Emmanuel Macron: Ịkwụsị ụmụ Afrịka ịgbaga Yurope dị n'aka ndị ndu mba Afrịka

Buhari na Macron

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Buahari na Macron n'Asọ Rọk

Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron ekwuola na atụmatụ European Union ịrụ ụlọọrụ maka ndị mbịarambịara na mba Nọt Afrịka agaghị aba uru ma ọ bụrụ na mba ndị ọ metụtara ebughị ya n'isi.

Macron onye kwuru nke a oge ọ bịara njem na Legọs sị na Fransị dị njikere ịkwadọ mba nọ n'Afrịka n'ihe gbasara nchekwa na okwu ndị mbịarambiara si Afrịka mana ọ kwụsiri ike na igbo nsogbu ndị a ga-esi n'Afrịka.

Macron kwetara na Yurope ga-atọ n'igbo nsogbu ụmụ Afrịka ịgbata Yurop ọtụtụ afọ ma kwuo na ọ dị mkpa ka mba ndị Afrịka jịkọọ ọnụ chọta ogbugbo nsogbu ụmụafọ ha na-anwụfu n'oke osimiri.

Ọ sịrị, " Ọ gaghị enwe isi ma ọ bụrụ na ndị gọọmentị Afrịka ejikọghị ọnụ. Ọ na-adịkarị mfe, ikpebiri ndị ọzọ. N'ọgbakọ EU, anyị kwesịrị ibu ụzọ kwuoro onwe anyị.

" Dịka o siri gbasa mbịarambiara, ọ bụghị ihe kachasị mkpa ka ndị mmadụ gwuo mmiri asaa gaa mba asaa iji banye Yurop. Nke a bụ ihe m jiri kwenye na mkpa ọ dị ka anyị na obodo dị n' agbata oke osimiri Mediterranean."

O kwuru na Yurop ga-echesi oke ala ha na mba dị ọzọ ike ma nye aka ịhụ na nsogbu ndị si Libya na-ezuba ndị mbiarambiara si Afrịka site n'oke osimiri Mediterranean kwụsịrị.

O kwuru na nsogbu ụmụ Afrịka ịgbaga Yurop bụ nsogbu oke ọmụmụ nwa n'Afrịka.

Nke a abụghị mbụ Macron na-ekwu ụdị okwu a nke buterela ya nkatọ n'aka ndị sị na ọ na-ekwu dịka ndị ọcha chiburu mba Afrịka mana okwu ya gbadoro ụkwụ na ịkwanyere Naijria and mba ndị Afrịka ndị ọzọ ugwu dịka mba nwere onwe ya.

Aha onyonyo, Emmanuel Macron Bịara njem nleta na Nịajirịa

"Ihe anyị chọrọ ime bụ inye aka ma tinye onwe anyị mpaghara Afịrịka na Sahel nye aka luso ndị oyi egwu ọgụ ọkachasị na Mali na mpaghara ahụ.

"Anyị ga-anọ oge niile ndị ọyi anyị rịrọrọ anyị, ọkachasị na Mali.''Uche Akolisa

"Mana ihe dị mkpa bụ etu gọọmenti dị icheiche na mpaghara Afịrịka si ejikọ onwe ha ịluso ndị oyi egwu ọgụ ma chụpụ ọtụtụ ndị a ọkachasị ndị jihad. Ya mere m ji akwado atụmatụ G5 nke mpaghara Sahel ma na-eche ijikọ aka ọnụ. Naịjirịa, Nije, Chad na Kamerun dị mkpa."

Macron kwuru na ọ dị mkpa ka mba dị icheiche tinye uchu ịchụpụ ndị Jihad.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: