Deeper Life Bible Church: Kumuyi ọ kagbuola 'crusade ' ụka Deeper Life kwadoburu n'Aba n'ihi egwu otu Ipob?

Ebe foto si, Kumuyi/Facebook/Getty Images
Dịka ọ fọrọ naanị abalị abụọ ka ụbọchị a kara rue, onyeisi ụka 'Deeper Life Bible Church', bụ Pastọ William Kumuyi, akagbuola ọgbakọ mbara ama nke ọ kwadoburu ime n'Aba, Abia Steeti n'abalị 24 rue 29 nke ọnwa Mee, afọ 2022.
Kama ịgbakọ n'Aba, ụlọụka ahụ agwaala ndị ụka ha n'ozi ha wepụtara n'akara Facebook Kumuyi ka ha gbakọ n'ebe ọbụla e nwere ụka ha maọbụ ọnọdụ ọgbakọ mbara ha n'ụwa niile.
Nke a na-abịa dịka otu nnwereonwe Biafra bụ otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) dọrọ Kumuyi aka na ntị ka ọ ghara ịbịa mee ya bụ ọgbakọ ozioma n'Aba.
N'ozi nke otu ụkọchụkwu Deeper Life bụ Pastọ James Akpofure binyere aka, o kwuru na ọ bụ "maka ọnọdụ ndakpọ nchekwa na mpaghara ahụ."
Akpofure, onye bu onyeisioche otu na-ahazi mgbasa oziọma Kumuyi a kpọrọ 'Global Crusade with Kumuyi' gara n'ihu dee:
"Dịka e nwere nsogbu nchekwa n'ebe (Aba,Abia, Naijiria) e hiburu ọgbakọ ugbua, Pastọ WF kumuyi na-eti ndị nke anyị nọ n'Abịa aka n'obi, ma ga n'ihu na-ekpere ekpere ka Chukwu bie okwu."
Ka ọ dị ugbua, a na-eche na ụka a ga-eji teknụzụ gbasaa ozi emume a.
Oge BBC Igbo jụrụ ụka Deeper Life ma ha aka aga n'ihu hiwe ozịọma mbara ama ha n'Aba, o sịsa ha sara n'ekwentị bụ bụ "Mba ,biko".
Cheta na nsonso a, otu Ipob zigaburu ụka Ipob ihe ha kpọrọ "ozi ịdọ aka na ntị" sị ha emela ọgbakọ ha n'Aba sị na ndị 'unknown gunmen' nwere ike iwakpo ndị mmadụ n'ọgbakọ ahụ.
Kemgbe Janụị̀arị afọ 2021, ndị omekome na-egbusịsị ndị mmadụ gụnyere ndị uweojii, ndịagha na ndị Igbo nwere agba , na-agba ụlọọrụ gọọmenti nakwa ụlọ ndị ọnụ na-eru n'okwu ọkụ.
Gọọmenti Etiti na ndị ọrụ nchekwa Naijiria na-arụ otu Ipob na alaka ọgụ ha bụ Eastern Security Netwiork aka na ọ bụ ha na-akpa mkpamkpa ndịa ahụ.
Mana otu Ipob agọọla ugboro ugboro na aka ha adịghị ya.
CAN asaala IPOB ozi ha zigaara ndị ụka Deeper Life

Otu Christian Association of Nigeria (CAN) etinyela ọnụ n'okwu na-aga n'ihu ugbua n'etiti ndị otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) na ndị ụka Deeper Life.
Cheta na ndị IPOB degaara ndị Deeper Life akwụkwọ na-agwa ha ka ha kagbuo nnukwu ọgbakọ ekpere ha chọrọ inwe n'Aba, Abia Steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị CAN bụ Bayo Oladeji gwara BBC Igbo na ha na-arịọ ndị IPOB ka ha ghara igbochi ndị Deeper Life inwe ọgbakọ ha.
"Anyị na-arịọ ha ka ha ghara igbochi onye ozi Chineke (bụ William Kumuyi) ịbịa n'obodo Aba," Oladeji kwuru.
"Ọbịbịa ya enweghị ihe jikọrọ ya na nnwereonwe ha na-azọ, maọbụ ihe gọọmentị etiti na-eme na mpaghara ha."
