E bitere m kemịkal m ji mepụta 'paint' mbụ m rụpụtara- Somadina Anoh

Somadina Anoh bụ onyeisi ụlọọrụ na-emepụta uli 'paint' gwara BBC Igbo ka irupụta uli 'paint' si gbanwe ndụ ya.
N'afọ 2018. ka Anoh kwuru na ọ gakwuru nna ya ma gwa ya ka o nye ya ego. Nna ya gwara ya na ọ ga-enye ya ego o ji eme azụmahịa ime njem , mana ọ ga-amasị ya ma ọ bụrụ na ya bụ Somadina mewere ihe nrụpụta.
O kwukwara na nna ya nyere ala ebe ọ na-anọ arụpụta 'paint.' Anoh kwuru na ọ dịghị mfe mgbe o bidoro rụpụtawa 'paint' makana ụfọdụ leliri ya ma jụ inye ya ọrụ.
Mana ugbua ndụ ya agbanweela makana o gbahapụghị nrụpụta 'paint' agbanyeghị ọgbata uhie niile ọ gabigara.
'Ndụmọdụ nna m nyere m'
Anoh kwuru na mgbe mbụ o malitere rụpụtawa 'paint' , na ọ maghị na ọ ga-eru ogo orurula ugbua. N'ọnụ ya, 'o nwere mgbe m nọgidere ike ịrụpụta paint gwụ m, mana nnam gwara m na ọ bụrụ na onwebeghị ihe m fụru, ma lekwa anya na ihe ndị fụrụlanụ kama ka m gbado anya na-arụpụta ihe m na-arụ.
O kwuru na mgbe o malitechara, na ọ na-eji aka ya atụgharị ya bụ 'paint' ruo mgbe ọ maliere izụta igwe e ji agwakọ ya bụ 'paint'.
N'ọnụ ya, 'paint' na-anọcha otu afọ maọbụ abụọ maọbụrụ na idoziri ya ọfụma bụ ihe Anoh kwuru.
"Ọtụtụ mmadụ na-ajụ m ihe mere m ji hapụ obodo ma bawa n'ime obodo, mana udiri mmadụ na-eju ebe a ma ha chọọ ịzụta 'paint' mere ka m ghọta na onweghị ebe ọbụla mmadụ nọ ihe agaghị agara ya." bụ ihe Anoh kwuru.
Gere ihe o kwuru n'uju n'onyonyo a dị n'akụkọ a.





