Chika Okpala: 'Ọ bụ mmasị m nwere n’ọrụ amị kwanyere m n’ọrụ ejije' - Zeburudaya
Chika Okpala, onye ama dị ka Chief Zebrudaya Okoroigwe Nwaogbo alias 4:30 tara ụkwa jaa eze na mkparịtaụka ya na BBC Igbo.
Ọ kọwara ka o siri gaa akwụkwọ nakwa ka o siri banye n’ọrụ ejije site na mmasị o nwere n’ọrụ amị (ọrụ ndịagha).
Okpala malitere njem ọrụ ejije ya mgbe a lụrụ agha Naịjirịa na Bịafra.
Mgbe ọ jere ịba amị ka ha jụrụ iwe ya n’ihe na ọ pere mpe mgbe ahụ.
Mana ọ mechara nweta ohere imere ndị amị lọtara n’agha ejije.
Ọ kọwara ebe aha otutu ya "palm wine powerless" pụtara.
Chika Okpala ji otu nwaanyị na ụmụ atọ.
Ọ lụrụ nwaanyị n'afọ 1980.
Ụmụaka ya alụọla di na nwunye mụta ụmụ.
Zebrudaya si na ọnweghị nwaanya dị ndụ chọrọ ịrụ ọrụ ejije karịa nke nwụrụ anwụ.
Ọ sị ọ bụ eziokwu na ụmụụmụ ya ka dị nta, mana ofụ n'ime ha na-egosi na ọ nwereike ịrụ ọrụ ejije.
Ọ sị na-amụrụ ya n'afọ 1950 nke pụtara na ọ gbara afọ iri asaa na abụọ (72) ugbua.
Ọ gara akwụkwọ na mba mmiri, nke bụ Rivers steeti ugbua.
Ọ gakwara akwụkwọ kọleeji n'Onitsha, Anambra steeti bụ ebe ọ nọ mgbe agha Bịafra na Naịjiria dara.
Ha lawazie be ha bụ Nnobi.
Okpala kọrọ ka ịba amị si gụọ ya agụụ mana ha ekweghị ka ọ banye maka na o pere mpe (ọ dị afọ iri na ise mgbe ahụ).
Ọ sị na ihe na-atọ ya ụtọ bụ ejiji ndị amị.
O kwuru ọtụtụ ihe dị omimi n'ajụjụ ọnụ a nke bụ na onye kirie ya, ọ mụta ihe na ya.