Agaghị m ahapụnwu ọrụ 'welder' banye ọrụ ọzọ - Nwaanyị na-akpụ igwe
Agaghị m ahapụnwu ọrụ 'welder' banye ọrụ ọzọ - Nwaanyị na-akpụ igwe
Ụmụnwaanyị na-akpụ igwe n'ụwa niile bụ naanị pasentị anọ dịka ndị Welda Guru siri dee.
Amara Onwuka so n'ime ụmụnwaanyị pasentị anọ ndị a, dịka ọ tọgbọrọ asambodo o nwere n'agụmagụ 'Philosophy' wee gaa nweta asambodo n'ịkpụ igwe.
Ọ gwara BBC Igbo na ya agaghị ahapụ ọrụ ịkpụ igwe mee ihe ọbụla ọzọ maka na ọ baala ya n'ụmị.
Ọ na-akpụ ụdị igwe dị icheiche e ji arụ ụlọ nakwa nke e ji enyere ndụ aka. Mana kedụkwanụ etu o si ebu igwe ọ kpụrụ?
Kirie mkparịtụka anyị na ya ugbua ka ị chọpụta.




