Igbo Tradition: Otanjele, uri na ihe ntecha ndị ọzọ ụmụagbọghọ Igbo ji achọ mma mgbe gboo

Etu ụmụnwaanyị Igbo si achọ mma oge gboo dị iche na nke oge ugbua
Nkọwa foto, Etu ụmụnwaanyị Igbo si achọ mma oge gboo dị iche na nke oge ugbua
    • Onye dere ya, Chioma Obianinwa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo

Nwaagbọghọ Igbo ọbụla na-amaghị ka e si etecha onwe ya dị ka nkịkara akwa n'anya ụmụagbọghọ ibe ya.

Ị chọrọ ịma agbọghọ chapụrụ achapụ, ị lee ya anya ị ga-ahụrịrị ka ahụ ya si akwọ mụrụ mụrụ maka ihe ntecha dị iche iche o jiri chọọ onwe ya mma.

Akụkọ a ga-egosi anyị ihe ntecha ole na ole ụmụagbọghọ Igbo ji achọ mma mgbe elu ka bụ ala ọsa.

1.Ka anyị malite n'ọtangele:

Ọtụtụ ihe ndị e ji achọ mma n'oge gboo bụ na mgbọrọgwụ osisi dị icheiche ka e si enweta ya
Nkọwa foto, Ọtụtụ ihe ndị e ji achọ mma n'oge gboo bụ na mgbọrọgwụ osisi dị icheiche ka e si enweta ya

Ọtangele bụ pawụda ojii.

Ọ dị ka ihe eji unyi akwọrọ akwọ wee mee. Nke a bụ nke a na-akpanye n'anya.

Ụfọdụ na-akpọ ya tiro. Ụmụagbọghọ techaa ọtangele, anya ha a na-egbuke ka ọnwa.

Aha onyonyo, Mkparịta ụka BBC Igbo na Ikeogu Oke

2.Uri

Ihe ntecha a esi na mgbọrọgwụ enweta bara ezigbo uru n'ala Igbo makana eji ya ese eserese n'ọnụ maọbụ ụkwụ nwaanyị Igbo ọbụla ọ na-amasi.

O nwereike ite ya n'ahụ ma ọ na-eme emume alụmdi na nwunye maọbụ ọ gawa mmemme ndị ọzọ a na-eme n'ala Igbo.

E nwekwara ike iji uri dozie ụlọ maọbụ ahụ aja ụlọ mmadụ.

Mbata ozioma nke Jesu Kristi metụtara etu esi akwanyere uri ugwu maka na ndị ụka na-eche na ọ bụ ihe ndị ọgọ mmụọ.

Aha onyonyo, Igbo Culture: Usoro e ji echi nze n'ala Igbo

3.Uhie

Uhie bụ pawụda na-acha uhie uhie.

A na-eji ya akwado ụfọdụ ụmụagbọghọ maka alụmdi na nwunye n'oge gboo.

E techaa nwaagbọghọ uhie a, ahụ ya a na-akwọ mụrụ mụrụ.

4. Ayọrọ Mgbaji

Ayọrọ Mgbaji
Nkọwa foto, Nke a bụ nke a na-eke n'ukwu nakwa n'olu

Nke a bụ nke ụmụagbọghọ na-anya n'ukwu ma n'olu.

Ọ na-abụ nwaagbọghọ chọọ ịlụ di, a nyanye ya n'ukwu, olu ma ụkwụ ka ndị mmadụ kiriwe mma ya.

Ọ na-achakarị uhie uhie maọbụ ọcha.

Gịnị na-emezi ugbua?

Ihe ntecha ụmụnwaanyị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ihe ntecha ụmụnwaanyị n'oge ugbua yitekwara nke ndị gboo mana ihe dị iche dị n'etiti nnukwu 'B' na ọkpa ehi

Ihe ejirila ike gbanwe ugbua dịka ihe ndị a gbara kasa.

Ọtangele, Uhie ọnụ ma ayọrọ mgbaji eyirila uwe ọhụrụ nke buzi na onye ukwu ma onye nta jizi ha eme ngala ma na-enweta ezigbo ego site n'ire ha.

Ndị ntecha mere aka ọrụ na-ekwusi ike na ọ na-agara ha ezigbo ahịa makana nnunu ichọ mma ahụ na-ebe mgbe ahụ n'etiti ụmụnwaanyị ka na-ebe ugbua.

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile