbụghị naanị omenala na-akpata ihe dị otu, okpukperechi sokwa ebute ya.
“Na mpaghara Ugwu Naịjirịa, ọ bụ okpukperechi na-akwalite ụdị mkpagbu a, mana na Ndịda ọ bụ omenala na-akpata ya."
"Iji maa atụ, ụfọdụ omenala a na-emeso ụmụnwaanyị di ha nwụrụ jọrọ nnukwu njọ ma bụrụkwa nnukwu ihe mmekpa ahụ.”
Ọkaiwu Ivereniter Tserga kọwara na ihe nwereike ịkwụsị ihe a na-arị elu na Naịjirịa bụ ịhụ na ahazigharịrị usoro ikpe nkwụmọtọ.
O kwuru na ikewapụta ụlọikpe pụrụiche maka okwu mwakpo na mmekpa ahụ ụmụnwaanyị, ma tinyekwa oge e kwesịrị iji kpebie ikpe ha, ge-enye aka ka mee ka ikpe dị otu a gaa ngwa ngwa, ma wulitekwa ntụkwasị obi ndị mmadụ iweta mkpesa n'ụlọikpe.
Na Naịjirịa, ngalaba 'Ministry of Women Affairs', nakwa ụlọọrụ'National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons' (Naptip) so na ngalaba gọọmentị ebe ụmụnwaanyị a wakporo n'ike, maọbụ ndị a na-emekpa ahụ nwereike inweta enyemaka.








