Okporoụzọ ụfọdụ n'ala Igbo bụzị "agba ekperechi" ugbua
Ka gọọmentị gara n'ihu wepụta akwụkwọ ha sị gosiri ebe dị iche iche ha na-arụ ọrụ n'ala Igbo, BBC Igbo gara ịhụ etu ọrụ ahụ si aga n'eziokwu.
Site Ezeagu ruo 9th Mile n'ụzọ Enugwu/Ọnịcha BBC hụrụ na a rụọla otu akụkụ.
Ihe asambodo dị na mbido na ngwụcha ọrụ a kwuru na ọ bụ ego si atụmatụ akpọrọ "Sukuk" ka e ji rụọ ya bụ ọrụ.
Ebe ọzọ e ji atụmatụ a rụọ ọrụ bụ n'ụzọ si Enugwu gawa Pọt Hacọt. Mana, ebe ka na-arịọ ka igwe ọrụ ruo ha ugbua dị ka atụrụ tawa.
BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'ọnụ gọọmentị nke bụ eziokwu banyere ụzọ ndị a.
Onye na-ahụ maka Ọwụwa-Anyanwụ na ngalaba gọọmentị etiti n'ihe banyere ọrụ ụzọ, ụlọ na ọkụ latrik bụ E.A. Adeoye gwara BBC Igbo na mmiri na-ezo ugbua so mee ka ọrụ ụzọ ndị a dị ka ọ dị ugbua.
N'agbanyeghị na o kwuru na ndị ọrụ ụzo nọ n'ihu ọrụ, BBC Igbo ahụghị igwe e ji arụ ọrụ ụzọ na njem nchọpụta a.