African shrine bụ ọgbọ mmekọrịta omenala - Zebrudaya

Aha onyonyo, African Shine: Njem nleta onyeisiala mba Fransị

N'oge njem nleta onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron mere n'African Shine' n'ụlọ onye oti egwu ama ama bụ Fela Anikulapo Kuti, BBC gara ebe ahụ ịhụ dịka ndị mmadụ ji ana-abata Macron.

Nwafo Igbo na-eme ihe nkiri nakwa ịkpa ọchị bụ Chika Okpala e ji Zebrudaya mara gwara BBC na obi dị ya ụtọ nke ukwuu n'emume nke a na-eme n'African Shrine.

O kwuru na ọrụ ọma a Fela Kuti rụrụ ga-anọ ogologo oge.