Onye ọbụla na-egbu mmadụ n'ihi m maọbụ n'ihi Biafra bụ efulefu - Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images
Onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu akpokuola ndị na-egbusisi, na-atọrọ ndị mmadụ maọbụ na-eme mpụ dị iche iche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ma na-eche na ha na-alụtara ya ọgụ ka wepụ aka enwe n’ofe tupu ọghọ aka mmadụ.
Kanu, onye kwuru nke a site n’ọnụ ọkaiwu ya bụ ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor na mkparịtaụka nke Ejiofor na otu onye Ipob a kpọrọ ‘Nwa Chineke’ nwere na Facebook n'ụbọchị ụka kwuru na nwa afọ ọbụla na-eme nke a bụ “efulefu” na-emezu ebunmnobi ndị iro ma kwuo na atụmatụ ọbụla dị etu a, abụghị maka ya bụ Kanu maọbụ ọdịmma Biafra.
Kanu gbarụrụ ihu banyere oke ogbugbu ndị mmadụ, ntọrị, ohi nakwa mkpamkpa ndị ọzọ dị iche iche a na-akpa n’Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Dịka Ejiofor si kwuo, oge ọ gara leta Kanu ikpeazụ n'ụlọ mkpọrọ DSS n'Abuja na nsonso a, Kanu nyere ya ntuziaka ka o zie ndị na-eso ya ozi ka ha mata na onye maọbụ ndị ọbụla hiwere otu nche na-egbu maọbụ na-atọrọ ndị mmadụ n’Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụ “ndị efulefu” na-emezu ebumnobi ndị iro ndị Bịafra.

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor
Dịka Ejiofor siri kwuo, Kanu kwuru na o nyeghị otu nche ya bụ ESN maọbụ onye ọbụla ikike ịga na-egbu maọbụ atọrọ ndị mmadụ maọbụ mee mpụ ọbụla n’aha ya maọbụ n’aha otu Ipob.
Ejiofor sịrị, “Onye ndu Mazi Nnamdi Kanu wetara ozi udo, ọ sị m na nke abụghị naanị mụ dee ya n’akwụkwọ, kama o sị m kwuo ya n’ọnụ ka ha na-anụ ya.”
“Onye ndu sị n’ala be anyị dị nsọ, ala anyị dị n’etiti ụwa ya mere ndị iro ji eme ihe ha na-eme imebi ala anyị.”
“Ndị efulefu na-enyere ha (ndị iro) aka ka emebisie be anyị . Ala anyị abụghị ebe a na-ekpofu ọbara, na-atọ mmadụ, na-egbu mmadụ , taa ka a ga-akwụsị ya.”
“Ndị mmadụ mara na o nweghị onye onye ndu nyere ikike ya ga guzowe otu nche nke ya.”
“Onye ọbụla gara na-atọ ndị mmadụ abụghị m ya (Kanu) ka ọ na-arụrụ ọrụ.”
“Onye ọbụla gara na-etinye aka na mpụ, na-atọ ndị mmadụ abụghị nwa Chineke ka ọ bụ, o nweghị onye m ziri nke a.”

Ebe foto si, Getty Images
Ozi a na-abịa dịka oke ogbugbu mmadụ malitere iri elu ọzọ n’Anambara, Enugwu, Ebonyi, nakwa Imo steeti bụ ebe ndị bu egbe wakporo ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndịagha, ndị uweojii, ndị eze ọdịnala, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ebe a tọọrọ ọtụtụ ndị ọzọ.
Kanu kwuru n’otu nche ya(ESN) hiwere bụ maka ichekwa ndị Ọwụwa Anyanwụ n'aka ndị ọchiehi na-awakpo ma na-emebi ubi na-edina ụmụnwaanyị n’ike n'Ọwụwa Anyanwnụ, ọ bụghị maka igbusisi ndị a sị ha echekwaa.
“Ọ bụghị ndị ọ sị ka aga chekwawa, ka a ga na-ata ahụhụ.”
Onye ọbụla na-ezi ozi ka eme nke a, wepụ aka enwe n’ofe.”
“Ọ na-akatọ ohi, ama na ihe ọjọọ dị iche iche.”
Ọ tụrụ arịrị na ọtụtụ ndị na-eto eto n’Ọwụwịa Anyanwụ bụ ndị na-ekpojuzi mkpọrọ dị iche iche na Naijiria n’ihi ihe ọ kpọrọ nye ohere ka ụfọdụ ndị na-agba ozi abụghị nke ya ziri duhie ha.
“O kwuru na ọtụtụ ụmụ be anyị a na-ekpobata n’ ebe ya (Kanu) nọ.”
“Ọtụtụ ụmụ be anyị nọ ụlọ nga dị iche iche bụ ndị e ji ọnụ dufie.”

Ebe foto si, Getty Images
Onye bụ Nnamdi Kanu?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu na-achọ nwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob).
A makwa na ọ bụ onye ndị mmadụ na-akpụkarị n'ọnụ n'ihi etu o si ama ndị nọ n'ọchịchị aka dịka ọ na-achọ nnwereonwe n'aka Naịjirịa.
Ndị ngabala uweojii 'Department of State Services (DSS)' nwuchiri ya mbụ n'Ọktoba 19, 2015.Ọ gara ụlọikpe na Nọvemba 18, 2015.
Na Septemba 2017, ọ gbafuru n'ụlọ ya dị n'Afara Ukwu, Umuahia, mgbe ndị agha wakporo be ya, dịka akụkọ siri kwuo.
Kamgbe ahụ onweghi onye ma ebe ọ nọ, ma nwunye ya bụ Uchechị anyị jụrụ ajụjụ n'afọ 2018 sị na ọ maghị ebe Kanu nọ.
N'afọ 2018, ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu.
N'ọnwa Juun 27 afọ 2021, a nwuchiri Kanu na mba Kenya ma kpọlata ya na Naịjirịa mana mana onyeisi ụlọrụ nnọchiteanya Kenya na Naịjirịa kwuru na aka ha adịghị na nwuchi ya.
Ikpe ya na gọọmentị etiti banyere ọtụtụ ebubo nke gụnyere iyi ndụ egwu ka na-aga n'ihu ruo ugbua.












