Gọọmentị enweghi ike ịtụkwasị ebubo ọzọ n’isi Nnamdi Kanu - Ifeanyi Ejiofor

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor
Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu, Onyendu otu Indigenous People of Biafra ekwuola na Gọọmentị Naịjirịa enweghi ike ịtụkwasị ebubo ọhụrụ ọzọ n’isi Kanu maka na ụlọikpe mkpegharị akụchapụla ndị ha boro ya na mbụ.
Ejiofor depụtara nke a n’akara Twitter ya n’ụbọchị Fraịde dịka kepukepu kwuru na Gọọmentị Naịjirịa tinyere ebubo asaa ọhụrụ n’isi Kanu maka ikpe dị n’etiti ya na ha.
Ọ kwuru “Site na ihe anyị hụrụ, ebubo asaa ọhụrụ a a na-ekwu okwu ya na ebubo ndị Ụlọikpe Mkpegharị dị n’Abuja kachapụrụla bu otu akara (FHC/ABJ/CR/383/2015)
“Ya mere ikpe ahụ ụlọikpe a nyere sị ka a tọhapụ Kanu ka-adị ire ugbua ruo mgbe naanị Ụlọikpe Kachasị nwereike ịkagbu ya.
“Ọ dị mkpa ka a mata na site n’ikike iwu ahụ Ụlọikpe Mkpegharị nyere, o nweghi ebubo ọzọ ọbụla e nwereike ịtụkwasị n’isi Onyendu Mazi Nnamdi Kanu n’ụlọikpe ọbụla na Naịjirịa”
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ejiofor sị na nyocha ha mere gosiri na Gọọmentị Naịjirịa gbara akwụkwọ maka ebubo asaa ọhụrụ ndị a mgbe Ụlọikpe Mkpegharị chabichara ikpe ya n’ụbọchị 13 Ọktoba 2022, bụ nke sị ka a tọhapụ Kanu.
“O nweghi mgbe Gọọmentị wetara Kanu maọbụ ndị ọkaiwu ya akwụkwọ ebubo ọhụrụ ndị a a sị na ha gbara n’ụlọikpe rute ugbua.”
Ejiofor gara n’ihu kwuo na ndị ọkaiwu Kanu ga-awụchi n’ụlọikpe n’ụbọchị Mọnde 14 Nọvemba ịhụ na ha mebiri nkata ọjọo ọbụla Gọọmentị Naịjirịa na-akpa n’isi Kanu.
Ọ gara n’ihu kwee ndị nkwado Kanu nkwa na ụrụ aghara ịpụ ha n’anya banyere ikpe Kanu, na site n’amara Chineke na ha ga-emebi atụmatụ ọjọo nke Gọọmentị.

Mike Ozekhome na ndị ndu Igbo nwere ọgbakọ n'Amerịka banyere Nnamdi Kanu

Akụkọ ebubo asaa ọhụrụ a na-abịa dịka Mike Ozekhome bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu na ụfọdụ ndị ndu Igbo nwere ọgbakọ na mba Amerịka banyere isiakwara Gọọmentị Naịjirịa na-agba n’ịtọhapụ Kanu.
N’ọgbakọ ahụ bụ nke ha nwere n’obodo Atlanta, ha rụtụrụ aka n’okwu dị iche iche banyere ikpe Nnamdi Kanu na Gọọmentị Naịjirịa dị n’ụlọikpe ugbua.
Mana mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ otu n’ime ndị ọkaiwu Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor, ọ sị na ọ nụrụ maka ọgbakọ ahụ kama na ọ maghị kpọmkwem ihe ha kpara.
Ụfọdụ ihe ndị gbapụtara ihe a sị ha kpara gụnyere;
Ozekhome gwara ndị ndu Igbo maka mbọ ya na ndị ọkaiwu Kanu na-agba ịhụ na a tọhapụrụ ya n’aka ndị Department of Security Services DSS kamgbe e si mba Kenya kpọlata ya n’ike n’afọ 2021.
Ọ kọwara etu Kanu jiri gwaa ndị ọkaiwu ya ka ha kpọtụrụ ka ọ bịa nọchiteanya ya n’ụlọikpe ịhụ na e nwere ikpe ziri ezi.
O kelekwara ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor, onye na-anọchiteanya Kanu tupu a kpọbata ya.

Kedụ ihe a na-atụnye n'ikpe ahụ?

Ozekhome kwuru na o nwere olileanya na Ụlọikpe Kachasị bụ ebe ikpe Kanu nọ ugbua ga-enye ya ikpe ziri ezi.
Ọ sị na ọ gwara ụlọikpe na ọ bụrụ a tọhapụ Kanu na ọ ga-eme ka ọ gbara dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ugbua dajụọ.
Mgbe ụlọikpe mkpegharị nyere iwu ka a tọhapụ Kanu n’ọnwa Ọktoba, aṅụrị jupụtara ebe niile site n’Aba, Owerri, Abakaliki ruo Lagos nakwa Abuja.
“Agwara m ụlọikpe na ọ bụrụ na ha chọrọ udo nakwa ntuliaka n’Ọwụwa Anywanwụ, ka ha tọhapụ Nnamdi Kanu.”
Na nzaghachị, otu n’ime ndị ndu Igbo n’Amerịka bụ Tony Okpara kelere Ozekhome nakwa ndị ọkaiwu Kanu ndị ọzọ maka mbọ ha na-agba.
Cheta n'ọnwa Ọktoba, 2022 ụlọikpe mkpeharị dị n'Abuja kachapụrụ ebubo niile dị n'isi Kanu ma nyekwa iwu ka Gọọmentị Naịjirịa tọhapụ ya.
Mana Gọọmentị gara n'ụlọikpe mkpegharị ma nata ikike nke sị ka ha jidegodi Kanu na nga ruo mgbe Ụlọikpe Kachasị ga-achabi ikpe ya.
Dịka ọ dị ugbua Ụlọikpe Kachasị ehiwebeghi ụbọchị ha ga-eleba anya n'ikpe ya.









