Ọgba Mbọ: Etu m si malite ime Ajụ Mbaise dịka ihe ọṅụṅụ bekee
Ajụ Mbaise bụ mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ ndị Igbo ji enyere ụmụnwaanyị mụrụ nwa aka ịsachapụ ọbara ọjọo n'ime afọ mgbe ha mụchara nwa.
Ya bụ Ajụ Mbaise na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ dị icheiche iji wulite ahụike mmadụ.
Nwaada Mmesoma Chukwudi chọpụtara ụzọ ọgbara ọhụrụ iji kechie ya bụ Ajụ Mbaise ka ndị ntorobịa ugbua ka nwee mmasị ịṅụ ya.
Mmesoma na-etinye ajụ mbaise ahụ n'obere akpa nke a na-akpọ 'tea bags' na bekee.
Nke a bụ ụzọ nwa ada a ji agbara onwe ya mbọ, ma na-akpata ihe afọ ya na-eri.
Gịnị bụ ajụ mbaise?

Ebe foto si, Facebook/Chukwudi Somack Mmesoma
Ajụ Mbaise bụ ọgwụ mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ si Mbaise n'Imo steeti, Naịjirịa.
Ọ bụ ọgwụ a na-enyekarị ụmụ nwaanyị nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ iji nyere ha aka sachapụ ọbara ọjọọ n'afọ ha.
Ọtụtụ kwukwara na ọ na-enyere ndị buru oke ibu aka ka ha talata ahụ.
Ụfọdụ ndị ọzọ sị na ọ na-agwọ ọrịa shuga nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ.
Kedu ihe nnyocha Sayensị chere maka ya?
Dokịta Uche Okeke, na-arụ ọrụ na ụlọọgwụ 'General Hospital', n'Amawbia, Anambra steeti, kwuru na ọ bụ eziokwu na ọgwụ mgborogwụ na-arụ ọrụ, mana ọ dị mkpa ka e mekwuo nnyocha gbasara ha.
"Nnyocha ga-egosi ugboro ole, nakwa mkpụrụ ole mmadụ ga-aṅụ ọgwụ ahụ iji gbochie ịṅụfe ya oke."
"Ọtụtụ ndị dibia mgbọrọgwụ na-ekwu na otu ọgwụ na-agwọ ọrịa dị icheiche, mana ụfọdụ oge, ọ naghị adị etu ahụ."
N'agbanyeghị ihe sayensị chere maka ọgwụ Igbo, ọtụtụ ndị Igbo, ma ndị gụrụ akwụkwọ nke ọma, kwenyere na ha na-arụ ọrụ nke ọma.
Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi, Chukwudi Okereke, na Nnamdi Agbanelo.




