Lawan, Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria, azochiela Imo steeti

Onyeisi ụlọomiwu ukwu Naịjirịa gara Imo steeti maka emume otu afọ Hope Uzodinma.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Unu asaala chi e. Taa bụ Eke. Eke kere uwa ketekwara anyị ihe ọma oo! Isee

  2. Lawan, Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria, azochiela Imo steeti

    Obere Nwaada Omasirichim dịka ọ na-anabata Senetọ Ahmad Lawan

    Ebe foto si, Senate President/Facebook

    Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria bụ Ahmad Lawan azochiela n'Owere isiobodo Imo steeti n'ụtụtụ ụbọchịụka maka emume ncheta otu afọ Gọvanọ Hope Uzodinma nọọrọla n'ọkwa ya.

    Ọ bụ Osote Onyeisi ụlọomeiwu Ukwu bụ Senetọ Senator Ovie Omo-Agege bụ onye nabatara ya n'ọdọụgbọelu 'Sam Mbakwe International Cargo Airport'.

    Ndị ọzọ so Lawan gaa ije ahụ gụnyere Senatọ Aliyu Sabi Abdullahi, Senatọ Sani Mohammed Musa, Senatọ Bello Mandiya na Senatọ Surajudeen Ajibola Basiru bụ ọnụ na-ekwuru Ụlọomeiwu Ukwu.

    Lawan mechara zute Osote Onyeisiala bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo,Gọvanọ Yahaya Bello nke Kogi Steeti na Gọvanọ Hope Uzodimma na nwunye ya bụ Chioma Uzodimma n'Amaegwuregwu 'Dan Anyiam Stadium' ebe a gbakọrọ maka ụka ekele iji cheta otu afọ Udiọdinma chiarala Imo steeti.

    Senetọ Ovie Omo-agege na Ahmad Lawan n'ọdọụgbọelu Sam Mbakwe dị n'Owere

    Ebe foto si, Senate President/Facebook

    Yaya Bello, Ahmad Lawan, Yemi Osinbajo, Hope Uzodinma na Oriaku ya bụ Chioma Uzodinma

    Ebe foto si, Senate President/Facebook

  3. A tọọrọla ụmụakwụkwọ ọzọ na Kaduna steeti

    Gọọmenti Kaduna steeti agbaala ama na ndị ntọ wakporo ụlọakwụkwọ 'Government Science Secondary School', dị na Ikara n'okpuru ọchịchị Kara n'abalị Satọde tọọrọ ụmụakwụkwọ dị 307.

    Kọmishona na-ahụ maka ihe na-eme n'ụlọ na steeti bụ Samuel Aruwan, onye kwuru na o mere n'ezie kwuru ndị agha zara oku gbatagbata ma zọpụta ụmụaka ndị ahụ.

    Mapụ Kaduna
  4. Rising insecurity: Mpaghara ọbụla inwe otu nchekwa nke ha bụ ihe ga-egbo ọgụ - Peter Obi

    Peter Obi

    Ebe foto si, Getty images

    Aka chiburu Anambara steeti bụ Peter Obi ekwuola na ihe ga-egbo ọgụ nsogbu nchekwa na Naijiria bụ inwe otu nchekwa na mpaghara ọbụla.

    Obi, onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọntakụkọ 'Vanguard' mkpa ọ dị inwe nhazigharị Naijiria na mpaghara ,na mpaghara, kwuru na ihibe otu nchekwa na mpaghara bụ ihe ga- akachasị baara ndị na-anabataghị ya bụ atụmatụ.

    "Nchekwa bụ otu ihe dị oke mkpa, o kwesịrị ka e nye mpaghara ọbụla ohere ihiwe otu nchekwa nke ha."

    "Ya mere mpaghara ọbụla ji ekwu okwu nhazigharị obodo na mpaghara, na mpaghara(restructuring)."

