Onyeisiala mba France Emmanuel Macron ga-ezute Buhari taa
Onyeisiala mba Frans bụ Emmanuel Macron ezutela onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari n'Abuja taa.
N'okwu ya n'ọgbakọ o nwere nke o depụtara n'igwe okwu Twitter ya n'olu Frenchị, Macron kwuru na Naijiria bụ obodo na emepe emepe nke ga-ada ụda n'Afrịka nakwa Yurop.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Macron ga agawa Legos ebe ọ ga-aga n'ukwu arụsị Fela nke onye egwu a ma ama na Naịjirịa lara mmụọ bụ Fela Anikulapo Kuti guzobere.
Njem a ga-adị ka Macron a na-alọta ụlọ maka na ọ rụbuola ọrụ n'ụlọọrụ mba Frans n'isi obodo Naịjirịa n'afọ ole na ole gara aga.
Macron dere maka ịbịa Naịjirịa ọzọ kamgbe ọ rụchara ọrụ ebe a. O dere na French sị " Ịlọghachị Naịjirịa, ka afọ 17 gachara".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
O bịarute Abuja, Macron na Buhari ga-akarịta ụka gbasara nchekwa na ndị na-eyi egwu maka na okwu gbasara nchekwa na mpaghara Afịrịka niile dị ndịisiala abụọ ahụ oke mkpa.
Ndị ụlọọrụ onyeisiala dere maka ya na Twitter sị:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
A na-elekwa anya na ọ ga-agwa ọgbakọ ndị omeiwu niile okwu tupu ọ gawa Legos ebe ọ ga-aga mmepe ụlọọrụ ọhụrụ Alliance Française.
A ga-elekwa ya ọbịa n'okwu arụsị Afịrịka, Macron ga-abụ onyeisiala mbụ ga-aga ya bụ okwu arụsị Fela.
Ndị ụlọọrụ mba Frans na Naịjirịa kwuru na njem ahụ ga-enye aka ịdọtị mmekọ dị n'etiti Naịjirịa na mba Frans.
Naịjirịa nwere ụlọọrụ ndị Frans karịa ụlọọrụ mba Afịrịka ọzọ niile.