Etu okporo ụzọ ọjọọ si ebute ụkọ mmanụ ụgbọala n'Ụmụahịa

Ebe foto si, AFP
Okporo ụzọ na adịghị mma ebutela oke ụkọ mmadụ ụgbọala n'isi obodo Abia steeti bụ Ụmụahịa.
Ka nkea na-eme ka ndị na-anya ụgbọala Tanka nke na-ebu mmanụ ụgbọala na-agba abụbo ọrụ maka etu ụgbọala ha sị ada ma ha chọrọ ị ga ebute mmanụ ụgbọala.
Ugbu a, a na-erezị mmanụ ụgbọala site otu nari Naira na iri asatọ ruo narị naira abụọ otu lita n'ụmụahịa.
Ndị nke na-ere n'ụzọ na ezịghị ezi na-ere ihe dịka nnarị naịra abụọ na iri atọ ruo narị naira abụọ na iri ise otu lita.

Ndị na-agba ụgbọala bulikwara ego ha na-ana ndị na-eme njem, ụfọdụ ndị na-ana naịra iri ise mbụ na-anazị otu narị naira.
Ihe BBCIgbo chọpụtara
Onye ntaakụkọ BBC Igbo gbara otu onye na-anya ụgbọala Tanka aha ya bụ Bolaji ihe bụ iwe ha.
Bolaji kwuru na ọ bụ ajọ okporoụzọ nke ha si a ga ebe a na-ebute mmanụ ụgbọala mere ha ji gbaa abụbụ ọrụ.
O kwuru na ya na noruola izuụka abụo ya na ndị ọzọ na-anya Tanka na-eche ma enwere ihe gọọmentị ga-eme kama enweghị ihe ha mere.

O kwukwara na ụfọdụ ndị obodo anaghị ekwe ha gafee maka ụjọ na ha ga-emebi ụzọ obodo ha.
Bolaji kwuru na mmanụ ụgbọala juru ma bara abara na Depọ kama na ọ bụ okporo ụzo gbochiri ha ị ga-bute ya.
Otu nwoke na-anya ọgbatumtum gwara BBCIgbo na ọbụghị nanị depọ mmanụ ụgbọala nọ ebe ahụ, o kwuru na e nwere ụlọọrụ na-arụpụta ihe nọ ebe ahụ.

N'otu aka ahụ ka onyeisi National Union of Road Transport Workers n'ụmụahịa bụ Eze Okwulehie kwuru na ya ezịgarala gọọmentị Abia steeti ozi gbatagbata ka edozie ya bụ ụzọ were gbochie ọdachị na ihe dịka ụkọ mmanụ ụgbọala.
Mgbe onye ntaakụkọ anyị rutere depọ ahụ, agbahciri ya agbachi ma ọ hụkwara ndị na-anya tanka ka ha nọ nkịtị na-eche ma o nwere ihe gọọmentị ga-eme.