    " Anyị nwere atụmatụ anaghị arụzị ọrụ, nke agaghịkwa arụ ọrụ."

    Obi , onye rụtụrụ aka na ndị agha Naijiria na-akwata dịka ha kwuru na ha na-echekwa ọwụwa |Anyanwụ, ebe a na-ebo ha ebubo na hana-akpakọ ngwaọagha iji mee onwe ha ezeonyeagwalam, kwuru sị, “Otu nchekwa ọbụla ndị gọvanọ kwadoro kwesiri ka a kwado ya.”

    Ọ rụtụrụ aka na nsogbu nchekwa, ndakpọ akụnaụba nakwa ọgbaghara chere Naijiria n'ihu ugbua sị ndị ndu n'aka.

  5. Gọọmentị Anambra ga-ata ndị welili ụgwọ mmanụ ụgbọala ahụhụ

    Ọdọ mmanụ agbịdị

    Gọọmentị Anambra steeti adọọla ndị na-ere mmanụ ụgbọala aka na ntị gwa ha etinyela ego n’elu ihe a na-erebu dịka ngalaba NNPC kwuru na o nweghi mbuli ha mere.

    Ha kwukwara na a ga-ata onye ọbụla welili ya bụ ụgwọ ahụhụ ma ejide ha.

    Chris Okonkwo bụ onyeisi ndị 'Taskforce' kwuru na ya na ndị otu ya na-agagharị na steeti ahụ iji hụ na o nweghi ụlọọrụ mmanụ agbịdị na-egwu ndị Anambra wayo.

    Ọ rịọkwara ndị Anambra ka ha ghara iji gidigidigidi zụọ mmanụ ụgbọala gbatagbata.

  6. Joe Nwodo nwanne Nnia Nwodo anwụọla

    Joe Nwodo

    Ebe foto si, Emeka Atama

    Joseph Nwodo bụ nwanne Nnia Nwodo anwụọla n'ụlọọgwụ akpọghị aha ya n'obodo London.

    Akụkọ kwuru na ọ nwụrụ n'ụbọchị Tọzde dịka ọ rịachara ọrịa ogologo oge.

    Joe Nwodo bụ onye zọrọ ọkwa Gọvanọ Enugwu steeti nakwa ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

    Emeka Atama gwara BBC maka ọnwụ a kwuru na Nwodo bụ odogwu nwoke nwere amamihe nke ukwu.

    "Ọ bata ebe ị nọ, ị ga-ama na mmadụ batara" ka o kwuru.

  7. Ndị ntọ ji ụmụakwụkwọ na Kaduna si ka a kwụọ ha N500m

    Ndị ntọ jị ụmụakwụkwọ 'Federal College of Forestry Mechanisation' dị n' Afaka, n' Ọkpuru Ọchịchị Igabi,Kaduna ekwuola ka e nye ha nde narị naira ise tupu ha atọhapụ mmadụ 39 ha ji, dịka ụlọntakukọ 'Daily Trust' siri kwuo.

    Ndị ntọ wakpoburu ụlọakwụkwọ ahụ n'abali Tọzde makpụrụ ụmụakwụkwọ ruru 180n mana e mechara ụfọdụ n'ime ha nwere onwe ha, ebe 39, gụnyere; nwaanyị 23 na ụmụnwoke dị 16 ka nọ n'aka ndị ntọ ahụ.

  8. Ụlọomeiwu akpoola COAS oku maka ebubo nrụrụaka megide ndịisi agha

    Ụlọnnọchiteanya akpọọla Onyeisi ndịagha ( Chief of Army Staff) bụ Mejọ Generalụ Ibrahim Attahiru oku ịbịa n'ihu ha ịkọwara ha etu ngwaọgụ a zụtara ndịagha Naijiria si banye n'aka ndị ekperima.

