Gịnị bụ nje 'hantavirus' na-ewu ebe niile ugbua?
Mmadụ atọ anwụọla dịka ha butere ọrịa a na-enyo na ọ bụ nje 'hantavirus' nke ha butere n'ime ụgbọmmiri nlegharịanya.
Ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike na mbaụwa bụ WHO gwara BBC na otu onye butere nje a, ebe a na-enyocha mmadụ ise ndị ọzọ e kwuru butere nje a.
Hantavirus bụ ụdị nje òké na-ebunye mmadụ site n'ụmụ irighiri ihe dị n'ikuku sitere na nsị òké.
A na-ebute ọrịa a site na mmamịrị, nsị, maọbụ mmiri, ebe ọ na-agbasakarị site na òké ịta mmadụ maọbụ ịga mmadụ mvọ.
Nje a nwereike ibutere mmadụ ọrịa abụọ siri ike. Nke mbụ bụ Hantavirus Pulmonary Syndrome (HPS), na-amalitekarị site n'ike ọgwụgwụ, ahụ ọkụ, ahụ mgbu, isi ọwụwa, oyi, na nsogbu afọ.
Ọrịa nke abụọ bụ Haemorrhagic and Renal Syndrome (HFRS), bụ nke dị njọ karịsịa n'ihi na ọ na-emetụta akụrụ. Ihe ndị ọzọ e ji mara ọrịa gụnyere ọbara mgbali elu, ọbara ọgbụgba n'ime ahụ, nakwa ịda mba nke akụrụ.
Ya mere, ọ bụrụ na ị hụta ụdị njirimara a n'ahụ gị, gbarakwa gawa ụlọọgwụ ozugbo iji mara ma i butela nje hantavirus.



