Ọgba mbọ: Etu m si bido ịgba mbọ - Innoson
Innocent Chukwuma e ji Innoson mara, nwafọ Igbo bụ aka na-arụpụta ụgbọala nke mbụ na Naịjirịa kọwara etu o si malite njem ịgba mbọ ya.
Ọ gwara BBC Igbo na ọ malitere njem a dịka ndị ọzọ si amalite nke ha.
Ọ sị na azụmaahịa mbụ o jiri bido bụ akụrụngwa ọgbatumtum, si na ya banye na nke ụgbọala nakwa tupu ọ banye n'imepụta plastik n'usoro ahụ.
Chukwuma sị na ọ bụ ụlọọrụ plastik ya kachasị ukwuu na mba Afrịka niile.
N'afọ 2007, o mepere ụlọọrụ a na-arụpụta ụgbọala a kpọrọ 'Innoson Motors'.
Ụlọọrụ a na-arụpụta ụgbọala dị iche iche gụnyere nke ndịagha, ndị ọrụ nchekwa, nke e ji eme njem, nke e ji ekpofu ahịhịa dgz.
Kirie ihe o kwuru n'uju:
Ndị mere akụkọ a bụ ChiemelaMgbeahuru na Jessica Nwankwo