    Oku a nke ha kpọrọ ụbọchị Fraide na-abịa dịka onye ndụmọdụ n'ihe gbasara nchekwa bụ Babagana Monguno gbara ama na mkparịtaụka ya na BBC nwwere na a hughghị ihe e jiri ego onyeisiala mapụtara maka ịzụ ngwaọgụ maka ọgụ megide Boko Haram na ndị ekperima.

    Ụlọnnọchiteanya

    Ebe foto si, House of Representatives/Facebook

    A kpoburu Attahiru oku mana o zitere ụfọdụ ndị agha ka ha nọchite ya mana ndị Ụlọnnochiteanya gbara isis akwara ma kwuo na ha chọọ ịhụ ya n'onwe ya.

  9. WTO: Okonjo-Iweala azọchiela na Naijiria

    Ngozi Okonjo-Iweala

    Ebe foto si, @NOIweala

    Onyeisi otu 'World Trade Organisation'(WTO) bụ Ngozi Okonjo-Iweala emeela njem ya mbụ na Naijiria kemgbe ọ banyere n'ọkwa ya taa bụ Satọde.

    Okonjo-Iweala bụ onye odeakwụkwọ Ministrị na-ahụ maka azụmahia nabatara n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja gwara ndị ntaakụkọ na ya bịara ikele onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekele maka ikwado ya.

  10. Buhari ekelela Pinnick maka ọkwa ọhụrụ na Fifa

    Amaju Pinnick

    Ebe foto si, NFF

    Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekelela Amaju Pinnick bụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka egwubBoolụ na Naijiria bụ ‘Nigeria Football Federation’ (NFF), dịka a họpụtara nwa amadị ahụ dịka otu na ndị isi otu nhazi boolu mbaụwa bụ Fifa.

    Buhari kwuru n'ozi o wepụtara n'akara Twitter ya, Nhọpụtara ahụ gosiri na na ụwa ahụla mbọ Pinnick na-agba n'ọrụ nhazi egwuregwu bọọlụ.

    Pinnick nwetara ọkwa ọhụrụ ahụ na ntuliaka e mere ụbọchị Friade na Moroko dịka o ji vootu 43 merie Walter Nyamilandu nke Malawi, onye jibu ọkwa ahụ bụ onye nwetara vootu 8.

    dịka President of the Nigeria Football Federation, Amaju Melvin Pinnick, was on Friday in Rabat, Morocco elected into the FIFA Council – the highest decision-making organ in world football. He attained the exalted seat after defeating his only rival, incumbent Walter Nyamilandu of Malawi by 43 votes to 8 at the Congress held inside the Royal Ballroom of the Sofitel Hotel in Morocco’s administrative capital.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  11. Joao Felix ọ nwereike ịnọchị Aguero?

    Joao Felix nke Atletico Madrid

    Ebe foto si, Reuters

    N'asiri kpaka ute egwuregwu taa, Manchester City na-arọ nwaamadị Atletico Madrid bụ Joao Felix anya maka ịnọchị anya Sergio Aguero mgbe nkwekọrịta ha na ya gwuru.

    Ndị ntaakụkọ egwuregwu na-eche na ọ gaghị abụ ihe ịtụnanya ma City zụrụ nwaamadịa gbara afọ iri abụọ na otu ka ọ nọchịe Aguero dịka anya ha na uche ha ka dịkwa na Erling Haaland na Lionel Messi.

    mmeru ahụ ahụ Aguero meruru enyela ohere ka City nwalee ndị dịka Raheem Sterling, Kevin De Bruyne, Ferran Torres na Gabriel Jesus n'ọnọdụ ya nke bụ na achọpụtaghị na Aguero anọghị.

    Ugbua, Manchester City na-eche ihe ha na ụwa ha ga-eme maka ọnọdụ onye ga-agbara ha ihu.

    Dika anya Barcelona dịkwa na Aguero, ọ dịka City achọrọ ịdowekwu ya otu afọ ọzọ maọbụrụ na ego ya gbadatakwuo ala.

