Skin Bleaching: Ihe nde kwuru nde ụmụnwaanyị na-ete ude ịcha ọcha na-agabiga

Ebe foto si, AFP
Shiroma Pereira (Nke a abụghi ezi aha ya) ji akwa sị; "A jọrọ m ezigbote njọ oge agbamnkwu m. Ajọbeghị m ụdị njọ ahụ mbụ.
O bi nso n'isi obodo Sri Lanka bụ Colombo. Dịka ọtụtụ mmadụ n'Ọwụwa Anyanwụ Asia, o kpebiri ime ka akpụkpọ ahụ ha chaa ọcha tupu oge agbamakwụkwọ ya eruo.
Olileanya ya bụ na ọ ga-enwe akpụkpọ ahụ mara mma.
"Dịka ọ fọrọ ọnwa abụọ tupu agbamakwụkwọ m, agara m ụlọ ndozi isi, ha were nyem ude ọcha"
Ọ gwara BBC sị, "Mgbe m techara ya n'otu izu, ihu m agbanwee na-acha ọcha."
"Achọrọ m inwe ahụ ọcha mana ọ bịara gbaa m ọkụ."
Agwa oji
Kama ọ ga-agbado anya n'ịkwado agbamakwụkwọ ya, nwaanyị ahụ mefuru ego ya na oge ya n'ọgwụgwọ.

"E nwere m ọkọ dị ọcha wụrụ m n'ahụ nke mechara chọrọ apa ojii"
Ude ọcha enyere ya tee bụ nke ezighi ezi. E zobatara ya ma zụọ ya n'ahịa iwu.
Apa na-eji oji ka na-egosi n'ahụ Pereira dịka otu afọ ebe ọ na-agwọ ya gafechara.
Ya mere na gọọmentị mba Sri Lanka amalitela ịmachi orure ude ọcha.
Ndị na-azụkarị ude ọcha
Mmadụ nde ole na ole ọkachasị ụmụnwaanyị n'Afrịka na Eshia na-eme ihe niile ruru ha aka ịcha ọcha.
Ahịa ude ọcha ruru ihe karịrị ijeri dọlla 4.8 n'afọ 2017 ebe a na-atụ anya na ọ ga-eru ijeri dọlla 8.9 n'afọ 2027.

Ebe foto si, AFP
Ọ gụnyere ncha, ude, na ọgwụ ntụtụ ga-ebelata ahụ mmadụ nrụpụta kemikal melanin nke na-ewu ewu.
Dịka World Health Organization (WHO) ụmụnwaanyị anọ n'ime iri na-ete ude ọcha n'Afrịka.
N'Afrịka, Naịjirịa nọ n'ọkwa mbụ ebe ụmụnwaanyị 77% ma-ete ya bụ ude. Togo 59% na Sawụt Afrịka 35% so ha na-azụ.
N'Eshia, ụmụnwaanyị 61% n'India nakwa 40% na Chaịna na-ete ya.
Ọgbatuhie mbaụwa niile
N'afọ gara aga, gọọmentị Ghana dọrọ ụmụnwaanyị dị ime aka na ntị ha kwụsị ịṅụ ọgwụ ga-eme ka nwa ha bu n'afọ chaa ọcha bu gluthatione n'ime ya.

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụnwaanyị na-aṅụ ọgwụ ahụ na-eche na ọ ga-eme kia nwa ha bu n'afọ chaa ọcha.
Melanin bụ agwa ojii dị n'ime ahụ na-eme ka mmadụ dịrị oji.
Ọgwụgwọ
Ngalaba ehibere maka akpụkpọ ahụ nke mba Briten tinyere ọnụ n'okwu gbasara ude ọcha.
Ha kwuru na "hydroquinone nwereike ịgwọ agwa ezighi ezi maọbụrụ na dọkịta akpụkpọ ahụ mara maka ya ma tinye ya anya"

Ebe foto si, Getty Images
Ha kwukwara na ụfọdụ ihe na-ahake mmadụ nwekwara ejiji dị mma n'ọgwụgwọ.
Ọ na-arụ ọrụ?

Ebe foto si, AFP
Mana ngalaba ahụ kwuru na "o nweghi ụzọ ziri ezi a ma ama mmadụ ga-eji chake akpụkpọ ahụ ya."
Ha kwukwara na ụfọdụ dọkịta na-enye ndị mmadụ ude nchake ịji gwọ ọrịa dịka melasma.

Ihe ndị ọ na-eme n'ahụ
Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-ego ude ọcha n'ajụghị ajụ mana o nwereike ịmebi ụfọdụ ihe na-ahụ dịka:

Ebe foto si, Getty Images
- Ọrịa akpụkpọ ahụ na ịkọ ọkọ
- Akpụkpọ ahụ na-acha mmiri mmiri
- Akpụkpọ ahụ na-acha ntụ ntụ
(Onye kwuru - NHS UK)

Mercury
Ụfọdụ ngwa ọcha a na-enwekwa ihe na-emerụ ahụ n'ime ya.

Ebe foto si, Getty Images
"Ngwa ọcha ọbụla nwere Mekuri n'ime ya adịghị mma na-ahụ" ka WHO kwuru
Mana ha chọpụtakwara na a ka na-emepụta ngwa nwere ya bụ kemikal na Chaịna,Lebanon, Pakịstan, Amerịka na Tailand.
"Mekuri bụ nsị" ka Alexandroff kwuru
Ihe ndị dị mkpa ọ na-emebi n'ime ahụ gụnyere:
- Ịmebi akụrụ
- Ịwụ gị ọkọ n'akpụkpọ ahụ, ịbunye gị apa nakwa imebi agwa ahụ
- Ahụ enweghizi ike ịgbochi ọrịa nje
- Oke echiche na ịda mba.











