Ụlọikpe mkpegharị atọghapụla Femi Olaleye n'ikpe ọmụma ịdina nwatakịrị n'ike

Ụlọikpe mkpegharị agbanweela ikpe maburu otu Dọkịta Olufemi Olaleye bụ nke a tụburu nga mkpụrụọka maka ịdina nwata n'ike ma kwuo ka atọghapụ ya.
Ọkaikpe Olukayode Bada bụ ọnụ na-ekwuru ndị ọkaikpe ndị ọzọ kwuru na ụlọikpe obere mehiere si na mkpebi ha maka na ihe akaebe ha tulere ezughi oke iji mee ka ikpe maa dọkịta ahụ.
Ọkaikpe ọzọ bụ Rahman Oshodi bụ onye tụrụ Olaleye nga n'ọnwa Ọktoba afọ 2023 nabatara na ọ dinara nwa nwanne nwunye ya mgbe ọ ka bụ nwata nkịtị mere o ji tụọ ya nga.
Ụlọikpe ahụ mgbe ha na-agụpụta ikpe kwuru na dọkịta ahụ bụ onyeisi Optimal cancer care foundation dị na Legos kwuru na o gosighi mwụte mgbe niile e ji kpe ikpe ahụ.
A tụọla dọkịta nga mkpụrụọka maka imetọ nwanne nwunye dị afọ 15

Ebe foto si, Dr. Olayeye
Ụlọikpe na Legọs amaala dọkịnta Olufemi Olaleye ikpe ma tụọ ya nga mkpụrụọka maka imetọ nwata nwaanyị nwanne nwunye ya dị afọ 15.
Ngalaba na-ahụ maka ikpe na Legọs steeti kpụpụrụ Dkta Femi Olaleye ụlọikpe pụrụiche e hiwere maka ịkpaarụ metụtara mwakpo n'ike na idina nwata nwaanyị ahụ.
A kpụpụtara ya n'ụlọikpe n'abalị 30 ọnwa Nọvemba afọ 2022 ebe o kwuru na aka ya dị ọcha mana ọkaikpe Rahman Oshodi kpebiri na aka ya adịghị ọha.
Ọkaikpe Rahman kwuru na ndị kpọpụtara ya ụlọikpe gosiri ihe akaebe zuru oke igosi na dọkịnta ahụ kpara arụ ahụ n'ezie.
Etu ikpe dọkịta a siri malite

Ebe foto si, Femi Olaleye/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ikpe a na-ekpe otu Dọkịta maka ebubo imetọ nwata ya agaghị n'ihu taa bụ Monde dịka ahụghị dọkịta ahụ n'ụlọikpe dị n'Ikeja, Legọs.
Ngalaba na-ahụ maka ikpe na Legọs steeti kpụpụrụ Dkta Femi Olaleye ụlọikpe pụrụ iche e hiwere maka mpụ metụtara mwakpo n'ike n'ihi ebubo na o metọrọ nwata gbara afọ 16 ihe ruru otu afọ.
Oge a kpọpụtara ya bu okwu n'ụlọikpe dị n'Ikeja ụbọchị Mọnde, ọkaiwu na-anọchite nwaamadi ahụ bụ Babatunde Ogala kwuru na onye ya na-anọchite anọghị ya, na ọ gara ihe.
Nke a bụ dịka ndị uweojii nyeburu ya ikike i si n'ụlọ abịa n'okwu ahụ.
O kwukwara na e nyebeghị dọkịta ahụ akwụkwọ akpọmoku n'ụlọikpe.
Mana ọkaiwu nke Gọọmentị steeti bụ Olugbenga Alagbe gwara Ụlọikpe na ha zigaara dọkịta ahụ nakwa onye uweojii okwu ahụ dị n'aka akwụkwọ akpomoku n'abalị 18 nke ọnwa Novemba iji nye ndị niile o metụtara ozi.
Ọ rịọrọ ụlọikpe ka o nye akwụkwọ ikike ka a nwụchie nwaamadi ahụ. Mana ọkaiwu na-anọchite dọkịta ahụ jụrụ nke a ma si na ọ bụ onye gbara ọsọ ka a na-enye akwụkwọ ikike ka a nwụchie kpụta ụlọikpe.
O kwuru na Dọkịta ahụ agbaghị ọsọ, na ọ bụ ebe dị mkpa ka ọ gara na, ọ ga-eji aka ya bịa ụlọikpe.
O kwuru na ndị wepụrụ ikpe ahụ n'ụlọikpe zitere akwụkwọ mana akwụkwọ ozi ahụ ekwughị ebubo e ji maka ya kpụrụ ya ụlọkpe.
“Ọ bụ nkwanyere ugwu mere anyị ji bịa ụlọikpe ịnọchite anyị ma na-ekpe ikpe a, e nyebeghị ya akwụkwọ ọbụla."
Ọ rịọrọ ụlọikpe ka e higharịa ikpe ahụ ụbọchị ọzọ ma kwe nkwa na dọkịnta ahụ ga-abịa ụbọchị ọzọ e nwere ikpe ahụ.
Ọkaikpe nọ n'isi ikpe ahụ bụ Ramon Oshodi higharịrị ikpe ahụ gaa abalị 30 nke ọnwa Novemba ,2022.
Ebe okwu si malite
Cheta na n'ọnwa abụọ gara aga, ngalaba Legọs steeti na-ahụ maka nsogbu mkpagbu n'ezinaụlọ na mmetọ a kpọrọ "Lagos State Domestic and Sexual Violence Agency (DSVA) gbara ama na ha nwetara mkpesa metụtara imetọ nwata megide Dr Femi Ọlaleye n'abalị 19 nke ọnwa Maachị afọ 2019.
Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Titilola Vivour-Adeniyi, gbara ama na-enyela nwata ahụ nleta n'ụlọọgwụ, ebe nleta nke uche na-aga n'ihu.
Akụkọ banyere Dkta Olaleye wuru na soshal midia na Novemba afọ 2021, dịka nwunye ya bụ dọkịta bụ Remi Olaleye kpesara ndị uweojii na di ya na-edina nwa ha na ya bi.
O boro ebubo na di ya tinyere nwata ahụ n' ile onyonyo ndị gba ọtọ.