    Mana atụghị anya na Aguero ga-ekwu ihe ọbụla maka nke a ruo mgbe oge ya na Manchester City gwụrụ.

    Onye mbụ anya ha dị na ya bụ Erling Haaland, bụ onye ha rọwara anya kemgbe dịka otu egwubọọlụ ndị ọzọ sikwa arọ ya anya.

    E nwereike ịgba mgba n'isi ha maọbụrụ na Borussia Dortmund nwaa anwa chọọ ire ya.

    Ọ bụ otu ya bụ nwaamadị sị agba egwubọọlụ bụ ihe na-eri ọtụtụ isi.

    Mana ọ bụrụ na City egotelighị ya, ha ga-elewe anya ebe ọzọ.

  12. Italy ga-agba Easter na "Lockdown".

    Italy na Lockdown

    Ebe foto si, EPA

    Italy azọpụla njem itinye mmachi tara akpụ iji kee nkwụcha maka agha mba ahụ na-ebuso coronavirus.

    Dika onye prime minister mba ahụ bụ Mario Draghi dọrọ aka na nti, atụru anya na-aga apiachi,ụlọahịa, ebe ana atụ ndụ mmanụ, tinyekwara ụlọakwụkwọ n’ụbọchị mọnde.

    Ebe aga emechi ogbe niile kpamkpam n’oge Easter bido n'abalị atọ ruo abalị ise nke ọnwa April.

    Ya bụ mba mechiburu akụnaụba ha maka mkpamkpa coronavirus abanyela na gbanụgbanụ ọzọ maka otu ya bụ nje si na-efesa n'ike n'ike.

    Ihe karịrị mmadụ narị otu puku (100,000) mmadụ anwụọla n'ime ya bụ ọrịa mere ha jiri bụrụ ndị nke abụọ ebe ya bụ nje mere arụ n'Europe.

    Nke ka njọ bụ na ọgbatuhie sochiri atụmatụ ịgba ọgwụ mgbochi ha badoro n'azụ nke mere ya ka ọ taa akpụ ịwete ya bụ ọgwụ ọsọ ọsọ dịka ọ dị na-ebe ndị ọzọ n'ọgbakọ European Union.

    Izu gara aga, gọomentị Italy machiri ịrseị ndị Australia ọgwụ mgbochi Oxford-AstraZeneca maka ụkọ ya bụ ọgwụ na be ha.

    N'ebe ndị ọzọ, Bulgaria, Denmark na Norway akwụsịla ịgba Oxford-AstraZeneca maka egwu na ọ na-akpụkọ ọbara mmadụ.

  13. Nne na nna ndị ụmụakwụkwọ College of Forestry ndị ntọ ji arịọla enyemaka gọọmentị etiti

    College of Forestry Kaduna

    Ebe foto si, Yusuf Tijjani

    Nne na Nna ụmụakwụkwọ federal College of Forestry mechanisation Afaka di n'okpuru ọchịchị Igabi nke steeti Kaduna akwala arịrị gbasara ụmụ ha atọọro nọ n'aka ndi ekperima ụbọchi Thursday.

    Gọment steeti ahụ nọrọ ụnyaahụ kwuo na aka na achọ ụmụakwụkwọ iri atọ na itoolu achọ nke gunyere ndi ikom iri na isi na ndi inyom iri abụọ na atọ ụlọakwụkwọ dị nso na Nigerian Defence Acedemy, Kaduna..

  14. Ndị mmadụ akụgbuola otu onye ntọ na Nnewi

    Mob kills a Kidnapper at Nnewi

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị mmadụ ewerela iwe tigbuo otu nwoke n'ime mmadụ abụọ chọrọ ịtọrọ otu nwata akwụkwọ na Nnewi, Anambra steeti.

    Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ndị mmadụ jidere ndị ekperima ahụ kụọ ha ihe tinka kụrụ pan mgbe ha bịara izuru otu nwata akwụkwọ si ụlọakwụkwọ ala.

