Covid-19 Vaccines FAQ: Ajụjụ niile i nwere maka ọgwụ mgbochi covid-19

Ebe foto si, Reuters
- Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
N'ụbọchị abụọ nke ọnwa Maachi ka ọgwụ mgbochi si n'otu COVAX nakwa ụlọọrụ Astrazeneca tụrụ ụkwụ na Naịjirịa.
Dịka ụbọchị ole na ole gara, onyeisiala Muhammadu Buhari nakwa osote ya bụ Yemi Osinbajo gbara ọgwụ ahụ n'ihu ala niile iji gosi na-onweghi ihe ọjọọ dị na ya.
N'agbanyeghị nke a, ọtụtụ ndị mmadụ ka chị obi ha n'aka maka ọgwụ a ma na-atụ ụjọ maka ihe o nwereike ịme.
Anyị edetuola ụfọdụ ajụjụ a ma za kwa ya iji kasie ndị mmadụ obi.

Ebe foto si, ProfOsinbajo/Twitter
Kedụ ebe m nwereike ịgba ọgwụ a?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ụlọọrụ a kpọrọ National Primary Health Care Development Agency ewepụtala usoro ị ga-eji denye aha gị n'igwe kọmpụta.
Ị nwekwara ịke ịhọrọ ebe ị chọrọ ị gba ya bụ ọgwụ nakwa ebe dị nso na be gị.
Dịka ọ dị ugbua, ihe karịrị mmadụ nde abụọ edenyela aha ha ịgba ọgwụ a.

Ego ole ka ọ ga-ewe m?

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị etiti akpọpụtabeghi ego ole ọ ga-ewe mmadụ iji nata ọgwụ mgbochi a.
Kama ha kwuru ka ndị ọrụ ahụike nakwa ndị okenye na ndị ọrịa na-arịa gbaa mbọ hụ na ha wetara onwe ha ebe a na-agba ọgwụ a.
Kedụ ihe ọ na-eme n'ahụ mmadụ?

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garbe Shehu kwuru na o nweghi ihe ọbụla merela onyeisiala mgbe ọ gbachara nke ya.
Mana gọọmentị mba Briten kọwara na o nwere ụfọdụ ngosi mmadụ nwereike ị nwe ga-ejikwa aka ya kwụsị n'ime otu izu
Ha gụnyere: ike ọgwụgwụ,isi ọwụwa, ịgbọ agbọ, ịkọ ọkọ n'ebe agbara gị ọgwụ, ọkpụkpụ ịgbu mgbu, ahụ ọkụ ndz.
Enwerem ike ibute ọrịa covid-19 ọzọ ma m gbachaa ọgwụ a?

Ebe foto si, AFP
O dobeghi anya ma nke a enwereike ịme n'ezie mana ngalaba ahụike mbaụwa niile bụ WHO kwuru ka ndị mmadụ jide ka ha ji.
Nke a pụtara "kpuchie imi gị, kwọọ aka gị, dopu onwe gị iche ganye mgbe mpụtara ga-egosi na ọgwụ mgbochi achụlaala covid-19 kpam kpam.
Ihe ndị ọzọ ị kwesiri ịma

- Anaghị agba ụmụaka ọgwụ a
- Ọgwụ mgbochi a enweghi nje coronavirus n'ime ya dịka akụkọ ụgha si kwuo.
- Amabeghị ma ọ na-ekpuchi ndị mmadụ n'ebe ụdịrị ọhụrụ ọrịa a dị (dịka mba UK na mba Saụt Afrịka)












