South-East Roads: Ndị njem atọọla n'Ugwuoba dị n'ụzọ Ọnịcha n'ihi ụzọ ọjọọ
Ọkporoụzọ awarawa si Ugwuoba n'Enugwu gawa Ọnịcha kpọchikwara ọzọ nke mere na ọtụtụ ụgbọala nọrọ n'otu ebe ruo awa ise.
Ụgbọala ndị a kwụcha n'ahịrị n'ihi na gawa agawa adịghị mma, lawa alawa adịghị mma.
Ebe ụzọ awara awara a kacha dị njọ bụ na Gariki dị nso n'Amansea nakwa Ugwuọba ebe a na-ere ehi, ewu na atụrụ ma na egbukwa ya.
Ọtụtụ ndị njem gwara BBC n'ime njem site Enugwu gaba Onitsha na-echezi ha echiche n'ihi na ụzọ emebichaala.
Ndị ọkwọ ụgbọala ukwu (Trailer) na ndị njem kwuru na ha anọọla ihe dịka awa anọ kamgbe ụgbọala ha tọrọ n'apiti.
Okporo ụzọ awara awara ochie sị Enugwu gaa Ọnịcha kpọchikwaraa na-aka nke ọzọ nke na ndị njem na-ata ikịkịrị eze.
Ụzọ ndị a so n'ụzọ gọọmentị etiti kwuru na ha na-arụ, mana ya bụ ọrụ erutebeghị ogige a.