    Ndị ahụ ji ọgbaatumtum bịa maburu otu nwata so ụmụ nnenne ya ala akwụkwọ dịka egbe.

    Ha si ST Joseph School Otolo Nnewi alọta.

    Mgbe ụmụnne ya huru ihe mere, ha malitere tiwe mkpu nke mere ndị ọgbatumtum ndị ọzọ ji chụwa ha ma jide ha.

    Ha malitere iti ha ihe.

    Tupu ndị uweojii erute ebe ahụ, ha akụnyela ha ọdị ndụ ọnwụ ka mma.

    Mgbe ndị uweojii ji buru ha ruo ụlọọgwụ, ndị dọkịnta kwuru na otu onye anwụọla ebe onye nke ọzọ nọ n'agbata ọnwụ na ndụ.

    A zọpụtakwara nwata ahụ ha tọọrọ.

    Onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ bụ Monday Bala Kuryas kelere ndị zọpụtara nwata ahụ ma dọkwa aka na ntị ka ndị mmadụ kwụsị ịmebiga ihe oke.

  15. Ndị be anyị unu asaala chi e! Ndụ mmiri ndụ azụ taa bụ Afọ. Afọ biko fọtara anyị ihe ọma ooo!

  16. Ego enyere ka eji goro ndị agha Naịjirịa ngwa agha na-efu efu - Babagana Monguno

    Monguno

    Ebe foto si, Getty Images

    Onye ndụmọdụ banyere nchekwa na Naịjirịa bụ Babagana Monguno ekwuola na ihe karịrị nde dọla ekewapụtala maka iji goo ngwa agha efuola.

    Dịka ọ gwara BBC Hausa, Monguno sị na ya amaghị ebe ego a dị mana ihe ọ ma bụ na ngwa agha atụrụ anya abataghị Naịjirịa.

    A ga-eme nyocha

    Maazị Monguno kwuru na ya na-atu anya na onyeisiala Muhammadu Buhari ga-eme nyocha ma chọpụta ihe mere ya bụ ego.

    N'otu aka ahụ, ọ sị na gọọmentị Naịjirịa anaghị ada mba maka nchekwa obodo, ọkachasị etu o si metụta ndị mkpa mkpa ndị obu egbe na awakpo mpaghara dị iche iche na Naịjirịa.

    Ọ sị n'agbanayeghi nke a, gọọmentị ka nyekwara ndị ohere ka ha bịa mee mkparịta ụka banyere ọnọdụ ha tupu mmiri erie ha.

  17. Ndị otu egwubọọlụ Akwa Ibom United enweela ihe mberede okporoụzọ

    Akwa Ibom United

    Ebe foto si, Mfong Patrick

    Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua egwuola na ndị otu egwubọọlụ Akwa Ibom United enweela ihe mberede okporoụzọ ebe ha na-aga Kaduna maka ịgba asọmpị ha nwere n'ụbọchị iri ise nke ọnwa Maachi ha na ndị Jigawa Golden Stars.

    Ihe a mere n'okporoụzọ Port Harcourt -Enugwu

    Ụfọdụ mmadụ meruru obere ahụ dịka ha buuru otu onye ọgbaabọọlụ na ndị nkuzi abụọ gawa ụlọọgwụ.

    Otu onye n'ime ha gwara ndị ntaakụkọ okwu nekwentị sị na ha aghaghịzị aga Enugwu maka ya bụ asọmpi, na ha ga-alahachị azụ ebe ha si ka ha nweeike ịgbakecha nke ọma.

  18. Na Akpọtụ Ugbu A, Ndị agha azọpụtala mmadụ 180 n'ịme ndị atọọrọ na ụlọakwụkwọ Forestry dị na Kaduna

    Ụloakwụkwọ Forestry

    Ebe foto si, Yusuf Tijjani

    Ndị agha Naịjirịa ekwuola na ha azọputala mmadụ 180 ndị oji egbe tọrọ na mwakpo 'ụlọakwụkwọ "Federal College of Forestry Mechanization" dị n'Afaka dị n'okpuru ọchịchị Igabi na Kaduna steeti.