"Ndị mmadụ bi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ chọrọ nnwereonwe si n'aka Chineke."
"Ala ha nọ n'ọgbaghara, akụnụba mpaghara ha adakpọọla. Ọ dị mkpa ka onye ozi Chineke gaa ebe ahụ ka ihe niile ndị a bịa na njedebe."
"Ekpere (Kumuyi) nwereike inye aka ka ihe ha na-azọ nwee isi."
"Ihe ọ na-abịa bụ ka o kpeere ndị mmadụ ekpere ka onye ọbụla nwere onwe ya."
"Ọ bụ IPOB ka ọ ga-aka baara uru ma onye ozi Chineke (bụ Kumuyi) bịa na mpaghara ha, kpeere ha ekpere ka ala ha dịkwa mma ọzọ."
Ụka Deeper Life Bible Church asaala ozi Ipob zitere ha

Ebe foto si, William Kumuyi/Facebook/Getty Images
Ụka Kraịst a ma ama na Naịjịrịa nakwa Afrịka dịka Deeper Life Bible Church gwara BBC Igbo n'ụbọchị Tọọzde na ha natara ozi ịdọ aka na ntị nke otu Indigenous People of Biafra (Ipob) zitere ha.
Ozi a nke BBC Igbo hụrụ, kwuru: "Ipob na-enye Pastọ Kumuyi nke ụka Deeper Life Ministry ndụmọdụ ka ọ chegharị uche n'atụmatụ ime ọgbakọ mgbasaozi Kraịsti n'Aba maka ọnọdụ enweghị nchekwa dị n'Ọwụwa Anyawụ Naịjirịa ugbua".
Ụka Deeper Life Bible Church gwara BBC Igbo "Anyị na-eleba anya na ya bụ ozi ịdọ aka na ntị nke Ipob zịtere anyị"
Ozi a nke ọnụ na-ekwuru Ipob binyere aka gara n'ihu kwuo na ndị ojigbe nke 'Unknown gunmen' nwereike iwakpo ndị mmadụ n'ọgbakọ ahụ.
Powerful kwuru "A wakpoo ndị mmadụ, a ga-amalite tụwa Ipob aka"
O rịọrọ Kumuyi ka o were ohere a kpere Ọwụwa Anyanwụ Naịjriịa ekpere.
Ozi ụka Deeper Life zipụtara banyere ọgbakọ a kwuru na e hibere ime ya bụ ọgbakọ a n'Aba, n'ime ama sara mbara nke Aba Mega Mall dị n'akụkụ ụzọ si Enugwu gafee Pọta Kọtụ malite n'ụbọchị 24 nke ọnwa Mee ruo ụbọchị ụka bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Mee, 2022.
Ihe ikwesiri ịma maka ụka Deeper Life
E ji njem ngagharị banyere mgbasaozi Kraịsti mara ụka a, dịka kemgbe oge gara aga, onyeisi ụka a bụ William Kumuyi na-eme njem dị etu a, a ga n'akụkụ Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa banyere atụmatụ ozi Kraịsti.
Ụka Deeper Life nke onyeisi bụ William Kumuyi so na ụka ọtụtụ ma ama ma na-akwanyere ugwu na Naịjirịa. Ụka a malitere n'afọ 1982 na Naịjịrịa. Ugbua, Deeper Life Bible Church nwere ọtụtụ ngalaba n'akụkụ Africa, United Kingdom, Europe, Russia, India, nakwa North America.
Dịka ụka a si kwuo, isi ụlọụka ha dị n'akụkụ Gbagada, Legọs steeti nwereike inabata mmadụ 30,000 n'otu mgbe.
Ugbua, a na-eche ka anụ ozi mpụtara nleba anya n'ozi ịdọ aka na nti a Ipob zitere.
Dịka eyigharịrị ikpe onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu gaa ụbọchị 26 nke ọnwa Mee, ndị mmadụ n'ọwụwa anyanwụ Naịjriịa nwereike ịnọ n'ụlọ maka iwu onye nọrọ n'ụlọ bụ "sit at home" nke Ipob tiri.
