Zack Orji: Anaghị m ebi ndụ na soshal midia

Ebe foto si, Instagram/RealZackOrji
Zack Orji bụ onye ejije Nollywood a ma ama bụ onye ọtụtụ kpụ n'ọnụ ugbua na soshal midia. Orji ekwuola na ya anaghị ebi ndụ nke ya na soshal midia.
O kwuru na soshal midia na-anapụ ndị mmadụ oge ha kwesịrị iji mee ihe dị mkpa. Orji kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n’afọ 2020 oge ọrịa Covid-19 ji ọgbọ na Naijiria nke mere ka gọọmentị tinye mmachi ngagharị ndị mmadụ.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Orji bụ e chiri ụkọchukwu n’ụka ‘Powerline Bible Church’ kwuru na ọrụ ịgbasa oziọma Kraịsti ebugala mba dị iche iche na Naijiria, n'Alabekee nakwa ụfọdụ mba n'Afrịka.
N'okwu etu o siri malitere ọrụ ime ejije, o kwuru na ọ bụ ọrụ igo ihe ubi ma na-ebupụ ya ka o nwetara ohere isonye n’ejije.
Kirie ya n'uju.

Ebe foto si, Instagram/RealZackOrji
I kwesịrị ịma maka Zack Orji
- Ọ bụ onye na-eme ma na-ahazi ejije Nollywood a ma ama
- Zackee Ama Orji, bụ nwa afọ Igbo mana a mụrụ ya na mba Gabon
- Ọ gara mahadum 'University of Nigeria Nsukka'.
- Ejije mere ka ọ chakee bụ "Glamour Girls", na "Blood Money" mana o sonyela n'ọtụtụ ihe nkiri ndị ọzọ.
- Ọ bụ onye ụkọchukwu ugbua mana o nweghị ụka nke aka ya.