    Ndị oji egbe wakporo ụlọakwụkwọ ahụ n'igwe n'ime abalị Tọzde ma tọrọ ọtụtụ ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi ha.

    Ọ bụ mbidi ụlọakwụkwọ ahụ ka ndị oji egbe a kụwara were banye mee mwakpo ahụ.

    Ministry na-ahụ maka nchekwa obodo na Kaduna Steeti sị na ha kpọtụrụ ndị agha ala na nke elu nwere ọdọ ha na Kaduna ha were tinye isi n'ọhịa ịgbapụta ndị a a tọrọ.

    Mbidi ụlọakwukwọ forestry

    Ebe foto si, Yusuf Tijjani

    Ndị ha zọpụtara bụ ụmụakwụkwọ ụmụwaanyị 42 na, ndị nkuzi asaa na ụmụakwụkwọ nwoke 130.

    A ka na-achọ umụakwụkwọ 30 gụnyere nwoke na nwaanyị amabeghị ebe ha nọ.

    Uche ndị gọọmentị bụ na ha nọ n'aka ndị ntọrị a.

    Ụfọdụ n'ime ụmụakwụkwọ a merụrụ ahụ ma na-anata ọgwụgwọ n'ụlọ ọgwụ ugbua.

    Aka na-achị steeti ahụ bụ Nasir El-Rufai kerele ndị agha maka mbọ ha gbara ma gbaa umụakwụkwọ merụrụ ahụ ume.

    Kọmịshọna na-ahụ maka nchekwa ime obodo na steeti ahụ bụ Samuel Aruwan sị na ndị agha ka na-achọ ndị a ka na-efu.

    Ụmụakwụkwọ a zọpụtara
  19. Na Akpọtụ Ugbu A, Ndị oji egbe awakpoola ụlọakwụkwọ 'Federal College of Forestry' dị na Kaduna

    Ụlọakwụkwọ Forestry

    Ebe foto si, Yusuf Tijjani

    Akụko si Kaduna na-akọwa na ndị oji egbe wakporo ụlọakwụkwọ "Federal College of Forestry" di nso n\ọdọ ụgbọelu Kaduna n'ime abalị.

    Akụkọ ka na-apụta mana kpekpukpeku na-ekwu na a tọọrọ ụfọdụ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị na mwakpo ahụ.

    Ụlọakwụkwọ Forestry

    Ebe foto si, Yusuf Tijjani

  20. NNPC ekwuola na onweghi ego ọbụla e tinyere na mmanụ ụgbọala

    Mmanụ ụgbọala

    Ngalaba na-ahụ maka mmanu na Naịjirịa bụ Nigerian National Petroleum Corporation (NNPC) ekwuola na onweghi ihe dị ka itinye ego na ọnu mmanụ ụgbọala.

    NNPC dere ozi na akara Twitter ha dịka kepukpepu pụtara na ngalaba na-ahụ maka itinye na-iwepu ego mmanụ agbịdị na Naịjirịa bụ nke Bekee kpọrọ Petroleum Products Pricing Regulatory Agency (PPPRA) kwuru na ihe a ga na-ere mmanụ ụgbọala na mba ahụ bụ N212.61 maka otu litre.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Dịka akuko ahụ ahụ siri kwuo, ọ bụ N189.61 ka eji ebubata otu litre mmanụ ụgbọala ma na-aresi ya ndị mgbere mmanụ N206.42.

    Nke pụtara na ihe enwereike ree mmanụ n'ime ọnwa Maachị bụ site N209.61 ruo N212.61.

    Gọọmentị Naịjirịa dekwara n'akara Twitter ha na okwu NNPC kwuru bụ nke bụ eziokwu.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2