Atiku: Achọghị ndị mba ọzọ iji PVC adịgboroja wakpo ntuliaka Naịjirịa

PVC adịgboroja

Obi adịghị onye bụbụ osote onyeisial;a naịjirịa bụ Atiku Abubakar mma maka akụkọ na webụsaịtị Alibaba.com na-ere kaadị itu vootu Naịjirịa bụ PVC n'aha ịchafụ.

Akụkọ a pụtara kamgbe ụbọchị ụka dịka ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka bụ Inec pụtarala kwuo na ha na-etinye anya na ya bụ akụkọ.

N'akwụkwọ ụlọọrụ Inec depụtara na webụsaịtị ha, ha kwuru ka mmadụ niile hie asaa n'anya ma ghara ịga ebe ọbụla zụọ PVC maka na ha agaghị ejinwu ya mee mbinyeaka.

Mana Atiku bụkwa onye chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019 ahụ n'okpuru pati PDP dere akwụkwọ na kaadị ahụ a na-ere ewetuola ntukwasị obi e nwere ebe ndị Inec nọ nakwa nchekwa obodo.

N'okwu ya; "Mwakpo nchekwa anyị na-emetụta maka na ọ na-emetụta ohere Naịjirịa nwere iji wulie ngalaba siri ike dịka Inec.

"Ụdị ihe dị otu a nwere ike imepe ụzọ ịzụ vootu nke ga-emebi mbinyeaka dị ọcha nke Naịjirịa chọrọ ime na 2019."

Atiku gwakwara Jack Ma na Naịjirịa jikwaa PVC mee ntuliaka n'afọ 2015 na-enweghi mwakpo ọbụla agbanyeghi na webụsaitị ya bụ Alibaba.com dịkwa oge ahụ.

Aha nkeananụānụ, Nwaanyị na-ahụ maka nkuzi itu vootu na mpaghara ọwụwa anyanwụ

N'okwu Atiku; "Nke a gosiri na alibaba.com anaghị enyefe onwe ya n'aka ndị chọrọ itisa ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa na 2019."

Atiku rịọrọ Jack Ma ka o jiri ikike ya gbaa mbọ hụ na kaadị ahụ alọghachiteghi azụ na webụsaịtị ya.

Ọ rụtukwara aka na ebubo mwakpo a na-ekwu mere na ntuliaka ndị Amerịka n'afọ 2016 nke mba dị icheiche a na-atụ aka gọnarịrị, ma na ya bụ ebubo rapụtara ọtụtụ ụlọọrụ dịka Facebook, Cambridge Analytica na Twitter.

Atiku kwuru na arịrịọ ya bụ ka a ghara inwe ụdị ebubo a na ntuliaka Naịjirịa na 2019.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: