Ọgba mbọ: Onye ọkaiwu na-ere ọkpa

Aha onyonyo, Ọgba mbọ: Ihe mere m ji hapụ ọrụ ọkaiwu mewe ma rewe ọkpa

Loveth Ifunanya Chinyere bụ ọkaiwu na-eme ọfụma ọrụ kọwara ihe mere o ji hapụ ọrụ ya bido ire ọkpa.

Ọ gwara BBC Igbo na ọ bụ mgbe onye dọkịta chọpụtara otu ọrịa n'ahụ nwa ya nwoke mere o ji kwụsị ọrụ iji nwee ohere ileta nwa ya anya.

Loveth sị na kama ọ ga-anọ na nkịtị na o bidoro na-esi nakwa na-ere ọkpa n'ụzọ pụrụiche nke mere ka amara ọkpa ya na Legọs.

Akụkọ ihe ndị ọzọ ọ gabigara dị n'ihe onyonyo a. Ọ ga-akpalite mmụọ gị ma mekwa ka ọkpa ya gụwa gị agụ.

Onye mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbahuru

Akụkọ ndị ga-amasị gị