Romanus Amuta: Lee ihe ị maghị maka 'Naatị' nke New Masquerade nwụrụ anwụ

Ebe foto si, Lion Finger
Romanus Amuta e ji Natty mara, anwụọla ka ọ dị afọ 79.
Chukwuma Amụta bụ diọkpara ya gwara ndị ntaakụkọ na nna ya nwụrụ ka ọ rịachara obere ahụ.
Cordelia nwunye ya gwara BBC Igbo ihe ndị mmadụ amaghị maka di ya, dịka ọ kọwara maka ahụ ọ rịara.
Ihe ị kwesịrị ịma maka 'Natty'
- Romanus Amuta bụ onye Ukana dị n'okpuruọchịchị Udi, n'Enugu steeti
- Ya na Cordelia nwunye ya mụtara ụmụ isii, nwoke abụọ na nwaanyị anọ
- Ọ rụrụ ọrụ dịka onye ntaakụkọ n'ụlọọrụ Daily Times Newspaper tupu ọ banye ọrụ ejije
- O sokwa mee ihe onyonyo ụfọdụ dịka Ijele n'afọ 1999, Lion Fingers n'afọ 2003, Eagles Bride n'afọ 2005
- Ọ dara ọrịa mkpọnwụ ahụ (stroke) kemgbe afọ 2009, dịka nwunye ya si kwuo
- Ya na Ezinaụlọ ya bi n'Enugwu ruo mgbe ahụ mesiwara ya ike, ụmụ ya kpọtara ya Legọs ka ha leta ya anya na n'afọ 2015
New Masquerade bụ ejije ịkpa ọchị na-eme na Nigeria Television Authority (NTA) kwa abalị Tuzde ma o jiri ọkara gafee elekere asatọ nke abalị ruo elekere itoolụ.
Onye malitere ide ejije a bụ James Iroha nke zara Giringori Akabogu na ya bụ ejije e mere ebe afọ 1980 ruo n'ebe afọ 1990.
New Masquerade so n'ihe ejije kacha nọtee aka n'onyonyo mgbe ahụ.
A malitere ime ya bụ ihe ejije iji tinye ndị mmadụ ọchị n'ihụ ka a gbachara ọsọ agha.
Ihe ndị otu ya kwuru
Onye otu ya n'ọrụ ejije bụ Chinwetalu Agu, sị na "ya bụ nwoke nwere ntachi obi maka na ha tara ahụhụ na nkịtị n'ọrụ ejije, n'ihi na ego adịghị ya mgbe ha batara. Ya bụ aga m asị na ọ nwụrụ n'ụbịam".
O kwuru na uru ha ritere mgbe ahụ bụ na a ma ha ama ebe niile nke bụ na ha na-aga n'ụzọ a na-eto ha.
Ejije buputere Natty
Chika Okpara, onye a kpọrọ Chief Zebrudaya Okoroigwe Nwaogbo alias 430, n'ejije New Masquerade, bụ onyeisi n'ime ya bụ ejije.
Ndị ọzọ so na ya bụ ejije bụ Lizzy Evueme (Ovuleria, nwunye Zebrudaya) Philo Ada ya, Clarus na Giringori ndị odibo ya, Claude Eke bụ Jegede Sokoya, Christy Essien-Igbokwe bụ Akpenọ - Nwunye Sokoya, David Ofor bụ Clarus, Romanus Amuta bụ Natty.










