Igbo Reincarnation: Etu m si chọpụta na abụ m nwoke lọrọ nwaanyị - Chukwuemego Ogbodo
Igbo kwenyere na a na-alọ ụwa agbanyeghị na ọnweghị ihe sayensi ji ya kpọrọ.
Chukwuemego Ogbodo na ndị be ha kwenyere na ọ lọrọ ụwa dịka enyi nwaanyị nna ya bụ nke nne ya ji aka ya kpọtara nna ya mgbe ọ dị na-agbọghọ.
Mana Kingsley Ekwuazi, bụ dọkịnta na ahụ maka ịmụ nwa na ahụike ụmụ nwaanyị na UNTH Enugu sị na ọnweghị ihe dịka ịlọ ụwa.
Mana Dọkịnta ahụike ọzọ bụkwa onye ọdịnala, Mcginger Ibeneme, sị na ịlọ ụwa karịrị sayiensi nghọta.
Kirie akụkọ a ka ị ghọta ihe dị iche na egbe na egbe.
Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Chukwudi Okereke na Vining Ogu
Akụkọ ga-amasị gị :
- Ihite Uboma unrest: Ụmụ ntorobịa iwe dị n'obi agbaala ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ maka onye otu ha e gburu n'Ihite Uboma, Imo steeti
- Onyeisi ndị ọrụ ọtawaike nke Covid-19, Boss Mustapha, na ndị isi ọrụ ndị ọzọ alatala ọgwụ mgbochi coronavirus
- Covid-19 Vaccines FAQ: Ajụjụ niile i nwere maka ọgwụ mgbochi covid-19