Ya bụ na iwu a nwereike imetụta ọgbakọ ụka Deeper Life Bible Church.
Gịnị mere Ipob ji tinye atụmaatụ sit-at-home?
Ipob tiri iwu a kemgbe afọ 2021 mgbe gọọmentị Naịjịrịa nwụchịrị onye ndu ha maka ebubo gụnyere ịkpa nkata ịkpọsa ọchịchị Naịjirịa.
Iwu na-adị ere n'ụbọchị ọbụla akpụpụtara Kanu ụlọikpe dịka ha kwuru na nke a bụ iji gosi iwe ha maka etu e siri nwụchịe ya.
Ipob tiburu iwu a ka ọ dị ire kwa ụbọchị Mọnde n'izu mana ha mechara kagbuo ya.
Ndị mmadụ ji ụjọ ka na-erubere iwu a isi kwa ụbọchị Mọnde dịka ọtụtụ mwakpo na-eso ya bụ ụbọchị.
Otu ndi ojiegbe dị ịcheịche na-apụta manye ndị mmadụ iwu a ka ha nọrọ n'ụlọ, mana Ipob ekwuola na ha akwadoghị ka iwu a gaa n'ihu na-adị ire kwa ụbọchị Mọnde.
Cheta na dịka ọnọdụ enweghị nchekwa na-akawanye njọ n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, ugboro ugboro ndị ọrụ nchekwa nakwa gọọmentị Naịjrịa atụọla Ipob aka dịka ndị nọ n'isi ihe ndị a.
Ugboro ugboro, Ipob agọọla na aka ha adịghị na tigbuo zugbo ndị a mana gọọmentị Naịjirịa na-aga n'ihu na-atụ ha aka.
Kwa mgbe, kwa mgbe ndị uweojii na ndị agha Naịjrịa na-enyochapụta ogige ebe ha sị ndị omekome na-ezo n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, ha na-ekwukarị na ọ bụ ndị Ipob bụ ndị omekome ahụ dịka ha na egosikarị akwa nakwa ọlọkọtọ njirimara otu a n'ihe ndị ịgba ama na-eso njem nnyocha ndị a.
Dịka Ipob kwuru na ha na-achọ nnwereonwe ndị Igbo ọtụtụ ndị na agbụghị ndị Igbo etinyela ọnụ ma kwuo ka gọọmentị Naịjirịa ikike ịpụ na Naịjirịa site n'usoro 'Referendum'.
Na nso nso a, ọnụ na-ekwuru otu mpaghara ndị ugwu Naịjirịa Northern Elders Forum bụ Hakem Baba-Ahmed kwuru na ndị Igbo nwereike isi Naijirịa pụọ maọbụrụ na ha chọrọ.
Ihe Ohaneze sara Hakem Baba-Ahmed

Ebe foto si, Ohaneze
Ohaneze edpụtala akwụkwọ ozi ha jiri zahachi Hakem Baba-Ahmed maka ihe okwuru na ndị Igbo nwereike isi Naijirịa pụọ maọbụrụ na ha chọrọ.
Baba-Ahmed bụ ọnụ na-ekwuchitere otu Northern Elders Forum nke Naijirịa.
Ọ bụ na mgbasa ozi Baba-Ahmed mere na Soshal Midia ya ka o kwuru nke a.
Otu Ohaneze Ndigbo nke bụ otu jikọtara ndị Igbo katọrọ ya bụ ihe o kwuru ma sị na ndị Igbo kwenyere n'ịnọ na Naijirịa.
Ha kwuru sị, " Mgbasa ozi Baba-Ahemd na-emeghide udo na ịdị n'otu Naijirịa, Ka ndị ọrụ nchekwa rụọ ọrụ ha n'ebe ọ nọ ma iji gbochie ndị ọzọ ịklpa ụdịrị agwa ahụ".
N'aka nke ọzọ ka ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị Naijirịa bụ Garba Shehu katọrọ ihe Baba-Ahmed kwuru were jụọ sị, " Onye nyere ha ikikere ịnabata maọbụ ịchụpụ otu maọbụ mpaghara ọbụla na Naijirịa?".














