Dan Anyiam: Gịnị ka ị ma maka dimkpa Igbo a?

- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Gịnị ka ị ma maka Daniel Amobi Amadi Anyiam?
Ọ bụrụ na ị na-ele egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa, e nwereike ị nụtụla mgbe a gbara bọọlụ n'ọgbọegwuregwu a kpọrọ "Dan Anyiam Stadium".
Mana ị ma onye nwoke a bụ?
Ngwa gbado anya n'akụkọ a ka ị chọpụta.
Ihe ị kwesịrị ịma maka Dan Anyiam
- A mụrụ ya ụbọchị 26 nke ọnwa Nọvemba, 1926.
- Ọ gụrụ akwụkwọ ebe a na-azụ ndị nkuzi nke a kpọrọ 'Teacher's College'
- Ọ gbaara Naịjirịa bọọlụ ma bụrụkwa onye ndu nke otu egwuregwu Naịjirịa na-enweta, n'afọ 1949.
- O mechara bụrụ onye nchịkọta 'coach' otu egwuregwu Naịjirịa site n'afọ 1954 ruo 1956 ma chịkwaa ọzọ site n'afọ 1964 ruo 1965.
- Ọ bụ ya bụ onye Naịjirịa mbụ chịkọtara otu egwuregwu bọolụ Naịjirịa ka Jack Finch bụ onye mba Ịngland chịchara.
- Anyiam bụ onye mbụ chịkọtara otu Rangers dị n'Enugwu steeti.
- A gụrụ ọgbọegwuregwu dị n'Owere, Imo steeti, aha ya.
- Ọ nwụrụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Julaị 1977, ka ọ dị naanị afọ 51.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:






