Ihe dị n'ozi Mike Ozekhome nyere Onyeisiala Buhari maka Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images/Facebook
Onyeisi ndị ọkaiwu na-ekpechitere Nnamdi Kanu bụ Mike Ozekhome ezigaarala onyeisiala Muhammdu Buhari ozi ọhụrụ nke na-arịọ ka atọhapụ ya site n’ụzọ mkparịtaụka.
Gọọmenti Naịjirịa n’okpuruọchịchị onyeisiala Buhair nwụchiri Kanu bụ onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) n’ọnwa Juun, nke afọ 2021 ma jibido ya n’ụlọ mkpọrọ ngalaba ndị uweojii Naịjirịa pụrụiche bụ 'Department of State Services' (DSS) ruo ọnwa 15 ugbua.
N’ozi a Ozekhome zipụrụ nke etinyekwara aha ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami, ọ rịọrọ ka Onyeisiala Buhari nye Malami iwu ka ọ hụ na atọhapụrụ Kanu n’ihi na ịme nke a ga-adajụ tigbuo zọgbu na-aga n’ihu ugbua n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Ozi ya rụtụkwara aka na ịtọhapụ Kanu ga-akwalite akụnụba ndị mmadụ dịka ọ dere:
“Nke a ga-akwụsị ọgbaghara ndị nọ n’Ọwụwa anyanwụ Naịjriịa nakwa iwu onye nọrọ n'ụlọ (Sit-at-home) na-akụsa akụnụba na atụmatụ azụmaahịa ndị mmadụ.”
Ọ gara n’ihu degara Buhari:
“Ị nwereike ime nke a site n'ịgwa onye ọkaiwu gọọmenti etiti ka o jiri ikike ya dị n'okpuru akwụkwọ iwu Naịjirịa nke akụkụ 174”
Ozekhome gakwara n’ihu keele Onyeisiala Buhari dịka ọ na-atụ anya na Buhari ga-etinye anya na ya bụ akwụkwọ “tọhapụ Nnamdi Kanu ma degharịọa mehie ndị e dere n’isi ya”
Ọtụtụ ndị nakwa otu arịọla otu arịọrọ a n’oge gara aga dịka gọọmentị etiti Naịjirịa ka nwere ikpe n’isi Kanu nke gụnyere ebubo ịkpa nkata ikwatụ ọchịchị onye kwuo uche ya, iyi ndụ egwu nakwa ihe ndị ọzọ.
Ụfọdụ ndị ọzọ rịọrọla ka atọhapụ Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Nigeria Presidency
Ndị ndu ala Igbo
N’afọ 2021, ọtụtụ ndị ndụ n’ala Igbo nwere agba gara hụ onyeisiala Muhammdu Buhari ma rịọ ya ka atọhapụ Nnamdi Kanu ma chịza ikpe nọ n’isi ya n’ihi etu nwụchi ya sị na-akpatara ala Igbo ọtụtụ tigbuo zọgbuo.
Ndị so mee njem a gụnyere Bishọp Sunday Onuoha, Mazị Tagbo Amaechi, Ọkaiwu Goddy Uwazurike, aka chịburu Anambara steeti bụ Chukwuemeka Ezeife, na ichie Mbazulike Amaechi.
Na njem ahụ Mbazulike Amaechi kwuru "Achọrọ m ka gị bụ onyeisiala bụrụ onye a ga-echeta na ọ hụrụ ebe Naịjirịa na-agba ọkụ ma menyụọ ya bụ ọkụ."

Ebe foto si, Ike Ekweremadu/Facebook
Ike Ekweremadu
Onye bụbu osote onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa bụ Sịnetọ Ike Ekweremadu gaara njem nleta n'ụlọmkpọrọ ndị DSS ebe ọ gara hụ Nnamdi Kanu n’afọ 2021.
Ozi ọ zịpụtara dịka ọ mechara njem a kwuru:
"O nweghi mgbe Onyeisiala kwuru na e nweghi ike iji ụzọ mkparịtaụka udo (polictical solution) tọhapụ Kanu."
Ekweremmadu kọwara na so na ndị nwere agba na-agba mbọ ịhụ na-atọhapụrụ Kanu site n’ụzọ mkparịtaụka.

Ihe Gọọmentị kwurula n'oge gara aga maka nke a
Na Mkparịtaụka Abubakar Malami bụ ọkaiwu gọọmentị etiti na ụlọọrụ ntaakụkọ NTA nwere n'Ọktoba, 2021, o kwuru na Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-ebu ụzọ lebanya n'ọdịmma ụmụ Naijiria tupu o kwuwe ma ọ ga-atọhapụ Kanu.
O sara mgbe a jụrụ ya ihe ọ chee maka njem ndị ndu ala Igbo mere na-arịọ ka atọhapụ Kanu "n'okwu Kanu, mkpebi Onyeisiala banyere arịrịọ ọbụla a rịọrọ ya ga-agbado ụkwụ n'ọdịmma ọha mmadụ, ọ bụghị nke ụfọdụ ndị."
Cheta na n’afọ 2021 mgbe onyeisiala na-azụ ajụjụ na Channels TV ọ sị na ọ gaghị etinyeaka n’okwu ikpe Kanu kama ka ọ zara ọnụ ya n'ụlọikpe.
Ikpe gọọmentị etiti na Kanu ka na-aga n'ihu dịka ọ ka nọ n'aka ndị nagalaba uwejii Naịjirịa bụ DSS.









