Ọgba mbọ: Onye ọkaiwu na-ere ọkpa
Loveth Ifunanya Chinyere bụ ọkaiwu na-eme ọfụma ọrụ kọwara ihe mere o ji hapụ ọrụ ya bido ire ọkpa.
Ọ gwara BBC Igbo na ọ bụ mgbe onye dọkịta chọpụtara otu ọrịa n'ahụ nwa ya nwoke mere o ji kwụsị ọrụ iji nwee ohere ileta nwa ya anya.
Loveth sị na kama ọ ga-anọ na nkịtị na o bidoro na-esi nakwa na-ere ọkpa n'ụzọ pụrụiche nke mere ka amara ọkpa ya na Legọs.
Akụkọ ihe ndị ọzọ ọ gabigara dị n'ihe onyonyo a. Ọ ga-akpalite mmụọ gị ma mekwa ka ọkpa ya gụwa gị agụ.
Onye mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbahuru
Akụkọ ndị ga-amasị gị