Imo State Roads: Ihe anyị jiri gbaa akwụkwọ n'ụzọ 'pọtọ pọtọ' dị n'Owerri

Aha onyonyo, Imo State Roads: Ihe anyị jiri gbaa akwụkwọ n'ụzọ 'pọtọ pọtọ' dị n'Owerri

Orji Kingsley na Onyegbula Joy,enyi abụọ na-akpaọchị kọwara ihe mere ha jiri nọrọ n'ụzọ Orogwe mebiri emebi nke dị n'okpuruọchịchị Owerri West gbaa akwụkwọ.

Ha sị na ọ bụ iji gosi ọnọdụ ọjọọ nke ụzọ ahụ nakwa ụzọ ndị ọzọ dị n'Imo Steeti dị, ka gọọmentị nwee ike ịbịa rụọ ya ọrụ.

Ha sị na nke mbụ ha mere tinye n'ịntanet mana ha edeghi aha ụzọ ahụ mere gọọmentị Imo ji gaa rụọ okporoụzọ Nekededị n'Owerri.

Mana nke ugbua ha mere bụ n'ụzọ Orogwe bụ ebe ndị mmadụ na-ata ahụhụ n'ihi ajọ ụzọ.

Ha sị ha ji ohere ahụ akpọku gọọmentị ka ha bịa gbatara ndị obodo ọsọ enyemaka site n'ịrụ ụzọ ahụ.

Kirie ihe ha kwuru n'uju;