Zebrudaya, Okonkwo, Jagua na ejije TV ise nyere ndị mmadụ ọṅụ n'afọ olemole gara aga

Ejije 'New Masqurade', 'Things fall apart', na Jagua Jagua

Ebe foto si, Youtube

Nkọwa foto, Ejije 'New Masqurade', 'Things fall apart', na Jagua Jagua so n'ejije nyere ndị mmadụ ọṅụ n'afọ ndị gara aga
    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Igwe onyonyo 'television' so n'otu ihe Teknụzụ rụpụtara nke bụ ọgbaraigbo gharịị.

Mana e wepụ ejije, egwu na akụkọ ụwa, igwe TV ga-abụ akpati nkịtị.

Ọtụtụ ejije jupụtara na TV taa, nke e ji akụzi ihe, enwerị obi aṅụrị nakwa agbasa ozi dị mkpa dị icheiche.

Ị jụọ ndị ntorobịa ugbua aha ejije TV ha ma, ị ga-anụ ihe dịka 'The Johnsons', 'My flatmates', dịrị gawazie.

Mana ejije ndị a nwere ndị tọrọ ha, ndị a kpụ n'ọnụ na Naịjirịa malite n'afọ iri abụọ ruo afọ iri isii gara aga.

Akụkọ a bụ iji kọọrọ ndị ntorobịa ihe ejije TV dịka ya n'afọ ndị gara aga, ma chetakwara ndị okenye ụfọdụ ejije ndị kpara ha obi ọma.

1. Zebrudaya (New Masqurade)

Ndị so mee ejije 'New Masqurade

Ebe foto si, NTA

Nkọwa foto, Ndị so mee ejije 'New Masqurade

N'afọ 1974 ruo n'etiti afọ 1990 ga, ka ejije a bụ 'New Masqurade wuru ewu.

Ihe ọtụtụ ji mara ejije a n'oge ahụ bụ 'Zebrudaya', nke bụ aha onye a kacha mara na ya bụ ejije.

Otu egwu e ji mara ya bụ 'Eddie Kwansa bio bio, izu ka mma na nne ji o, bịa o bịa'.

Ọ bụ ụlọọrụ ntaakụkọ 'East Central State Broadcasting Corporation', nke mechara bụrụ 'Nigeria Television Authority' (NTA) Enugu, chịkọbara ejije a.

Ndị so n'ejije a gụnyere:

Chika Okpala (Zebrudaya)

Ebe foto si, Youtube Screengrab

Nkọwa foto, N'ime ndị niile so n'ejije New Masqurade, naanị Chika Okpala (Zebrudaya) bụ onye ka na-apụta n'onyonyo
  • Chika Okpala - Chief Zebrudaya (Alias 4:30)
  • Lizzy Evoeme - Ovularia
  • James Iroha - Giringori Akabogu (Alaala mmụọ)
  • David Ofor - Clarus
  • Claude Eke - Jegede Sokoya (Alaala mmụọ)
  • Christy Essien-Igbokwe - Akpenọ (Alaala mmụọ)
  • Romanus Amuta - Naatị... dịrị gawazie

N'ime ndị a niile, naanị Chika Okpala bụ onye ka na-apụta n'onyonyo n'ejije ndị e ji ere ahịa (adverts) ugbua.

2. Okonkwo (Things Fall Apart)

Things fall apart

Ebe foto si, Youtube screengrab

Ọ bụ odogwu Igbo bụ Chinua Achebe dere akwụkwọ ọ kpọrọ 'Things fall apart' n'afọ 1958.

Mana n'afọ 1987 ka ụlọọrụ NTA tinyere ya n'ejije nke na-egosi na TV kwa izuụka nke wuru ewu ma kpọtụọ akpọtụ n'oge ahụ.

Ejije a kọrọ akụkọ maka otu nwoke aha ya bụ Okonkwo nakwa etu o si gbaa mbọ ichekwa omenala obodo ya bụ Umuofia oge ndị ọcha batara.

Ndị so n'ejije a gụnyere:

Pete Edochie

Ebe foto si, Pete Edochie

Nkọwa foto, Pete Edochie kpara agwa dịka Okonkwo n'ejije 'Things Fall Apart'
  • Pete Edochie - Okonkwo
  • Justus Esiri - Obierika
  • Funso Adeolu
  • Elizabeth Okaro

3. Village Headmaster

Village Headmaster

Ebe foto si, Village Headmaster

Ejije a so n'ejije nke mbụ nke ụlọọrụ NTA mepụtara, ma bụrụkwa nke kacha mee ogologo oge na TV.

Ya bụ ejije nke malitere n'afọ 1968 ruo afọ 1988, kọrọ akụkọ maka obodo a kpọrọ Oja, nke eze na-achị ya na-adabere na ndụmọdụ onyeisi ụlọakwụkwọ dị n'obodo ahụ.

Ndị so n'ejije a bụ:

  • Ted Mukoro - Headmaster nke mbụ
  • Femi Robinson - Headmaster nke abụọ
  • Justus Esiri - Headmaster nke atọ
  • Dejumo Lewis - Eze Oloja
  • Clara Olushola - Nwunye Headmaster, na ndị ọzọ

4. Cockcrow at Dawn

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ejije a malitere n'ọnwa Eprel afọ 1980 iji mee ka ndị mmadụ mata maka atụmatụ a kpọrọ 'Green Revolution' nke onyeisiala Naịjirịa n'oge ahụ bụ Shehu Shagari wepụtara.

Ọ bụkwa ụlọọrụ NTA tipụtara ya, nke onye dere ya bụ Peter Igho

Ndị so n'ejije a gụnyere:

  • Sadiq Daba - Bitrus
  • Ene Oloja - mama Bitrus
  • George Menta - Bello
  • Zainab Bedwell - Ene
  • Emmanuel Oniwun - uncle Beke

5. Jagua

Jagua

Ebe foto si, Youtube

Nke a bụkwa ejije ọzọ nyere ndị mmadụ ọṅụ n'oge gboo.

Akụkọ kwuru na ejije a malitere n'afọ 1968, mana ruo na ngwụcha afọ 1990 ga, ya bụ ejije ka bụkwa egwu eji.

Ọ bụ Afolabi Afolayan, onyeọrụ ntaakụkọ NTA n'oge ahụ, dere ejije a ma kpakwaa agwa dịka 'Jagua'.

Ejije ndị ọzọ

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ụfọdụ ejije ndị ọzọ wuru ewu n'oge mbụ gụnyere:

  • Hot Cash (Willie Willie)
  • Checkmate
  • Chief Fuji
  • Fuji House of Commotion
  • Behind the clouds
  • Okpuru Anyanwụ (Mike ori ihe dị mma) - nke gosiri na mpaghara Ọwụwa Anynawụ
  • Kwere ka ị ra (Nze Odiraa) - gosikwara na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