‘Ajọ ụzọ na-etinye ndụ anyị n’ọnọdụ ọjọọ’ - Ndị obodo Egbuoma, Imo steeti

Aha onyonyo, ‘Ajọ ụzọ na-etinye ndụ anyị n’ezigbo ọnọdụ ọjọọ’ - Ndị obodo Egbuoma, Imo steeti
‘Ajọ ụzọ na-etinye ndụ anyị n’ọnọdụ ọjọọ’ - Ndị obodo Egbuoma, Imo steeti

Ọ bụghị akụkọ ọhụrụ na ezigbo ụzọ na-emepee obodo.

Ndị obodo Egbuoma nọ n’okpuruọchịchị Oguta n’Imo steeti na-eti mkpụ ma na-arịọ gọọmentị ka agbatara ha ọsọ enyemaka.

Dịka oge udu mmiri na-aka oge ọkọchị eto ogologo, oge a bụ na-adị ka oge ‘echete-ebewe’ nye ndị obodo a.

Otu nwoke onye obodo ahụ gbara ama na ya bụ ụzọ a nọrọ n’ọnọdụ ọjọọ a ma na-akawanye njọọ ruo ihe karịrị afọ 10.

Ụzọ a na-emetụta ma agụmakwụkwọ, ma atụmatụ nleta ahụike, ma akụnụba nakwa ihe ndị ọzọ dị ndị obodo a mkpa.

Ọnọdụ ụzọ ndị obodo Egbuoma na-enyezị ndị obodo ahụ nchekasị

Ụgbọala anaghị enweike gbaa n’ụzọ a ma mmiri malite izo kwa afọ.

Dịka ha siri kọwaara BBC Igbo, ajọ ụzọ jikọrọ obodo ha n’akụkụ obodo ndị ọzọ na-emetụta atụmatụ ndị obodo ha ileta ahụike ha anaghị amịta mkpụrụ ọkachasị ndị ụmụnwaanyị dị ime nakwa ndị nọ n’ọnọdụ gbatagbata n’ahụike ha.

Ha na-arịọkwa gọọmentị ka e zitere ha ndị ọrụ ahụike ga na-arụ nma ya bụ ụlọọgwụ dịka ụkọ ndị dọkịnta ebe ahụ sokwa amụnye ọkụ na nsogbu ha nọ n’ime ya.

Ndị obodo na-arịọ gọọmentị ka a gbatara ọsọ enyemaka tupu ya bụ ụzọ edula ndị be ha mmụọ
Nkọwa foto, Ndị obodo na-arịọ gọọmentị ka a gbatara ọsọ enyemaka tupu ya bụ ụzọ edula ndị be ha mmụọ

Ndị ọrụ ahụike n’otu ụlọọgwụ kacha ibu n’obodo ahụ kọwaara BBC Igbo na inweta ọgwụ nakwa ihe ndị ọzọ na-echere aka mgba n’ihi na n’oge udu mmiri.

Dịka oke mmiri ozuzu mere aghara aghara n’afọ 2022 a n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche, ndị obodo a kwuru na ajọ ụzọ a mekpere ha ahụ nke ukwuu.

Dịka nkọpụta nri nakwa ọrụ ugbo bụ ihe ndị obodo a ji mere isi aka ọrụ ha, nsogbu ajọ ụzọ a anaghi ekwa ha bupu maọbụ ga rie ngwa ahịa ha ebe ndị na-abata izu ya bụ ihe owuwe ihe ubi anaghị enwekwa ike abata.

Ndị obodo a kwuru na ya bụ ajọ ụzọ na-emetụta akụnụba dịka ha anaghị enweike rie ihe ndị ha na-akọpụta.

Ọnọdụ ụzọ ndị obodo Egbuoma na-enyezị ndị obodo ahụ nchekasị

Nrụchapụ ọdụ ụgbọmmiri obodo a esiela n’aka fee n’aka

Dịka ndị obodo a siri kwuo, ọdụ ụgbọmmiri dị n’obodo ha nke aka chiburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo malitere ịrụ abụrụla ọrụ si n’aka ndị ọchịchị na-efe n’aka ndị ọzọ.

Ha kọwara na nrụchapụ ya bụ ọdụ ụgbọmmiri gaara emepere ha ụzọ ikwalite akụnụba nakwa atụmatụ mmepe obodo ha.

Ha rịọrọ gọọmentị arịrịọ ka ha gbaa mbọ rụchapụ ya bụ ọdụ ụgbọmmiri dịka nke a ga-abụ ihe uru nye ha nakwa Naịjirịa niile.

Gọọmentị Imo zara ajụjụ anyị jụrụ ha banyere ya bụ ụzọ ma kwuo na ha ga-eleba anya n’ime ya, dịka ha ma maka ọnọdụ ụzọ ebe ahụ.

Ha kwere nkwa ịrụchapụ ụzọ nakwa ọrụ ndị ọzọ aka ndị chịbụrụ steeti ahụ rụfọrọ.

Kirie ihe onyonyo nọ n'elu akụkụ ka ị nụrụ ihe ndị obodo a kwuru n'uju.