Etu i ga-esi mee ka ụgwọ ọnwa gị zuoro gị kwa ọnwa
- Onye dere ya, Michae Ilediagu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
I so na ndị ụgwọọnwa ha na-agwụ ọsịísọ tupu ọnwa a na-agwụ? Buru oche gị bịa nso.
Bịa lee ihe ị kwesịrị ime ka ụgwọọnwa gị na-ezuru gị.
Ọkachamara na ngalaba akụnaụba bụ Desmond Echeta kọwara ihe mmadụ kwesịrị ime, na etu mmadụ kwesịrị isi kee ụgwọọnwa ya ka ọ nweeike izuru ya n'ọnwa ọbụla.
Echeta kwuru na onye ọbụla na-eri ụgwọọnwa kwesịrị ike ya ụzọ abụọ: pasent iri atọ na pasenti iri asaa.
Ọ sị na pasentị iri atọ bụ nke a ga-edosa maka ihe ndapụta nakwa adịghị ama ụma maka echi.
"Ọ bụ pasenti iri atọ a ka ị ga-eji chekwaa onwe gị."
Mana pasenti iri asaa bụ nke ị ga-eji na-egbo mkpa dapụtara ụbọchị niile dịka iri nrị, ịkwụ ụgwọ ụlọ, ịkwụ ụgwọ ọkụ, ịji ụgbọala gaa ọrụ na ihe ndị ọzọ dị icheiche i kwesịrị ime ụbọchị ọbụla tupu ọnwa agwụ.
"Unu ahụrụ pasentị iri atọ a, mmadụ emetụkwala ya aka, ebikwala ndụ maọbụ mefuo ego karịa etu akpa gị ha."



