‘Mmadụ ise nwụrụ n’ọgbaghara nke ahịa Dei Dei, Abuja’ – Minista na-elekọta Abuja

Ndị uweojii n'Abuja etinyela ọnụ n'okwu ọgbaghara dapụtara n'ahịa Dei Dei nke Abuja n'ụbọchị Wenezde.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjịrịa n'Abuja bụ Josephine Adeh kwuru: "Ndị uweojii Naịjirịa na-esi imi n'ala ugbua ịma etu ọgbaghara a siri dapụta n'ezie dịka anyị na-enyo ima kpọm kwem ihe ndị a kụkasiri ma mebie n'ebe ahụ"
"Anyị na-agba mbọ ịhụ na udo anyị weghachịtere n'ebe ahụ nọdosiri ike"
"Anyị ga-ezịpụta ozi banyere mpụtara nnyocha a n'oge adịghị anya"
Minista na-elekọta Abuja bụ isi obodo Naịjirịa bụ Mohammed Musa Bello ekwuola na ọgbaghara ahụ tara isi mmadụ ise nke gụnyere nwaanyị ahụ a sị na ụgbọala riri elu.
O kwuru: "Ọgbaghara ahụ dapụtara n'ahịa Dei Dei n'ụbọchị Wenezde tara isi mmadụ ise nke gụnyere nwaanyị ahụ ụgbọala riri elu."
"E nyela m iwu ka agbachie ahịa Dei Dei ugbua ruo mgbe eweghachitere udo n'uju ebe ahụ."
Otu onye agbara ngwa ahịa ha ọkụ gwara BBC Igbo sị:
"Anyị achọghịzị ka ndị Okada na-agba ebe a maka ọgbaghara ha na-ebute"
"Anyị chọrọ udo, anyị achọghị ọtụtụ"

Nwaanyị ọzọ n'ebe ahụ kwukwara "Ngwa ahịa anyị niile gbara ọkụ, anyị gbazị aka, enweghịzị ebe anyị ga-esi nweta ihe oriri"
"Biko bịanụ gbatara anyị ọsọ enyemaka"
Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ gbata gbata na-emenyụ ọkụ ka nọ n'ahịa a emenyụ ya bụ ọkụ ma ekpọpụta ure ure so ọgbụgba ọkụ ahụ.

Ebe foto si, Screenshot
Kedụ ka ọgbaghara siri dapụta?
Cheta n'akụkọ pụtara n'ụbọchị Wenezde n'ọgbaghara dara n'ahịa Dei Dei nke Abuja bụ ebe a na-ere osisi na ngwa ahịa ndị ọzọ eji arụ ụlọ.
E kwuru na ọgbaghara so ọnwụ otu nwaanyị dapụrụ n'ọgba tum tum maka etu onye ọkwọ ya bụ ụgbọ siri nyagharịe nke mere ụgbọala ọzọ jiri rie ya bụ nwaanyị elu.
E kwuru na ndị nọ ebe ahụ ji iwe gbaa ya bụ ọgba tum tum ọkụ nke mere ọkwọ ọgba tum tum ahụ jiri kpọọ ndị ọzọỌgbaghara dapụtara n'ahịa Dei Dei nke Abuja akpatala nkụsa nakwa ọgbụgba ọkụ ọdụahịa nakwa ngwaahịa ndị mmadụ n'ahịa ahụ.
Dịka ndị nọ ebe ahụ na-achọghị ka akpọọ aha ha siri kwuo, ha kọwara BBC Igbo na ya bụ ihe malitere mgbe agbara ọgba tum tum otu onye Okada ọkụ n'ihi nyagherị ọ nyara mere nwaanyị o bu n'azụ jiri dapụ.

E kwuru na ụgbọala gwongworo na-agafe ebe ahụ riri nwaanyị ahụ elu nke mere o jiri nwụọ.
Ka e si kwuo, ndị nọ ebe ahụ ji iwe gbaa Okada ahụ ọkụ nke mere ya bụ onye Okada jiri gbapụ ma gaa kpọkọta ọtụtụ ndị otu ya.
E kwuru na igwe mmadụ ndị Okada ahụ bịara ịbọ ọbọ n'ihe a ji osisi nakwa ngwa ọgụ ha pụta ma kụsasiwa ụgbọala na ngwa ahịa ndị nọ ebe ahụ.
Otu onye agbara ngwa ahịa ọkụ kwuru:
"Ha pụtara ma malite imaja ndị nọ ebe ahụ"
"Igwe mmadụ ndị Okada ahụ gbara ngwaahịa m niile ọkụ"
Ka o dị ugbua, a na-eche na ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị Igbo na ndị awụsa bi ebe ahụ.

Ebe foto si, Screenshot
Ọtụtụ ihe onyonyo nke BBC Igbo natara gosiri ebe ndị ntorobịa na-ebe akwa dịka ndị bu osisi na-agba ụlọ ahịa ha ọkụ.
Olu onye na-ese ihe onyonyo ahụ kwuru n'asụsụ Igbo 'Lee ndị a na-agba ọdụahịa ndị mmadụ ọkụ, chai, ego ndị mmadụ alaala ebe a'.









