Ọgba mbọ: Ehi Igbo anaghị atapịasị ubi ndị mmadụ - Madiwe Okolie
Ọgba mbọ: Ehi Igbo anaghị atapịasị ubi ndị mmadụ - Madiwe Okolie
- Onye dere ya, Chigozie Ohaka
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
- Onye dere ya, Vining Ogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
"Ogbuefi" bụ aha echichi ndị Igbo na-echi ebe ọ bụ kwa ahanna ụfọdụ ndị. Mana ọtụtụ amaghị na ndị Igbo nwere ehi nke ha.
Mazi Madiwe Okolie bụ onye Idumeze nke dị n'Obolukwu, Delta Steeti na-azụ ehi Igbo.

Ọ kọwara sị, "Ehi Igbo anaghị abanye n'ubi ndị mmadụ emebi ihe ha kọrọ. Ọ na-akpaghari n'obodo eri akwụkwọ nri".
Okolie kwuru na ehi Igbo na-eri ihe dịka azụ akpụ ebechara ebecha, maọbụ ahịhịa e gbutere.
Ọ kwuru sị, " Ehi Igbo dị oke ọnụ karịa ehi awụsa, mana ọ na-amasị ndị mmadụ n'ihi na ọ na-atọ ụtọ karịa ehi awụsa ma ọ naghị esi ike n'eze".
Okolie kọwara etu o siri bido ịzụ ehi Igbo ma ihe gọọmenti ga-eme iji nyere ndị na-azụ ya aka.
Kirie ihe onyonyo nọ n'elu akụkọ ka ị nụrụ ihe o kwuru n'uju.



