Ọgba mbọ: 'E si m n'ighe akara bụrụ 'Councilor' okpuruọchịchị Nnewi North' - Ugochinyere Eze
Agbanyeghị na Ugochinyere Eze, bụ nwaanyị na-eghe akara, abụrụla 'Councilor' n'okpuruọchịchị Nnewi North dị n'Anambra, ọ ka na-eghe akara ya.
Ndị agbataobi ya na-etu ya "Honourable na-eghe akara" maka na Ugbochinyere na-apụta n'elekere isii nke ụtụtụ ghechaa ma ree akara ya tupu ọ gawa ịrụ ọrụ 'councilor' ya n'okpuruọchịchị Nnewi North n'elekere itoolu nke ụtụtụ kwa.
Ugochinyere kọọrọ anyị etu ọkwa councilor si ruo ya aka n'ụzọ dị iriba ama. Gere ya n'uju n'ihe nkiri a.




