Bob Manuel Udokwu: Lọghachịte n'ụzọ omenala
Nwaamadị Igbo a ma ama, bụ Bob Manuel Udokwu onye na-eme ejije Nollywood gwara BBC Igbo mkpa ọ dị ka ndị Igbo ghaghachie n’usoro omenala ha dịka ha si eme n’oge gara aga.
Ọ kọwara etu okpukperechi ndị mba ofesi si megharịe ọtụtụ ụmụ Igbo anya n’oge gara aga na kọwa etu okpukperechi ndị ala dị ịcheịche si diri ha mkpa karịa.
Ka o si kwuo, ndị ala Bekee na-agbazi mbọ ugbua itinye anya n’okpukperechi ndị Igbo dịka ha gbakọtara ya bụ okpukperechi azụ.
O kwuru sị: "Onye kpọọ ọba ya mkpọkọrọ, agbataobi ya e were ya kpofuo ahịhịa."
"Ndị ọcha bịara be anyị buru arụsị anyị, buru Arọbinagụ dị na be anyị buru ya laa be ha, mana ugbua, o nyewela ha nsogbu, ha na-ebughachitezi ya azụ."
Bob Manuel kọwara na ya anaghị akatọ okpukperechi Kraịst, kama ya na-ekwu ka ndị Igbo ghara ịgbahapụ nke anyị.
Onye bụ Bob Manuel Udokwu?
Bob Manuel Udokwu bụ onye na-eme ejije na-emepụtekwa ejije na Nollywood.
Nwa amadị a dị afọ iri ise na anọ bụ onye Ogidi n'Anambra steeti, mana a mụrụ ya n'Enugwu steeti.
O nwetara nzere 'Bacherlors Degree' na 'Theartre Arts' na Mahadum Port Harcourt, Rivers State.
N'agbanyeghị na Bob Manuel gụrụ akwụkwọ nke ọma, ọ bụ onye ọdịnala na omenala Igbo na-amasị.
O kwenyere na ọ dịghị mma ka ndị Afrịka gbahapụ omenala nna nna ha kpamkpam, gbasowe nke ndị ọcha.
Ndị mere akụkọ a:Chukwudi Okereke na Nnamdi Agbanelo.



